Omoyele Sowore: Ụlọikpe ebugharịala ikpe ya maka ebubo mpụ ịntanetị

Mgbe Omoyele Sowore nọ n'ụlọikpe
Nkọwa foto, Omoyele Sowore
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọkaikpe Mohammed Umar nke ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja, ewepụtala Ọktoba 27, 2025, maka ikpe onye na-akwado ikike mmadụ bụ Omoyele Sowore.

Akwụsịrị ikpe ya nke e hibere n'ụbọchị Tuzde 30 Septemba n'ihi na enyeghị ya akwụkwọ maka ebubo mpụ ịntanetị eboro ya.

Onyeisi na-ahụ maka ikpe ọha sitere na Mịnịstrị ikpe ziri ezi gwara ụlọikpe na ha dị njikere ịkpụpụ Sowore, X Corporation, na Meta (Facebook) Inc., dịka ndị zara nke mbụ ruo nke atọ.

Mana onye ọkaiwu Sowore bụ Marshal Abubakar, gwara ụlọikpe na e nyeghị ha akwụkwọ ebubo ahụ.

Onye ọkaiwu nke onye nke onye nzara ọnụ nke atọ kwadokwara ihe Abubakar kwuru, na-ekwupụta na ọ bụ n'ụlọikpe ka enyere ya akwụkwọ.

Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọktoba, 2025.

BBC News Igbo amalitela ikesa ozi n'ọba ozi WhatsApp Chanelụ.
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo WhatsApp Chanelụ

Gịnị ka Sowore dere na-ese okwu?

Ụlọikpe ukwu nọ n'isi obodo mba Naịjirịa ebidola ịnụ ikpe Omoyele Sowore na Gọọmenti Etiti banyere ebubo ime mpụ ịntanetị na ikwutọ Onyeisiala.

Ikpe ahụ bụ nke ndị uweojii nzuzo bụ Department of Security Services (DSS) wetere ụlọikpe n'Abuja maka ihe Omoyele Sowore dere n'akara soshal mịdịa ya megide Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu.

DSS na-ebo Sowore ebubo "iji ịntanetị na-emetọ aha Onyeisiala Naịjirịa nakwa imebi njiri mara mba Naịjirịa".

Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ugbua bụ gịnị ka Sowore dere na soshal mịdịa na-ese okwu nakwa kedụ ebe o dere ya nakwa mgbe o dere ya?

Ndị DSS kwuru na Sowore ji akara soshal midịa ya na X bụ @Yele Sowore nakwa Meta n'Ọgọst 25, 2025 dee ihe dịka "Onye ohi a @OFFICIAL PBAT gara Brazil kwuo na mpụ na nrụrụaka adịghị n'ọchịchị ya na Naịjirịa. Kedụ udiri obi o nwere ịsị asị na-enweghị ihere".

DSS kọwara na nke ahụ bụ okwu asị ma kwuo na "o dere ihe dị etu ahụ ka ọ me ka ndị mmadụ daa iwu.

DSS kwuru na ihe o dere megidere mpaghara iri abụọ na anọ nke iwu banyere etu mmadụ si eji ịntanetị eme ihe a na-akpọ "Cybercrime nke afọ 2024".

Ihe mere tupu DSS na Omoyele Sowore agaa ụlọikpe

Tupu okwu Sowore na Gọọmenti Naịjirịa apụọ ụlọikpe, ndị DSS na mbụ gwara Omoyele Sowore ka o hichapụ ma wepụ ihe ahụ o dere mana o kweghị.

DSS dekwara akwụkwọ degara ndị ụlọọrụ Meta na X gwa ha ka ha wepụ ihe Sowore dere n'ọba ozi ha mana ha azabeghị oku a kpọrọ ha mgbe ozi a na-apụta.

DSS mechere kpụpụ Sowore ụlọikpe mana Sowore ga gbakwara ha akwụkwọ nke ya ma kpụpụkwa gọọmenti Naịjirịa, DSS, Meta na X ụlọikpe ma chọọ ka ụlọikpe kwụsị ha iwetu ihe o dere n'akara soshal midịa ya.

Onye bụ Omoyele Sowore?

Omoyele Sowore bụ onye Ondo Steeti dị na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa a ma dịka onye bidoro ikwuru ọha mgbe ọ bụ nwata akwụkwọ na Mahadum Legos ebe ọ gụrụ maka etu gburu si dị na nghazi obodo (Geography and Planning).

O bidoro ụlọmgbasa ozi ya a na-akpọ Sahara Reporters n'afọ 2006 na steeti New York, dị na mba Amerịka nke o kwuru na ya ji ebuso mpụ agha.

Sowore ejirila otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị AAC zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019 nakwa n'afọ 2023

Ihe mere n'ulọikpe taa