Sowore, Aloy Ejimakor na ndị ọzọ apụtala n'ụlọmkpọrọ Kuje

Ebe foto si, Omoyele Sowore/X/BBC
Onye a ma ama na-akwado ikike dịrị mmadụ na Naịjirịa bụ Omoyele Sowore ya na ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor na Prince Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdi Kanu apụtala n'ụlọmkpọrọ Kuje mgbe ha nọchara mkpụrụ ụbọchị anọ n'ụlọmkpọrọ.
Sowere kwupụtara maka ntọhapụ ya n'ụbọchị Mọnde 27 Ọktoba n'akara X, dịka o dere, sị, "Na-eme ugbu a: Ịpụ n'ụlọmkpọrọ Kuje dị n'Abuja mgbe e jidere ya n'ụzọ iwu na-akwadoghị ruo ụbọchị anọ."
N'aka nke ọzọ, Ejimakọr dekwara n'akara X ya: "Alọghachila m n'obodo. Ekele m ndị niile guzoro n'akụkụ mụ na ndị enyi m. Chineke gọzie ụnụ niile; nnwere onwe na ikpe ziri ezi ga-abụ nke anyị, n'ikpeazụ."
Cheta na e jidere Sowere n'izu gara aga mgbe ọ pụtara n'ulọikpe Maji dị na Kuje ebe a nwụchiri Ejimakor, Prince Emmanuel Kanu na ndị ọzọ ụbọchị a na-eme ngagharịiwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu n'isi obodo Abuja.
Mana n'ụbọchị Fraịde, otu Ụlọikpe Majistreti nke dị na Kuje, Abuja, nyere onye na-akwado ikike mmadụ mgbapụta, ya na Ejimakor, Prince Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdi Kanu, na mmadụ iri ndị ọzọ ejidere n'oge ngagharịiwe ntọhapụ Nnamdi Kanu n'Abuja.
Ụlọikpe ahụ, nke Majistreti Abubakar Umar Sai'id nọ n'isi ya, nyere iwu mgbapụta ahụ mgbe a kpọpụrụ ndị a na-ebo ebubo maka nzukọ iwu na-akwadoghị na imebi udo ọha.
E nyere onye ọ bụla n'ime ha mgbapụta ₦500,000, ebe mmadụ abụọ bi n'isi obodo Abuja nwere akwụkwọ njirimara ziri ezi mere ha akaebe dịka ha nyefere ikike ụtụisi afọ atọ na akwụkwọ njem paspọtụ ha.
A tọhapụla Ejimakọr, Emmanuel Kanu, ndị ọzọ

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na a tọhapụla onye bụbu ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor na nwanne Kanu bụ Emmanuel Kanu bụ ndị a tọnyere na mkpọrọ na nsonso a.
Ụlọikpe nyere iwu ka ha weta puku nairị naira ise(N500k nakwa ndị akaebe abụọ, abụọ maka Aloy Ejimakor,nwanne Kanu nakwa Sowere.
Ndị akaebe ahụ ka enwe akara njirimara nakwa akwụkwọ ụtụisi afọ atọ.
Otu na ndị bụbu ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ MaxwellOpara gwara BBC Igbo sị
"Anyị na-emezu ọnọdụ mgbapụta Aloy Ejimakor na ndị ọzọ ae jichiburu."
Ndị uweojji nwuchiri Ejimakọr na nwanne Kanu ụbọchị Monde, abalị 19 nke ọnwa Oktoba n'Abuja dịka ha gara ime ngagharịiwe iji tie mkpu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye a nwuchiri ma na-ekpe ikpe make ebube metụtara iyi ọha egwu..
A nwuchịgharịrị Sowore dịka a tọhapụchara ya

Ebe foto si, Omoyele Sowore/X
Dịka a na-agba mbọ imezu ọnọdụ ọkaikpe nyere iji tọhapụ ya, ndị uweojii nwuchigharịị onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ Omoyele Sowere.
Cheta na anwụchiburu Sowere ụbọchị Tọzde dịka ọ bịara ikpe Nnamdi Kanu n'Ụloikpe Ukwu nke Abuja.
Ụlọikpe ezigaala Aloy Ejimakor, Emmanuel Kanu na ndị ọzọ n'ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abuja

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/X, Benjamin Hundeyin/x
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọikpe mijie dị n'Abuja ezigaala ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor, nwanne ya nwoke bụ Emmanuel Kanu na mmadụ iri na otu ndị ọzọ n'ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'isi obodo Abuja.
Nchọpụta BBC news Igbo mere gosiri na ndị uweojii kpụpụrụ Ejimakor na ndị ọzọ n'ụlọikpe maji dị na Kuje tupu ọkaikpe eziga ha n'ụlọ mkpọrọ.
Ebubo ndị uweojii na-ebo ha gunyere ịkpalite ọgbaaghara, ịkpọ oku ka atọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ikpe ya na-aga n'ihu n'ụlọikpe, ịgụ egwu agha, igbochie ndị ọzọ inwe ohere gaa ebe ha chọrọ ịga, ime ka ụgbọala na-enwe nsogbu ịgba n'okporoụzọ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ọzọ so na ndị ụlọikpe kpụgara n'ụlọmkpọrọ ahụ gunyere Ọkaiwu Joshua Emmanuel, Bịshọpụ Wilson Anyalewechi, Ọkaiwu Okere Kingdom Nnamdi, Clinton Chimeneze, Gabriel Joshua, Isiaka Husseini, Onyekachi Ferdinand, Amadi Prince, Edison Ojisom na Godwill Obiama.
N'aka nke ọzọ, ụlọmgbasa ozi BBC chọpụtakwara na ndị ngagharịiwe apụtaghị ta dịka okporoụzọ dị n'Abụja tọgbọ chakoo.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii anọchighị okporoụzọ ebe ndị mmadụ na-aga mkpa ha dị iche iche. N'agbanyeghị, e nwekwara ọtụtụ ndị uweojii na gburugburu Abuja niile.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor / X
Aloy Ejimakor, Emmanuel Kanu so na ndị anyị ga-akpụpụ ụlọikpe maka ngagharịiwe – Ndi uweojii
Ndi uweojii Naịjirịa ekwuola na ha ga-akpụpụ mmadụ iri na atọ ha jidere n'oge ngagharịiwe ndị na-akwado ntọhapụ Nnamdi Kanu n'Abuja n'ụbọchị Mọnde 20 Ọktoba 2025.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Benjamin Hundeyin mere ka BBC Igbo mata nke a na mkparịtaụka ha nwere n'ekwe ntị.
Dịka Hundeyin siri kwuo "mmadụ iri na atọ ka anyị jidere. Anyị ga-akpụpụ ha ụlọikpe taa".
"N'ime ndị anyị ga-akpụpụ ụlọikpe gunyere Ọkaiwu Aloy Ejimakor, Emmanuel Kanu na mmadụ iri na otu ndị ọzọ".
Cheta na Ejimakor depụtara n'akara X ya n'ụbọchị ndị uweojii nọ n'Abuja nwụchiri ya, Emmanuel Kanu na ndị so na-eme ngagharịiwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu n'ụtụtụ Mọnde ma kpọrọ ha gawa ụlọọrụ ndị uweoji bụ "COMMAND CID".
Ejimakor kọwara na ya na nwaamadị ahụ a kpọrọ 'Fine Boy' na ndị ọzọ nọ na "No 1, Zaria Steeet, Gariki 2, Abuja".
Nnamdi Kanu: Aloy Ejimakor isonye na ngagharịiwe emebighị iwu Naịjirịa ọbụla - Ndị ọkaiwu

Ebe foto si, Kingsley Ehujuo/Onyeka Ikenta
Dịka okwu na-aga n'elu na nsonye Aloy Ejimakor na ngagharịiwe ịtohapụ Nnamdi Kanu megidere iwu, BBC Igbo gbara ndị okaiwu ajụjụ ọnụ ịmara ma o megide iwu ma onye ọkaiwu soro mee ngagharịiwe gbasara onye ọ na-anọchite ikpe ya n'ụlọikpe.
Otu onye ọkaiwụ nọ n'Imo steeti bụ Kingsley Ehujuo kọwara na onye ọbụla bụ onye amaala Naịjiria ma onye ahụ ọ bụ onye ọkaiwu ma ọ bụghị nwere ikike ime ngagharịiwe dịka Iwu Naịjiria ngalaba iri atọ na itoolu na iri anọ kwadoro.
Ọ gara n'ihu kwuo na Ọkaiwu Aloy Ejimakor nwere ikike iso mee ngagharịwe na-agbayeghị na onye a na-ekwu ka a tọhapụ bụ onye o so na ndị na-anọchite anya ya n'ụlọikpe.
"Aloy Ejimakor adaghị iwu ọbụla nke iwu mara maka nsonye o sonyere mere ngagharịwe ntọhapụ Nnamdi Kanụ"
Mana o kwuru na iwu na-eduzi omume ndị ọrụ okaiwu nke afọ 2023 ngalaba iri atọ na atọ kwupụtara na ọ dịka omume ahụ bụ ịkpa agwaa megidere njirimara ndị ọkaiwu nke megidere usoro ọrụ ndị ọkaiwu.

Ebe foto si, Kingsley Ehujuo
Kingsley si n'agbayeghị na-akparama agwaa Aloy Ejimakor ma enyocha nwere ike imegide njirimara ndị okaiwu nakwa usoro ọrụ ndị ọkaiwu, ọ nọghị gọọmenti ma ọ bụ ndị uweojii na-aka ikpe ya ikpe kama ọ bụ ọtụ ndị ọkaiwu 'Nigeria Bar Association' na kọmitti ndị ọkaiwu na-ahụ maka agwaa ndị ọkaiwu 'Legal Practitioners Disciplinary Committee' kwesịrị ihu maka nkea ya bụrụ na ezitere ha mkpesa.
"Ọ bụghị ndị uweojji ma ọ bụ ndị gọọmenti ka ọ nọ na-aka ịta ya ahụhụ ma ọ bụ ịma ya ikpe"
Kingsley kwuru na ya bụrụ na-eweta iwu ukwu Naịjria nakwa iwu njirimara ndị okaiwu nakwa usoro ọrụ ndị ọkaiwu otu ebe, iwu ukwu Naịjiria nke nyere onye ọbụla ikike ime ngagharịwe karịsịa ngalaba nke mbu ga-achị.
"Ya mere onweghị iwu Aloy Mejọrọ"

Ebe foto si, Onyeka Ikenta
N'aka nke ọzọ onye ọkaiwu ọzọ nọ n'Abụja, Onyeka Ikenta kwuru na ndị ọkaiwu bụ ndị ọrụ ikpe na-eneyere ụlọikpe aka ị chọta ikpe ziri ezi nye onye ọ bụla bịara ụlọikpe nke mere na onye ọkaiwu ekwesighị ịkpa agwaa ga-eme ka ikpe na-aga n'ihu nwe nsogbụ.
Ikenta kwuru na ya bụrụ ya, ọ gaghị eso eme ngagharịiwe gbasara okwu nọ n'ụlọikpe nke o soo na ya.
Dịka Aloy Ejimakor si mee, ọkaiwu Ikenta si na akparamaagwa ya emejọọghị iwu ọ bụla kama na ebe ikpe ahụ ka na-aga n'ihu o kwesịghị isonye ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na iwu obodo kwadoro ndị mmadụ ime ngagharịiwe n'agbanyeghị ma onye ahụ ọ bụ onye ọkaiwu ma ọ bughị.
Nnamdi Kanu: Okporoụzọ, ahịa, ụlọọrụ, ụlọakwụkwọ gbara chakoo, ebe ụfọdụ mere ngagharịiwe n'Ọwụwa Anyanwụ

Dịka ngagharịiwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu malitere n'isiobodo Naijiria bụ Abuja, ụfọdụ steeti na mpaghara Ọwụwa Anyanwu esoghị mee ya.
N'Imo steeti,enweghị ndị mere ngagharịwe mana okporoụzo gbara chakoo dịka ebe azụmahịa ndị mmadụ, ụlọọrụ gbachiri agbachi.


N'Ebonyi steeti, ebe azumahịa ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ ndị gọọmenti mechiri emechi maka ngagharịwe na-eme na isiobodo Naịjjirịa.
Ndị nchekwa nọ na-agagharị ebe niile.
Obere ụgbọala nọ na-agba n'okporoụzọ.




Dịka ngagharịiwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu malitere n'isi obodo Abuja, ndị uweojii ejidela ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor, Prince Emmanuel na ndị ọzọ so na-eme ngagharịiwe ahụ.
Aloy Ejimakor depụtara nke a n'akara X ya ma kọwaa na ha nọ ugbua n'ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja ọ kpọrọ "COMMAND CID".
Ejimakor kọwara na ebe ya na nwaamadị a a kpọrọ 'Fine Boy' na ndị ọzọ nọ ugbua bụ "No 1, Zaria Steeet, Gariki 2, Abuja".
Mana na vidiyo na-egosi ihe na-eme n'Abuja nke anyị hụrụ mgbe a gbara ihe dara ka ụda egbe, Omoyele Sowore na ndị ngagharịiwe ndị ọzọ were gbapụ ọsọ, gbalaga n'ebe nchekwa.
Cheta na ndị uweojii Naịjirịa dọrọ ndị otu niile na-eme ngagharịiwe n'Abuja aka na ntị ka ha rube isi n'iwu ụlọikpe nyere nke machibidoro ha ime ngagharịiwe n'ebe nchekwa dị n'isi obodo ahụ.
Nke a na-esote mkpebi nke Justice M.G. Umar, wepụtara n'ụbọchị 17 Ọktoba 2025, n'ikpe dị n'etiti Gọọmenti Etiti Naịjirịa, Omoyele Sowore na anọ ndị ọzọ, nke gbochiri ime ngagharịiwe na gburugburu gụnyere obi ọchịchị Aso Rock, ụlọomeiwu, ụlọ ndịagha, ụlọikpe nkpegharị, ogige Eagle Square na okporoụzọ Shehu Shagari Way.
Ka ọ dị ugbua, ndị na-eme ngagharịiwe enweghị ike ịgbakọ otu ebe maka na ndị ọrụ nchekwa ekweghị ha.
Ndị ọrụ nchekwa juru ebe niile n'Abuja ma nọrọ n'ebe kacha mkpa ma nwee ndị nke na-agaharị na-achọ ebe ndị mmadụ gbakọrọ.
N'aka nke ọzọ, ndị uweojii nọ na gburugburu Sokale Roundabout dị na mpaghara Dutse ma na-akwụsị na-enyocha ndị mmadụ na-agara onwe ha.
N'okporoụzọ na-aga obi ọchịchị Aso Rock, ka ndị ọrụ nchekwa dị iche iche nke gụnyere ndị uweojii, ndịagha, nakwa ndị ọzọ nọchiri ụzọ.

Ihe Ejimakor kwuru tupu ndị uweojii ejide ya

Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru na soshal mịdịa nke gunyere Facebook na X kwuo na "Ọ bụ Onyeisiala Tinubu ka ọ dịrị ịtọhapụ Maazị Nnamdi Kanu".
"Mgbe ọbụla Onyeisiala kwụsịrị ikpe a na-ekpe ya, ka ikpe ahụ ga-akwụsị".
"N'aka nke ọzọ, ọ bụ Onyeisiala nwereike ime nke a".
Mana "ụlọikpe nwereike inyereaka kwụsị mkpagbu gọọmentị na-enye".
Gịnị kpalitere ngagharịiwe ịtọhapụ Nnamdi Kanu?
Ndị na-eme ngagharịiwe na-akpọ oku ka gọọmenti tọhapụ Nnamdi Kanu ma na-arịọ Onyeisiala Naịjirịa ka ha kwụsị ikpe a na-ekpe ya n'ụlọikpe.
Cheta na Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-achọ nwere onwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria 'Indigenous People of Biafra' nke gọọmenti Naịjirịa machibidoro dịka otu na-eyi ọha egwu.
Chetakwa na Gọọmenti Naịjirịa kpụpụrụ Nnamdi Kanu ụlọikpe maka ebubo iyi ọha egwu nakwa ihe ndị ọzọ.
Ikpe Nnamdi Kanu ka na-aga n'ihu ugbua mana ndị na-eme ngagharịiwe na-ebo gọọmenti ebubo ime ka ikpe ahụ na-egbu oge, megide ikike dịrị Kanu ma na-emegide mkpebi ụlọikpe nkpeghara nke asị kwuru ka atọhapụ ya.
Otu onye a ma ama so ahazị ngagharịiwe ahụ bụ Omoyele Sowore kọwara na "e jichiri Nnamdi Kanu n'ụzọ iwu akwadoghị. Njide ya bụ nsogbu Naịjirịa niile. Gọọmenti Naịjirịa ajụla ime ihe ụlọikpe kwuru."
"Ihe ndị mmadụ amaghị bụ n'afọ 2022 ka ụlọikpe nyere mkpebi ka atọhapụ Nnamdi Kanu maka ebubo iyi ọha egwu mana ndị ọrụ nchekwa atọhapụghị ya kama ha jichiri ya megide iwu".
Ndị mmadụ apụtaghị ime ngagharịiwe n'Aba, Enugwu, Imo na Riva Steeti

Ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ọdọ ahịa na ebe dị icheiche na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mechiriemechi maka ngagharịiwe a na-eme banyere ntọhapụ Nnamdi Kanu.
Nke a na-eme dịka igwe mmadụ pụtara sonye na ngagharịiwe ahụ n'Abuja nakwa Umuahia, ebe ndị mmadụ nọ n'ụlọ ha n'Enugwu, Aba, Ebonyi na Imo steeti.
N'Enugwu Steeti, ụbọchị taata dịka ebe a gbara ọsọ agha maka na ụlọakụ, ụlọakwụkwọ ma ọdọ ahịa na ebe di iche iche gbachiri agbachi.
Site na New Haven, okporoụzọ Ogui Rd, Otigba, Main Market, Holyghost, IMT na Obiagu tọgbọrọ chakoo.
Naani mkpụrụ ụgbọala ole na ole ndị ọkara obi pụtara n'okporoụzọ.
N'Okpara Square nakwa Nnamdi Azikiwe Stadium, o nweghị ndị gbakọrọ ime ngagharịiwe ọbụla.








