Ndịagha sị na aka ha akparala otu onyeisi Ipob/ESN a kpọrọ 'Gentle'

Ebe foto si, Screengrab
Ndịagha Naijiria ekwuola na aka ha akparala otu onye na ndị ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network(ESN) a kpọrọ ifeanyi Chukwu Okorienta Eze a ma ama dịka 'Gentle Yahoo.'
Akụkọ wuburu na soshal midia izuụka ole na ole gara aga kwuruburu na ndịahgha gbagburu 'Gentle D'Yahoo' bụ onye a ma maka iyi ọha egwu na mpaghara Okigwe na Imo steeti na-ebe ndị ọzọ.
Mana ozi si n'aka isiụlọọrụ ndịagha Naijiria (Nigerian Defence Headquarters) kwuru na ha anwụchiela Gentle De Yahoo na ndị otu ya mmadụ asatọ ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Mejọ-Generalụ Markus Kangye kwuputara nke a na Tọzde 16 Ọktoba oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n' Abuja.
"Anyị wakporo ndị omekome dị iche iche site na ọktoba 9 ruo 16 Ọktoba 2025 n'ebe dị iche iche na Naijiria"
"Na ọwụwa anyanwụ ka ndịagha nchekwa akpọrọ "Operation UDO KA, jidere Mazi Okotienta onye eji "Gentle D Yahoo" mara na mmadụ asatọ ndị otu ya"
Major General Kangye kwuru na kemgbe ka Gentle D yahoo nọ na akwụkwọ ha dịka onye a na-achọ achọ maka ọ ya na-achịkọba otu iyi egwu akpọrọ IPOB/ESN.
Ha jidekwara otu nwaanyị na Umunneochi ọchịchị ime obodo Abia steeti bụ onye otu Gentle d yahoo.
Ha nwetara na-aka nwaanyị ahụ, ụmụaka atọ nakwa onye otu Gentle De Yahoo nke a si aha ya bụ Mmaduabuchi Nwankwo "Emergency"
Cheta na nwa okorobia ahụ akpọrọ Gentle D Yahoo na ndị otu ya bụ ndị na-enye ndị mmadụ nsogbu na mpaghara Okigwe nakwa okpuru ọchịchị asatọ nọ n'imo steeti.
Ndị otu ha nọkwa n'Abakiliki na Anambra steeti.
Cheta kwa na onwere mgbe ndị obodo Aku nọ na Okigwe rịọrịọ gọọmenti Imo steeti ka ọ napụta ha n'aka Gentle D'Yahoo na-emekpa ha ahụ.









