"Iwu m maka ahụike Nnamdi Kanu bu..." Ọkaikpe Omotosho

Ọkaikpe James Omotosho enyeela Nnamdi Kanu iwu ka ọ malite ịzọ isi onwe ya n'ụlọikpe bido Ọktọba 23, 2025.
Omotosho kwuru nkea n'ụbọchị taa bụ Tọsde 16 ọktọba 2025 mgbe ọ na-enyocha mpụtara otu Nigerian Medical Association (NMA) mere maka ahụike Nnamdi Kanu.
Na mpụtara ahụ, NMA kwuru na-ahụike Nnamdi Kanu anọghị n'ihe ize ndụ nke kwesịrị ka akpọrọ ya ga n'ụlọọgwụ
NMA kwuru na ọ ga-anọ n'ụlọọrụ ndị DSS na-enweta nleta ahụike maka akụrụngwa ahụike ha dị mma ịlekọta ya.
Mgbe emechara, Okaiwu Nnamdi Kanu rịọrọ ọkaikpe Omotsho biko ka onye ha ohere ị nwe nzukọ ya na Kanu n'ụlọikpe maka okwu ya na Kanu enweghị nzuzo n'ụlọọrụ ndị DSS.
Omotosho kwenyere na-arịrọ ya ma nye ya ụbọchị 22 ọktọba, 2025 ka ọ bịa nwe mkparịtaụka n'etiti ndị okaiwu ya na Kanu n'ụlọikpe.
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor zitere BBC Igbo akwụkwọ Nnamdi Kanu gbara ụlọikpe ebe o kwuru ka akwụsị ikpe ya.
Nkea na-abịa dịka ụlọikpe nyere iwu ka ọmalite ịzara ọnụ ya ka mpụtara NMA mere gosiri na-ahụike ya egbochi ya ị bia ụlọikpe.
Lee akwụkwọ mpụtara nnyocha otu Nigerian Medical Association (NMA) nyere ụlọikpe maka ahụike Nnamdi Kanu










Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'Ụbọchị Wenezde, Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja,nabatara arịrịọ Gọọmenti Naịjirịa rịọrọ ka e nye otu jikọrọ ndị dọkịta na Naijiria bụ 'Nigerian Medical Association' (NMA) oge iji nwee ike wepụta mpụtara nnyocha ha mere gbasara ọnọdụ ahụike onye ndu otu nnwere Biara a kpọrọ Ipob' bụ Nnamdi Kanu ma bụgharịa ikpe ya ga abalị 16 nke ọnwa Ọktọba, afọ 2025.
N'ụbọchị a ka ụlọikpe nabatara nnyocha nke ụlọọru NMA mere ma nye iwu banyere mpụtara ya.
Ya bụrụ na-enwere ihe ize ndụ nọ na mpụtara nyocha NMA, ụlọikpe ga-atule ị nye Nnamdi Kanu nkwado ka ọ ga-nweta ngwọta zuru oke gbasara ahụike ya.
Mana ya bụrụ na-enweghị ihe ize ndụ nọ na mpụtara ahụ, ụlọikpe ga-enye nkwado ka ikpe ya ga n'ihu etu o kwesịrị.
Ihe butere ndọghachiazụ mpụtara nnyocha ahuike Kanu apụtaghị n'ụbọchị Wenezde abalị asatọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2025 dịka ọkaiwu Gọọmenti Naịjirịa si kwuo bụ n'ihi na o were ha oge ikpọkọta ndị ọkachamara mejupụtara kọmitii ha dịka ụlọikpe si nye iwu tupu e bido nnyocha.
Ọ kọwakwara na ọtụtụ nnyocha ndị ha mere Kanu na-egbu oge tupu e nweta mpụtara ha.

Gọọmenti Naịjirịa arịọla ka ụlọikpe nyekwuo otu Nigerian Medical Association (NMA) oge iji nweeike wepụta nnyocha ha mere gbasara ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu.
Ha kpọrọ oku a n'ụbọchị Wenezde 8 Ọktoba 2025 oge Ọkaikpe James Omotosho na-elebara ikpe Nnamdi Kanu anya n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Ọkaiwu na-ekpe onyendu otu Ipob ikpe bụ Suraj Saida (SAN) gwara ụlọikpe na NMA emechabeghị nyocha ahụike Nnamdi Kanu dịka ha nyere n'iwu.
Ha kwuru na ihe butere ndọghachiazụ a bụ n'ihi na o were ọtụtụ oge iji kpọkọta ndị ọkachamara mejupụtara kọmitii ha.
Ha gakwara n'ihu kwuo na ọtụtụ nnyocha ndị ha mere Kanu na-egbu oge tupu e nweta mpụtara ha.
Ọkaikpe Omotosho tinyeziri ikpe ahụ n'ụbọchị 16 Ọktoba 2025 maka ịga n'ihu lebara ya anya.
Cheta na otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa bụ Nigerian Medical Association (NMA) kwuru na ha enyochaala ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu dịka ụlọikpe si nye iwu.
Nnukwu Odeakwụkwọ otu NMA bụ Dr. Ben Egbo kwupụtara nke a oge a gbara ya ajụjụ n'otu ụlọmgbasaozi dị na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde.
Nnamdi Kanu: Ihe a tụrụ anya ga-eme n'ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde

Nnamdi Kanu ga-aga ụlọikpe maka okwu ya na-aga n'ihu n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja.
Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ga-apụta n'ihu Ọkaikpe James Omotosho dịka a ga-eleba anya n'okwu metụtara ọnọdụ ahụike ya.
Ihe a tụrụ anya ga-eme n'ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde 8 Ọktoba 2025 bụ na a ga-ekpughe ihe kọmitii NMA chọpụtara gbasara ọnọdụ ahụike Kanu.
Ọ bụ nke a ga-ekpebi ma a ga-eme ngwangwa kpee Nnamdi Kanu ikpe n'ime ụbọchị itoolu maọbụkwanụ kwụsịtụ ikpe ahụ ka o nwee ike nweta ezi nlekọta ahụike.
N'ụbọchị 26 Septemba 2025 ka Ọkaikpe James Omotosho nyere iwu ka NMA hiwe kọmitii nnyocha ga-achọpụta ọnọdụ ahụike onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) n'ime mkpụrụ ụbọchị asatọ.
Ndị kọmitii ahụ mechara nnyocha ha ma nyefee nchọpụta ha n'aka Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi.
Ihe ọkaiwu Nnamdi Kanu nwere ikwu maka mpụtara nnyocha NMA mere

Onye ọkaiwu Nnamdi Kanu, Aloy Ejimakor edeela akwụkwọ zigara otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na Naịjiria, Nigeria Medical Association NMA ka ha nye ya mpụtara nyocha ahụike Kanu ha mere.
N'akwụkwọ ozi o zigara ha na 29 Sepụtemba 2025, Ejimakor si ka NMA nye ụlọọrụ ya mpụtara ahụ nke ha mere na Sepụtemba 23, 2025 na ụlọọrụ ndị nchekwa DSS nọ na mpaghara Lugbe dị n'Abuja.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor
Onye ọkaiwu Kanu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na-emere nyocha ahụ n'ihu nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu ma kọwa na ọ bụ dọkinta Benjamin Olowojebutu bụ onye duru otu mere nyocha ahụ.

Ebe foto si, BBC, NMA/X
Otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa bụ Nigerian Medical Association (NMA) enyochaala ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu dịka ụlọikpe si nye iwu.
Nnukwu Odeakwụkwọ otu NMA bụ Dr. Ben Egbo kwupụtara nke a oge a gbara ya ajụjụ n'otu ụlọmgbasaozi dị na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde.
Ọ bụ n'ụbọchị 26 Septemba 2025 ka Ọkaikpe James Omotosho nyere iwu ka NMA hiwe kọmitii nnyocha ga-achọpụta ọnọdụ ahụike onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob).
Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja nyere NMA mkpụrụ ụbọchị asatọ iwebata nchọpụta ha iji mara ma a ga-anabata arịrịọ Nnamdi Kanu.
Kanu rịọrọ ụlọikpe ahụ n'izuụka ole na ole gara aga ka ha nye DSS iwu ịkpọga ya n'ụlọọgwụ National Hospital dị n'Abuja maka ọrịa obi na-enye ya nsogbu.
Ka o sina dị, Egbo kwuru na ha enyefeela nchọpụta ha n'aka Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi.
A na-atụ anya na a ga-ekpughe ihe niile kọmitii ahụ chọpụtara n'ụbọchị ọzọ a ga-eleba anya n'ikpe Nnamdi Kanu.
Ọkaikpe enyela NMA abalị asatọ iji nyochapụta ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu

Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja enyela ikpe gbasara okwu ahụ Nnamdi Kanu kwuru na Gọọmenti Naịjirịa enweghị okwu ọbụla megide ya, n'ihi na ha enweghị ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ.
Oge ọ na-enye ikpe ahụ, Ọkaikpe James Omotosho kwuru na ya asaala ya mmiri leba anya n'ihe akaebe gọọmenti wetere.
Dịka Omotosho siri kwuo, "ụdị ihe akaebe ndị ahụ bụ nke [Nnamdi Kanu] na-azara ọnụ ya kwesịrị inye nkọwa maka ha."
"Nke a apụtaghị na ikpe mara Nnamdi Kanu, kama ọ bụ ohere o nwere ịzara ọnụ ya ma kọwaa onwe ya nke ọma," ka Omotosho kwuru.
N'ihi ya, Ọkaikpe kagburu okwu ahụ Nnamdi Kanu kwuru sị na ya na Gọọmenti Naịjirịa enweghị ikpe, ma gwa ya ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo niile e boro ya.
E tinyeziri ikpe ya n'ụbọchị 8 Ọktoba, 2025 maka ileba anya n'ozi kọmitii NMA ga-ewebata n'oge ahụ gbasara ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu.
Omotosho kwuru na ọ bụrụ na a chọpụta na Nnamdi Kanu nwere ezigbo ọnọdụ ahụike, na ikpe ya ga-agakwa n'ihu na-egbughị oge.
Ihe ụlọikpe kpebiri gbasara ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu

Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja enyela ikpe gbasara akwụkwọ ndị Ọkaiwu Nnamdi Kanu degaara ụlọikpe ahụ maka ọnọdụ ahụike Kanu.
Omotosho kwuru na Nnamdi Kanu ka nwere ikike ịdị ndụ, dịka ọ bụkwa nkwenye ya na Kanu kwesịrị ịdị ndụ iji nwee ike zara ọnụ ya n'ụlọikpe.
Ọkaikpe ahụ kwuru na e nwere etu ọ dị na Nnamdi Kanu nyere dọkịta ọhụrụ ikike ka ọ bụrụ naanị ya ga-ahụ gbasara ahụike ya, na-enweghị ntụnye ndị ọkachamara ahụike ụlọọrụ DSS kwadoro.
Dịka Omotosho siri kwuo, ikike Nnamdi Kanu nwere ịdị ndụ bụ nke gbara ọkpụrụkpụ, bụ nke mere o ji nye iwu ka Onyeisi otu ndị ọrụ ahụike Naịjirịa bụ Nigeria Medical Association (NMA) hibe kọmitii nnyocha ga-adị mmadụ asatọ maọbụ iri.
Kọmitii ahụ ga-achọpụta ma Kanu ọ na-arịa ọrịa ndị ahụ ọ kpọrọ aha. Ha ga-achọpụtakwa ma ụlọọgwụ DSS o tozuru oke ilekọta ahụike Kanu nke ọma.
Ọkaikpe Omotosho nyere iwu ka Onyeisi ụlọọgwụ National Hospital maọbụ onye nnọchiteanya ya bụrụ otu n'ime ndị kọmitii nnyocha ahụ.
Ọ nyere iwu ka ndị kọmitii ahụ webata nchọpụta ha n'ime ụbọchị asatọ malite n'ụbọchị Fraịde 26 Septemba 2025.
Ihe a na-atụ anya n'ikpe Nnamdi Kanu

Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agaruola n'ụlọikpe maka ikpe ya na-aga n'ihu.
A tụrụ anya na Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ga-elebara okwu ya anya dịka ọ lọghachitere ezumike.
Ihe a na-atụ anya ga-eme n'ikpe Nnamdi kanu n'ụbọchị Fraịde 26 Septemba 2025 bụ na Ọkaikpe ga-enye ikpe maka ihe Nnamdi Kanu kwuru na gọọmenti enweghị okwu ọbụla megide ya, nke pụtara "no case submission" n'asụsụ Bekee.
Ihe nke a pụtara na Nnamdi Kanu na-ekwu na Gọọmentị Etiti kụrụ afọ n'ala i weta akaebe gbara ọkpụrụkpụ iji gosi na ebubo ha boro ya bụ eziokwu.
Cheta na Nnamdi Kanu gwara ụlọikpe ahụ n'izuụka gara aga ka ha nye DSS iwu ịkpọga ya n'ụlọọgwụ National Hospital dị n'Abuja maka ọrịa obi na-enye ya nsogbu.
Mana Ọkaikpe nchereoge bụ Musa Liman jụrụ ileba anya n'okwu ahụ n'ụbọchị Mọnde 15 Septemba 2025 n'ihi na o kwuru na oge ọrụ ya agwụla.
Ụlọọrụ DSS gwakwara ụlọikpe ahụ ka ha jụ ịnabata arịrịọ Nnamdi Kanu n'ihi na dịka ha siri kwuo "ndị ọkachamara na ndị ọrụ ahụike maara ọrụ bụ ha na-elekọta Kanu kemgbe ọnwa Julaị, afọ 2021 a kpọchiri ya."
DSS akọwaala ihe mere ha achọghị ka a kpọgaa Nnamdi Kanu n'ụlọọgwụ National Hospital

Ụlọọrụ DSS agwala Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ka ha jụ ịnabata arịrịọ onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu, bụ onye gwara ụlọikpe ka ha site n'aka ndị DSS kpọgaa ya n'ụlọọgwụ National Hospital maka ọrịa obi na-eyi ndụ ya egwu.
Dọkịta na-elekọta Kanu n'ụlọọgwụ DSS ṅụrụ iyi ma kwuo na DSS nwere otu n'ime ụlọọgwụ ndị kachasị mma na Naịjirịa ma nweekwa ndị ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma.
Ọ gbakwunyere na ndị ọkachamara na ndị ọrụ ahụike maara ọrụ bụ ha na-elekọta Kanu kemgbe ọnwa Julaị, afọ 2021, bụ mgbe ụlọikpe nyere iwu ka e jichie ya.
DSS kwuru na ha maara nke ọma na Nnamdi Kanu nwere ọrịa ọbara mgbali elu kemgbe ihe ruru afọ ise, tinyere ọrịa obi sitere n'ọbara mgbali elu.
DSS gara n'ihu kwuo na Kanu na-egosikwa njirimara onye nwere ọrịa afọ ma na-agbakwa ọbara n'imi ugboro ugboro.
Ha kwuru na ọ bụ Kanu ji aka ya họrọ ndị ọkachamara na ndị ọrụ ahụike na-elekọta ya anya, dịka ahụike ya nọ n'ọnọdụ dị mma.
DSS kwukwara na ụlọọgwụ National Hospital enweghị ndị nchekwa maọbụ akụrụngwa a pụrụ iji chekwaa Nnamdi Kanu nke ọma.
Cheta na Ọkaikpe Musa Liman jụrụ ileba anya n'okwu ahụ n'ụbọchị Mọnde 15 Septemba, 2025 n'ihi na o kwuru na oge ọrụ ya agwụla dịka Ọkaikpe nchereoge.
Ihe mere ụlọikpe emeghi mkpebi ma a ga-ebu Nnamdi Kanu aga n'ụlọọgwụ

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja elebazighi anya n'okwu ma a ga-ebu Nnamdi Kanu gawa n'ụlọọgwụ dịka e kwesiburu ikpebi ya n'ụbọchị Mọnde 15 Sepụtemba, 2025.
Nke a na-abịa dịka Ọkaikpe Musa Liman ji ikpe ahụ kwuru na ọ ga-eweghachị ikpe ahụ n'aka Ọkaikpe James Omotosho maka na ndị ọkaiwu Kanu adịghị njikere ka eleba ya taa.
Ọkaiwu nọchiri anya Kanu bụ Uche Njoku gwara ụlọikpe na ọkaiwu gọọmenti bụ Adeboyega Awomolo gbara akwụkwọ nzaghachị n'ụtụtụ a ma kwuo ka ụlọikpe nye ya ohere ileba anya n'akwụkwọ ahụ.
Nke a mere ka Ọkaikpe Liman jiri kwuo na ọ ga-enyefe ikpe ahụ n'aka ọkaikpe Omotosho maka na oge ezumike ndị ọkaikpe agwụla.
Mana o kwuru na ọ ga-ede akwụkwọ iji hụụ na e lebara anya n'ikpe ahụ ngwa ngwa ebe o bụ na o metụtara okwu ahụike.
Otu n'ime ndị ọkaiwu Kanu gwara BBC Igbo na ha ga-aga hụụ Ọkaikpe Omotosho ka o nwee ike ihiwe ikpe banyere ahụike ya n'ụbọchị dị nso karịa ụbọchị 10 Ọktoba e kwesịrị ikpe ikpe ya
Kanu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe maka ahụike ya
Nke a na-abịa dịka Kanu tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe site n'aka ndị ọkaiwu ya rịọ ụlọikpe ka e si n'aka ndị nchekwa DSS ma buga ya n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.
Ọkaiwu Kanu bụ Kanu Agabi gbara akwụkwọ ahụ n'ụbọchị 3 Sepụtemba, 2025 bụ nke Ọkaikpe Musa Liman nọ n'isi ya.
Akwụkwọ ọhụrụ a Nnamdi kanu gbara na-abịa dịka ndị ọkaikpe n'ụlọikpe dị elu gara ezumuike.
Mgbe Ọkaikpe Musa Liman nụrụ ikpe ahụ ka ọkaiwu Uchenna Njoku gwara ụlọikpe na ha etinyela ihe niile ha kwesiri itinye nke gunyere akwụkwọ ịnụ iyi ruru nsape iri na anọ nakwa ndekọ dọkịta nyere nke kwadoro ka Nnamdi Kanu gaa ụlọọgwụ.
Ọkaikpe Liman bụ onye mechere kwuo na ya ga-anabata ịnụ ikpe ahụ n'ụbọchị Monde, Sepụtemba 16, 2025 juru sị "gịnị mere na ọ bụghị ọkaikpe na-ekpe ikpe Namdi Kanu ka ha nwegara okwu ahụ?".
Mana ọsịsa Njoku nyere bụ na okwu ahụ bụ ihe dapụtara ma bụrụ ihe e kwesiri ime ngwa ngwa banyere ya.
Njoku kọwara na "Nnamdi Kanu adịghị arịọ ka a tọhapụ ya, kama ọ na-arịọ ka ndị DSS kpọga ya n'ụlọọgwụ Naịjirịa nke Abuja bụ ebe ndị dọkịta ga-agbakwasị ya anya nke ọma".
Ọkaikpe Liman bụ onye gechere ntị na ihe ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru sị na ya ga-ekpe ikpe gbasara akwụkwọ e nwetere ya maka na ihe gbasara ahụike mmadụ dị mkpa dịka ndụ mmadụ si dị mkpa.
Cheta na ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu banyere inyi ọha egwu n'ụlọikpe ọkaikpe James Omotosho ka na-aga n'ihu. A ga-ekpe ikpe ahụ ọzọ n'Ọktoba 10, 2025.












