BBC enyochapụtala etu ụmụnwafọ Naijiria si eji foto ọtọ mmadụ egwu ụmụaka ụmụnwoke ndịọcha chadum

Ndị ji intanet egwu chadum
    • Onye dere ya, Tir Dhondy
    • Ebeg o si, BBC Three
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

"E nwere m ihe onyonyo ebe ịgba ọtọ na ihe nile m ga-eji ememila ndụ gị."

Ihe a bụ ozi nke nwatakịrị Amerika na-eto eto aha ya bụ Evan Boettler natara na soshal midia n'aka onye o cheburu na ọ bụ nwata nwaanyị, mana nke bụ eziokwu bu na ọ bụ onye ekperima intanet.

Ka ọ gachara nkeji 90 nwata nwoke ahụ nwetara ozi ahụ, ọ kwụrụ ụdọ.

Iji ihe onyonyo agbamọtọ egwu chadum nke Bekee kpọrọ 'sextortion' bụ mpụ so na otu mpụ intanet na-efesa n'ike n'ike nke na-emetụta ụmụaka na-eto eto na mba Amerịka nakwa Yurop dịka a na-aghọgbu ụmụaka izipuru mmadụ foto maọbụ onyonyo ebe ha gba ọtọ, onye e zigara ya ewere ya na maja onye ahụ iji nweta ego.

"Oge a gwara anyị n'abalị ahụ na ọnwụọla, o nweghịkwa ihe kwere nghọta.

Nne Evan's bụ Kari kwuru sị "Aghọtaghị m etu ụdị ihe dị etu a si dakwasị ezinaụlọ

Evan Boettler

Ebe foto si, Evan Boettler's family

m."

N' ụlọ ha dị na Missouri n'Amerịka, bụ ebe ya na Nna Evan bụ Brad bi, nne nwata ahụ kọwara nwa ya dịka nwata maara akwụkwọ, na-akpata ọchị, ọ na-amasị nwata ahụ ịkụ azụ, isonye na-ekwuru na ịchụ nta.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ha kọọrọ m etu otu onye o chebu na ọ bụ nwatanwaanyị kpọrọ onwe ya, "JennyTee60'' si zitere Evan ozi n' ọbaozi 'Snapchat' n'otu ehihie na mbido ọnwa Jenụwarị afọ 2024. mana ọ hụghị ya anya.

N'egbughị oge, "Jenny" gwara ya ya zitere ya zitere ya foto maọbụ ihe onyonyo ebe ọ gbaa ọtọ ma malite na-egbughị oge iji ihe onyonyo ndị ahụ maja wa ya.

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ abụọ ọdachị a mere, mana obi iru ụjụ ka dị ndị mụrụ nwata ahụ ka o mere ụnyaahụ dịka ha na-achọ ịmara ihe mere nwa ha.

Ọba ozi intanet dịka Meta anaghị ekwe enye ozi ọbụla belụsọ ma ụlọikpe ọ manyere ha. Mana ezinaụlọ ahụ enweghị ntuziaka si ụlọikpe na-agbanyeghị na ha degara ngalaba FBI akwụkwọ.

Kemgbe Evan nwụrụ, ndị ọrụ iwu emebeghị ihe gbara ọkpụrụkpụ n'okwu ahụ.

Mana o nwere otu ihe na-arụtụ aka n'ihe mere. O nwere oge onye ekperima ịntanet ahụ nara Evan akara o ji agbape ọbaozi Facebook ya.

Nke a mere ha ji hapụ n'ebe ahụ akara gosiri ebe ha nọ apịkọ nkata kpudoro Evan nke Bekpee kpọrọ ' IP address'.

Akara ahụ nke na-egosi nzọụkwụ n'ịntanet gosiri ebe dị iche iche na Naijiria, ọtụtụ n'ime n'ebe ndị ahụ dị na Legọs bụ ebe onye ntakụkọ BBC nwere olileanya ịchọta ndị kpara nkata ahụ ghọrọ ngịga.

Ọgbakọ mbụ nwere bụ n'ebe ndị chamdum ahụ a kpọrọ "yahoo boys" bụ aha si n'ọbaozi email ha ji egwu chamdum nke malitere na mbido afọ 2000.

Ndị a bụ umụ okorobia dị n'agbata afọ 20 bụ ndị bi n'ogbe ndị ụbịam mana anya ha dị n'ego mbute na ụgbọala dị oke ọnụahịa.

Ọ bụ ebe ahụ ka m zutere Ọla. Ọ kọwara etu ya si eji foto na ihe onyonyo atụrụ ndị na-eto eto ego na-enweghị obi ụta ọbụla.

O sịrị "I jiri aha nwaanyị mepe ọba ozi. O nwere igwe intanet i nwere ike isi nweta aha si n'obodo ebe ị chọrọ."

Ngwa ngwa i mere nkea, ị chọwazịa ndị ọnya gị ga-ama.

Ụmụaka ụmụnwoke nọ n'akụkụ nke ọzọ enweghị ihe ha bụụrụ ha karịa aha nsị a na-egwu chadum na-ezigara ozi kwa ụbọchị n'olileanya na ha ga-ezitere ha ego.

A gwara m ya, na nke a gosiri onye obi tara mmiri, na o nwere ike imemila ndụ mmadụ.

Ọ sara m sị, "Ọ naghị emetụta m n'obi maka na ego dị m mkpa."

O kweghị Ola nghọta na nwata Briten maọbụ Amerịka agaghị akwụli ego a sị ya kwụọ.

N'uche ya, nwata ọbụla a mụrụ n'ala Bekee bụ onye a mụrụ n'elu ego.

Ihe ọ sara oge a jụrụ ya ihe mere o ji esiri ụmụaka ụmụnwoke ọnya.

Ọ sịrị, "Ọ bụ maka na ha na-enwe oke mmasị aramara, ọzọ bụ na egwu na e nwere ike izigara ndị klassị ha maọbụ nne na nna ha maọbụ ndị enyi ha foto ọtọ ha."

Ola na-arụrụ naanị onwe ya. Mana e nwere otụtụ otu ndị ọzọ ji foto ọtọ atụrụ ndị mmadụ ego na legọs.

Otu ụfọdụ nwere ndị isi ma na-eme a-gbata-e-kee uru ha.

Nnyocha m dugara m n'ebe n'ikpere mmiri Makoko bụ ebe ndị kachasị daa ụbịam bi na Legọs.

Iji see ihe onyonyo, anyị bụ ụzọ nata ikike n'aka onyeisi ogbe ahụ, e nwekwara ndị mbụ ụzọ du anyị gagharịa n' ogbe mmiri ahụ.

A kọọrọ m akụkọ maka alaeze ndụga a fọrọ "Hustle Kingdoms" na Bekee bụ ebe otu ụmụokorobịa ji ekwentị ekwu chadum na-arụ ọrụ ha.

Ha na-anaghị ekwe ka ese ha ihe onynyo mana dịka ekwekọrịtara, ha nyere m ohere.

N'alaeze ndọnị(Hustle Kingdom) ahụ na-ekwu maka ya, ọ dị n'ogogo abụọ nke ụlọelu.

N'ime ya otu ọnụụlọ, ụmụokorobịa dị 12 nọ ala, kọpụta mpanụkwụ dị n'ikpereụkwụ ha, ebe ekwentị ha na-akụ gịrịm gịrịm gịrịm dịka ozi si na n'aka ndị ha na-ekwere ọnya na-abata agharaaghara.

Ha na-ekerịta aha adigboroja, akwụkwọ e dere ihe ha na-agwa onye nakwa aha onye ọhụrụ mara n'ọnya ha.

Okorobịa ọbụla nwere ihe bụ ọrụ ya mana ego nile ha na-enweta na-agara onye ndu ha bụ onye ama ka onyemụọ (Ghost).

Ebe a ka ndị wayo ma ihe ekwe na-akụ na ahụziri ndị bọi ha.

Ihe na-arata ha bụ ego mbute mana nke bụ eziokwu bụ na ụmụaka ụmụnwoke na-eto eto bụ ndị a na-aranye na mpụ.

Ndị ndu ha na-akọrọ ha akụkọ ndị gbuorola ozu site ebe itinye ha niji ụgwọ nakwa nkwa na ha ga-enweta oke n'ihe a na-enweta na-eme ka isi na otu ahụ pụta siere ha ike mpụta.

Ikiri ụmụnwoke ndị a ka ha na-arụ ọrụ mere m ka m ghọta etu nke ha si dị iche na ndị na anọrọ onwe ha egwu chadum nke ha.

Nke ha bụ ihe a hazimara ahazima. Etu a ga-esi amịta ego ọfụma.

Onye gwuru Evan chadum, o so n'alaeze "Hustle Kingdom" ka ọ na-achụrụ onwe ya?

Onye ndu 'Ghost kwuru na ihe ha na-emekarị bụ igwu chadum ego site na ị gosi ịhụnanya, na ọbụghị iji foto ọtọ anapụta ụmụaka na-eto eto ego, dịka ya bụ 'onye na-atụ egwu Chineke."

O kwuru na ọ bụ naanị ndị nwere "obi ojii' ga-emeli nke ahụ.

N'alaeze 'Hustle Kingdom' iji foto anapụ ụmụaka ụmụnwoke ego bụ ihe ihere.