Lee ihe ụlọikpe kwuru banyere ikpe Nnamdi Kanu

Ọkaikpe James Kolawole Omotosho nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekwuola na ọ bụ ụbọchị Fraịde, 10 Ọktoba, 2025 ka ọ ga-enye mkpebi ya n'akwụkwọ edemede ọkaiwu na-anọchiteanya Nnamdi Kanu dere nke chọrọ ka ụlọikpe ahụ kachapụ ebubo niile gọọmenti boro Kanu.
Ụlọikpe ahụ nọrọ ụbọchị Fraịde 18 Julaị, 2025, nabata akwụkwọ ahụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi (SAN) dere.
Akwụkwọ ahụ kwuru na ha chọpụtara ọtụtụ ihe dị iche iche oge a gbara ndị akaebe gọọmenti kpọtara ajụjụ ọnụ banyere ikpe Nnamdi Kanu.
O kwuru na ụfọdụ asịsa ndị akaebe ahụ sara megidere iwu tinyere na Nnamdi Kanu anọọla na ụlọmkpọrọ ruo afọ isi nke ọkaiwu Agabi kwuru na o megidere iwu.

Nnamdi Kanu awuchiela n'ụlọikpe maka ikpe ya nke taa

Ikpe Nnamdi Kanu nke taa ga-amalite n'ụtụtụ a 18 Julaị 2025.
A na-atụanya na ọkaikpe Omotosho nke Ụlọikpe nke Ukwuu dị n'Abuja ga-anabata akwụkwọ ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu dere.
Cheta na, n'ụbọchị ikpeazụ Nnamdi Kanu gara ụlọikpe e mere n'ụbọchị 19 June, 2025, Ọkaikpe Omotosho nabatara ayịyọ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Agabi SAN nyere ha ụbọchị 14 iji depụta akwụkwọ ayịyọ ha na e nweghị ikpe ma nyekwa ụbọchị 14 ọzọ ka ha ji zaghachị.
A ga-eche ka ọkaikpe nabata edemede ha abụọ.
Ihe ụlọikpe gwara ọkaiwu Nnamdi Kanu dịka gọọmenti mechiri ikpe ya

Ụlọikpe ukwu enyela ndị ọkaiwu na-anọchitanya Nnamdi Kanu abalị iri na anọ ka ha gbaa akwụkwọ na-egosi na Nnamdi Kanu enweghị ikpe ọbụla.
Ọ gara n'ihu nye ndị ọkaiwu gọọmenti etiti abalị iri na anọ iji zaghachi akwụkwọ ikpe ha.
Nke na-abịa dịka ụlọikpe ahụ gbachara ndị akaebe gọọmenti kpọtara ajụjụ ọnụ.
Tupu emechie ikpe ahụ, ọkaiwu gọọmentị bụ Adegboyega Awomolo gbara onye ọrụ ndị uweojii nzuzo "DSS" a kpọro EEE ajụjụ ọnụ dịka otu n'ime ndị akaebe gọọmentị etiti kpọtara.
Onye akaebe ahụ boro Nnamdi Kanu ebubo ịgwa ndị mmadụ ka ha wakpoo ndị ọrụ nchekwa ma mebie ihe onwunwe ọha mgbe ndị ntọrọbịa Naịjirịa mere ngagharịiwe "End SARS" n'afọ 2020.
N'aka nke ọzọ, ọkaiwu na-annọchite Nnamdi Kanu bụ Onyechi Ikpeazu kwuru na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ga-azaghachi ebubo ahụ n'oge kwesịrị ekwesị.
Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe yigharịrị ikpe Nnamdi Kanu ụbọchị Fraịde Julaị 18, 2025.
"A maara m na Nnamdi Kanu na-agbasaozi megide ndị ọchịehi na-ebu egbe" - Onye akaebe Gọọmentị Naịjirịa

Ikpe ebubo iyi ndụ egwu nke Gọọmentị Naịjirịa boro Nnamdi Kanu na-aga n'ihu n'ụbọchi Wenezde 18 Junn, 2025 n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Ndị ọkaiwu Kanu nyochara ma gbaa onye akaebe nke anọ Gọọmentị kpọtara ka ọ gbaa ama megide Kanu ajụjụọnụ.
Onye akaebe a gwara Ọkaikpe James Omotosho n'isi ikpe ahụ na Kanu kwetere na ọ bụ ya nwe igwe mgbasaozi redio a kpọrọ 'transmitter' mana o tinyere ya n'ulọ otu nwoke a na-akpo Benjamin Madubugwu.
Ọ gara n'ihu kwuo na Kanu ji igwe mgbasaozi redio kpalie ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee wakpoo ma mee mpụ ndị ọzọ gụnyere igbu ndị Hausa, Fulani na ndị ọrụ nchekwa.

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ikpeazu jụrụ onye akaebe a ma ọ maara na Kanu kwuru okwu megide ịgbara ụlọụka na ụlọalakụba ọkụ, dịka iwe ya bụ maka ndị Fulani na-achị ehi na-ebu egbe na-aga n'ime ọhịa dị na Ndịda Anyanwụ.?
Onye akaebe ahụ zara ya na nke a bụ isiokwu mgbasaozi Nnamdi Kanu kamgbe ọmalitere izisa ozi ma kwuo na dịka onye nchekwa, ọ na-ewe iwe ma ọ bụrụ na e gbuo mmadụ.
Cheta n'ụbọchị Fraịde 13 Juun 2025 onye akaebe a a kpọrọ 'Mr DDD' gbara ma gwaa ụlọịkpe na Nnamdi Kanu zubatara igwe mgbasaozi redio a kpọrọ 'transmitter' na Naịjirịa n'ime ngwa ndị e ji ebi n'ụlọ.
Ọkaipke James Omotosho nọ n'isi ikpe ahụ gara n'isi ụlọọrụ ndị DSS gaa nyochaa igwe mgbasaozi ahụ site n'arịrịọ ọkaiwu gọọmentị bụ Adegboyega Awomolo rịọrọ ya.
Ka ọ gachara, Ọkaikpe Omotosho nabatara igwe mgbasaozi redio ahụ na ihe ndị ọzọ ọ hụrụ dị ka ihe akaebe megide Kanu
"Nnamdi Kanu zubatara igwe mgbasaozi redio na Naịjirịa n'ime ngwa ndị e ji ebi n'ụlọ"

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye akaebe nke anọ ekwuola na Nnamdi Kanu zubatara igwe mgbasaozi redio na Naịjirịa n'ime ngwa ndị e ji ebi n'ụlọ.
Ya bụ onye akaebe a Gọọmentị Naịjirịa kpọtara kwuru nke a oge a malitere ikpe onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu ikpe n'ụbọchị Fraịde 13 Juun 2025.
Onye akaebe ahụ a na-akpọghị aha gosiri ụlọikpe efere CD nke ihe onyonyoo dị n'ime ya.
Onyonyoo ahụ gosiri oge Nnamdi Kanu na-atụle 'container' bu ngwa dị iche iche e ji ebi n'ụlọ, nke gụnyere akwa, igwe a ji asa akwa, igbe gaasị e ji esi nri na ihe ndị ọzọ.
Otu mpaghara onyonyoo ahụ gosikwara ebe Kanu na-egosipụta igwe mgbasaozi 'transmitter' ọ kpọrọ 'monster'.
Ikpe onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu nke ụbọchị 13 Juun 2025 amalitela n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja.
Nnamdi Kanu, ndị Ọkaiwu ya na ndị Ọkaiwu na-anaọchite anya Gọọmenti Naịjirịa ka a hụrụ n'ime ụlọikpe ahụ n'ụbọchị Fraịde 13 Juun 2025.
Cheta na Ọkaikpe nọ n'isi ụlọikpe ahụ bụ James Omotosho kagburu ihe akaebe gọọmenti etiti wetara n'ụlọikpe nke gosiri onyonyo ebe Kanu na-akọwa onwe ya n'ụlọọru DSS n'afọ 2015.
Nke a mere n'ụbọchị ikpeazụ e lebara anya n'ikpe nwaamadị ahụ.
Ọkaikpe Omotosho kwuru na ihe mere ụlọikpe ji kagbuo ihe akaebe ahụ bụ n'ihi na "okwu Nnamdi Kanu kwuru n'ụbọchị 21-24 Ọktoba nakwa 4 Nọvemba, 2015 bụ nke iwu na-akwadoghị".
Ọ bụkwa n'ụbọchị ahụ ka Ọkaikpe James Ọmotosho machibidoro Favour Kanu bụ nwunye nwanne Nnamdi Kanu, ịbata n'ụlọikpe ya ọzọ.
Ọkaikpe Omotosho mere nke a n'ihi na Favour Kanu kwetara na ọ bụ ya na-agbasara ụwa ihe niile mere n'ụlọikpe site n'ọbaozi soshal midịa.
Nnamdi Kanu: Ọkaikpe amachibidola nwunye nwanne ya ịba ụlọikpe ya

Ọkaikpe James Ọmotosho machibidoro Favour Kanu bụ nwunye nwanne Nnamdi Kanu, ịba ụlọikpe ya.
Ọkaikpe mere nke a ka ọ gwara ya ka o bilie, ma jụọ ya ma ọ bụ ya mere mgbasa ozi ụlọikpe nye ụwa niile,
Favour Kanu ekwete na ọ bụ ya mere ya.
Ọkaikpe Omotosho gwaziri ya ka o si ụlọikpe ya pụọ ma kwuokwa na a machibidola ịba n'ụlọ ikpe ya makwa ịbanye n'ogige ụlọikpe ya, ewezuga ma ọ bụrụ na o nwere ikpe nke ya.
Ọkaikpe yiri ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu n'ọnwa Juun 13, 16, 18 na 19 2025
Ọkaikpe Omotosho akagbuola ihe akaebe gosiri ebe Kanu na-akọwa onwe ya n'ụlọọru DSS

Ọkaikpe James Omotosho kagburu ihe akaebe gọọmenti etiti wetara n'ụkọikpe nke gosiri onyonyo ebe Kanu na-akọwa onwe ya n'ụlọọru DSS n'afọ 2015 maka na "okwu onye a na-ekpechite ọnụ ya bụ Nnamdi Kanu kwuru nke ụbọchị 21-24 Octoba na Nọvemba 4, 2015 bụ ihe akaebe na-akwadoghị"
Ọ si na ụlọikpe agahị anabata ihe onyonyo Kanu mere mgbe a na agba ya ajụjụ ọnụ n'ụlọọrụ ndị DSS.
Dịka ikpe Mazi Nnamdi Kanu gara n'ihu n'ụbọchị Tọzdee Mee 29 ihe a na-atụ anya ya bụ na okaipke Justice James Omotosho ga-enye iwu na ikpe n'ime ikpe nke emere na Wenezdee Mee 28, iji chọpụta nke bụ eziokwu na nnabata nke nkwupụta ndị Kanu nwetara n'afọ 2015, ma malite nyocha onye akaebe DSS nke atọ.

Ka ikpe malitere, ọkaiwu gọọmenti etiti Suraj Saida SAN agwala ọkaikpe James Omotosho ka o were ihe onyonyo abụọ na akwụkwọ nkwupụta nke Nnamdi Kanu mere na ụlọọru ndị DSS n'Abuja ka ọ bụrụ ihe akaebe ha.
Ihe na-ebute isi owuwa bụ na Nnamdi Kanu gwara ọkaipe ụbọchi Wenezdee Mee 28 na nkwupụta okwu omere na ụlọọru DSS nke gọọmenti etiti chọrọ iji mere akaebe bu nke omere na mmanye ujọ.
Ọkaiwu gọọmenti etiti Suraj Saida kwuru n'agbanyeghị na iwu metụtara mpụ nke a na-akpọ Administration of Criminal Justice Act 2015, kwuru na ọkaiwu ndị a gbara akwụkwọ ga anọ n'oge a na ede nkwupụta, O kwusiri ike na akwụkwọ Ihe akaebe nke 2011, Evidence Act si na ọnuno maọbu anọghị onye ọkaiwu abụghị iwu maka nnabata ihe ngosi
Ọkaiwu Nnamdi Kanu Paul Erokoro SAN gwara ọkaikpe na onyonyo ndị gọọmenti etiti chọrọ iji mee akaebe na egosi na ihe nkwupụta ahụ abụghị mmasi Nnamdi Kanu dịka ndị ọrụ DSS nọ na-amachi ya ọnu nakwa n'atuzịrị ya ihe ọ ga-ede.
Nnamdi Kanu ekwuola na DSS magidere ya n'ike ikwupụta ihe ha ji ama ya ikpe ugbua

Ikpe Nnamdi Kanu nke ụbọchị 28 Mee, afọ 2025 malitere dịka a na-atu anya na gọọmenti etiti ga-akpọta onye akaebe nke atọ ha.
Ikpe ebubo iyi ọha egwu gọọmenti Naijiria boro Nnamdi Kanu amalitere ọzọ nke ụbọchị iri n'ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja taa bụ Wenezdee 28 Mee, 2025.
Dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu Kanu gwara ụlọikpe na ihe ndị DSS wetere n'ụlọikpe dịka ihe akaebe megide ya bụ ihe ndị o kwuru maka na ha magidere ya n'ike ikwu ha.
O kwupụtara nke a mgbe ọkaiwu gọọmenti etiti na-agba onye akaebe nke atọ a kpọrọ CCC ajụjụọnụ n'ihe ọma gbasara ikpe Nnamdi Kanu.
Onye akaebe ahụ bu onye ọrụ DSS gbara afọ iri abụọ na isii n'ọrụ nchekwa kwuru na o so ndi gbara Kanu ajụjụọnụ na 21-23 Ọktoba 2015 mgbe a kpọtara ya n'isiụlọọru ha ebe Kanu nyere nkwupụta ederede.
Okaiwu gọọmenti bụ Awomolo nyere ụlọikpe nkwụputa ahụ nọ n'akwụkwọ edemde ha na ihe onyonye mgbe a na-agba Kanu ajụjụọnụ n'ụlọọrụ DSS kaa akara ihe ngosi PWQ na PWR.
Na mbụ, okaiwu Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi emegideghị okwu ndị a na-anabata n'ụlọikpe, mana o mechara gwa ụlọikpe na Nnamdi Kanu gwara ya na o kwuru okwu ndị ahụ na mmanye ujọ nke DSS manyere ya.
Onye okaikpe Justice Omotosho gwara Agabi ka ozi ụlọikpe ihe gosiri na ọ bughi mmasị Nnamdi Kanu ime nkwupụta ọbụla n'ime akwụkwọ nkwupụta ndi ahụ.
Na nkọwa otu Okaiwu Erokoro onye ha na Nnamdi Kanu gbara izu ntakiri gwara ụlọikpe na Kanu kwuru na ya rịọrọ ka onye ọkaiwu ya nọrọ mgbe ọ na-ewere okwu ndị ahụ mana DSS jụrụ.
Nke abuo, o kwuru na-etinyere naani ya n'ụlọ mkpọrọ DSS ebe onye ọrụ DSS ana akpọ Mr. Brown mere ya egwu na ọ bụrụ na o deeghị ihe a gwara ya, na agaghị ewepụta ya n'ụlọ mkpọrọ.
Ọzọkwa, Erokoro kwuru na Kanu gwara ya na o nwere ọbara ọgbụgba n'imi mgbe ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ mana otu dọkịta DSS dụrụ ndi DSS ọdụ ka ha kpọputa ya na mkpọrọ ka ikuku dị mma metu ya na ahu iji kwụsị ọbara ọgbụgba n'imi ya mana onye ọrụ DSS ahụ tụrụ ya egwu, gwara ya na ọ bụrụ na ya mee ihe ha gwara ya dịka ihe nkwupụta ha chọrọ ka ọme, ha ga ewepụta ya na mkpọrọ otu awa ka ikuku ọhụrụ metu ya
Dịka nke a na-eme, ọkaiwu Awomolo gwara ụlọikpe na ebubo mmanye nke Nnamdi kanu na-eme bụ ụgha na enweghị ike ịgba akaebe. O kwuru na ha nwere ihe onyonyo gosiri Kanu ka a na-agba ya ajụjụ ọnụ nakwa ka ọ na-ekwu nke a n'akwụkwọ akụkọ, na onweghị ihe akaebe ọ bụla na-egosi mkpagbu ma ọ bụ mmanye Kanu site n'aka ndị DSS.
N'oge a, ọkaikpe Omotosho nyere iwu ka a kpee ikpe n'ime ikpe iji chọpụta na ebubo nke mmanye bụ eziokwu.
Cheta na ụbọchị Tuzdee 22 Mee, Ụlọikpe Ukwu nabatara ihe onyonyo ihe akaebe nke Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, nke onye bụbụ Minista na-ahụ maka nchekwa bụ TY Dajuma nakwa onyeisi ndị uweojii nzuzo Naijiria n'ikpe a na-ekpe onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Rute ugbu a, gọọmenti etiti akpọtala ndi akaebe mmadụ abụọ dịka ana atu anya na ha ga akpọta onye akaebe nke atọ na ubochi taa
Mgbe ụlọikpe nabatara ihe akaebe Hope Uzodimma, TY Danjuma, onyeisi DSS

Ụlọikpe Ukwu anabatala ihe onyonyo ihe akaebe nke Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, nke onye bụbụ Minista na-ahụ maka nchekwa bụ TY Dajuma nakwa onyeisi ndị uweojii nzuzo Naijiria n'ikpe a na-ekpe onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu maka ebubo iyi ndụ egwu.
Nke a mere ụbọchị Tọzde dịka a na-agba onye aka e nyere aha Mr BBB ajụjụ ọnụ, e webatara ihe onyonyo atọ nakwa mpụtara nchọpụta e mere banyere ọgbaghara Endsars.
N' ihe onyonyo nke Uzodinma, o kwuru na ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ n' Imo Steeti esighị ndị IPOB n'aka kama ọ bu ndị ndọrọndọrọ ọchichi.
O nyere ọmumatụ mgbe e gburu ndị isi ọchịchị ime obodo pati APC atọ mana o nweghị onye pati PDP e gburu.
N'ihe onyonyo nke Danjuma bụbụ Onyeisiagha Naijiria o kwuru na ndịagha Naijiria na ndị na-eyi ndụ egwu na-egbunye n'otu akpa, ma dụọ ọha mmadụ ka ha malite chekwawa onwe ha.
N'otu aka ahụ, onyeisi ndịagha ndị uweojii nzuzo bụ Oluwatosin Adeola Ajayi, dịka ọ na-ekwu banyere obodo Azare dị na Bauchi steeti nakwa Tafawa Balewa dị na Sokoto, kwuru na ha ji aka ha kpaa nkata etu ha ga-esi akwụsị nsogbu ndị boko haram na ndị ekperima a kpọrọ"bandits" na Bekee n'obodo ha, sị, " Ị gaghị na-atụ anya na ndịagha na ndị uweojii ga-echekwa ebe nile na Naijiria. Ọ gaghị ekwe omume. Anyị kkwesịrị ịkpalite obodo ikuli chekwa onwe ha. Ugbua bụ oge ."
Etu ikpe a nke ụbọchị 22 nke ọnwa Mee si malite

Ikpe ebubo iyi ọha egwu gọọmenti Naijiria boro Nnamdi Kanu amalitere ọzọ nke ụbọchị asatọ n'ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja taa bụ Tọzdee 22 Mee, 2025
Cheta na ụbọchị Wenezde 21 Mee, 2025 tupu onye ọkaikpe James Omotosho ebigharia ikpe ahụ taa bụ Tọzdee 22 Mee, 2025, ọ gwara ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ka ha gba mbọ ihu na ịgba ajụjụ ọnụ onye akaebe nke abụọ gọọmenti etiti kpọtara gwụrụ taa.
Na Wenezde 21 Mee, 2025, onye akaebe nke abụọ a gbara ajụjụ ọnụ n'ụlọikpe nke akpọrọ aha ya dịka Maazị BBB bụ onye ọrụ DSS gwara ụlọikpe na ọ bụghị ụlọọrụ Department of State Service nwụchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021 na Kenya
Ka ọna eme ugbu a n'ụlọikpe enwere olileanya na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ga-emecha ajụjụ ọnụ Maazị BBB dịka onye ọkaikpe James Omotosho si kwuo
Anyị ga eweta nkọwa ndị ọzọ ka osi eme n'ụlọikpe ma emecha
DSS gọrọa na aka ha adịghị na nwuchi ya na mba Kenya

Ebe foto si, Getty Images/DSS/X
Onye akaebe nke abụọ a gbara ajụjụ ọnụ n'ụlọikpe a kpọrọ aha ya dịka Mr BBB ma bụrụkwa onye ọrụ DSS, agwala ụlọikpe na ọ bụghị ụlọọrụ Department of State Service nwụchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021 na Kenya.
Ọ gbara ama a oge ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara ya ajụjụ ọnụ n'ụlọikpe ụbọchị Wenezde 21 Mee, 2025.
N'okwu ya "Ọ bụ naanị na Naịjirịa ka DSS nwere ikike ịrụ ọrụ".
Oge ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Paul Irokoro (SAN) jụrụ onye akaebe ahụ ka ọ maara na enwere oge onyeisi ụlọọrụ DSS bụ Adeola Ajayi gwara ndị mmadụ ka ha bilie ma chekwa onwe ha, o kwuru 'mba.'
Ụlọikpe dọrọ ndị ọkaiwu Kanu aka na nti banyere ibipụta ozi na soshal midia

Dịka ikpe ebubo iyi ọha egwu gọọmenti Naịjirịa boro Nnamdi Kanu malitere ọzọ n'ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja ụbọchị Wenezde 21 Mee, 2025, Ọkaikpe James Kolawole Omotosho adọọla ọkaiwu Aloy Ejimakor na-anọchiteanya Nnamdi Kanu aka ná ntị banyere ozi dị agha ọ na-ewepụta na soshal midịa banyere ikpe ahụ.
O kwuru na agwa dị etu a jugburu onwe ya ma bụrụ ihe megidere usoro e ji ekpe ikpe.
Ọkaikpe Omotosho mere ka o doo anya na ịga n'ihu na-ewepụta ozi na-ezighị ezi banyere ikpe ahụ bụ ihe nwereike ibute ntaramahụhụ onye ọkaiwu.
Ọ dụrụ ọkaiwu Ejimakor ọdụ ka o tinye uche ya n'ikpe ahụ iji hụ na ikpe Nnamdi Kanu onye nogoro ọtụtụ afọ na nga gara ngwa ngwa ma ghara ịkpa agwa ọbụla ga-adọghachi aka elekere azụ n'ikpe ahụ.
Ndị ọkaiwu Kanu gbara onye akaebe gọọmentị nke abụọ ajụjụọnụ

Ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu, onyendu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) n'ihu Ọkaikpe Kolawole Omotosho nke ụlọikpe ukwu Naịjirịa dị n'Abuja amalitela ọzọ n'ụbọchị Wenezde 21 Mee, 2025.
A na-ekpe Kanu ikpe maka ọnụebubo asaa gbagidere ụkwụ n'iyi ndụ egwu nke Gọọmentị Naịjirịa boro ya.
N'ikpe nke a, ndị ọkaiwu Kanu ga-aga n'ihu ịtụle nakwa ịgba onye akaebe nke abụọ gọọmentị Naịjirịa kpọtara ajụjụọnụ.
Cheta na ndị ọkaiwu Kanu jụrụ ịgba onye a ajụjụ maka na o weteghi akwụkwọ zuru oke n'ime akwụkwọ ndị a sị ha weta.
Mgbe ụlọikpe nabatara asambodo n'ọnwụ Gulak dịka ihe akaebe megide Kanu

Ụlọikpe dị elu n'Abuja anabatala akwụkwọ asambodo ọnwụ Ahmed Gulak dịka ihe akaebe n'ikpe Nnamdi Kanu.
Dịka gọọmentị etiti Naịjirịa na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe inyi ọha egwu, akwụkwọ asambodo ọnwụ Ahmed Gulak nke ndị ụlọọgwụ wepụtara bụ otu n'ihe akaebe nke ụlọikpe nabatara taa n'Abuja.
Ọkaikpe James Omotoso nabatara asambodo ahụ n'oge onye ọkaiwu nke Gọọmenti etiti bụ Adegboyega Awomolo nwere asambodo ahụ nakwa akwụkwọ ndị ọzọ nye ụlọikpe.
Ihe ndị ọzọ dị na-akwụkwọ ụlọikpe nabatara gunyere ndekọ ndị uweojii n'Imo steeti bụ nke na-ekwu na aka ndị IPOB dị n'ọnwụ Gulak.
Onye bụ Ahmed Gulak na ihe mere e ji ebo Kanu ebubo maka ọnwụ ya?

Ebe foto si, BBC/Gulak
Kamgbe Ọkaikpe James Omotoso nabatara ndekọ ọnwụ Ahmed Gulak dịka ihe akaebe n'ikpe inyi ọha egwu gọọmenti etiti Naịjirịa na-ekpe Nnamdi, ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ onye bụ Ahmed Gulak.
Ndị ọzọ na-ajụ ajụjụ dịka kedụ oge egburu ya nakwa etu esi gbuo ya.
Anyị chetere na Ahmed Gulak bụ onye chịkọtara ọgbakọ mere ntụliaka ime ụlọ nke Imo steeti n'afọ 2019.
Ọgbakọ ahụ họpụtara Hope Uzodimma na-achị Imo steeti ugbua na ntuliaka ime ụlọ APC Imo steeti mere n'afọ ahụ.
Gulak bụbu onye enyemaka nakwa ndụmọdụ Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa.
O si na pati Peoples Democratic Party fegaa na All Progressives Congress n'afọ 2018.
Ọkaiwu Nnamdi Kanu jụrụ ajụjụ maka ndekọ ọnwụ Ahmed Gulak ụlọikpe nabatara
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Agabi Kanu mere nnyocha ma jukwaa ajụjụ banyere ndekọ ahụ ndị uweojii wepụtara maka ọnwụ Ahmed Gulak nakwa akwụkwọ asambodo ụlọọgwụ dere maka ya.
Agabi Kanu nyopụrụ na onyonyoo e nyere ụlọikpe nke DSS sị na ha na-agba Nnamdi kanu ajụjụ ọnụ gosiri na ọ bụ naanị Nnamdi kanu na ndị ọzọ ka a hụrụ n'onyonyo ahụ mana ndị na-agba ya ajụjụ ọnụ apụtaghị na ya.
Agabi rụtụrụ aka n'onyonyoo ahụ dịka ọ bụ adịgboroja maọbụ ihe na-ezughị ezu. Mana onye akaebe nke gọọmenti etiti kwuru na onyonyoo ahụ zuruoke.
Ọ sị na ọ bụ etu ahụ ka ndị DSS si agba mmadụ ajụjụ ọnụ.
Agabi wegara uche ụlọikpe n'etu e si jide Nnamdi Kanu kamgbe, mana onye akaebe DSS kwuru na ọrụ ya bụ naanị ime nnyocha maka ikpe ahụ ma kwuo na aka ya adịghị n'etu ọnọdụ Nnamdi Kanu dị maọbụ etu e siri jide ya.
Nnamdi Kanu: Ọkaikpe Omotosho eyiela ụbọchị ikpe ya gaa ụbọchị Mee 14

Onye ndu otu nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na Legọs anoghị n'ala Biafra n'ọsịsa ebubo na o nyere iwu n'oge ngagharịiwe EndSars ka e mebie ihe ma gbuo ndị mmadụ na ngaghaịịwe ahụ mere n'afọ 2020.
Kanu kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde dịka ọ na-azara ọnụ ya n'ihu ọkaikpe Jọstịs James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja n'ikpe dị n'etiti ya na Gọọmentị Etiti.
N'ọsịsa ajụjụ a jụrụ ya n'ikpe nke e kpere ma uche ya ọ dị n' iwu o nyere mgbe e mere ngagharịịwe EndSARS ka ndị na-eso ya mebie ihe na Legọs mere ka ọtụtụ mmadụ nwụọ, ọ zara si na "Legọs abughị ala Biafra".
A na-ekpe Kanu maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị etiti.
Onye ọkaịwu Gọọmenti Etiti Adegboyega Awolowo gwara onye ọkaikpe ka ụlọikpe gosi ihe akaebe vidiyo ebe ndi DSS na-agba Nnamdi Kanu ajụjụ ọnụ.
Mgbe e tinyere onyonyo ahụ, a hụrụ ebe onye akaebe Gọọmenti Etiti na-aru ọrụ na DSS na ndị ọzọ na-agba Nnamdi Kanu ajụjụ ọnụ dịka ndị ọkaiwu ya nọ na-ele anya
Mgbe ha malitere ajụjụ, Nnamdi Kanu kwụrụ na IPOB nke dika Amotekun bụ otu nkewapụ nke e guzobere iji mezuo ọchịchọ nke ndị Ọwụwa Anyanwụ site na referandum.
Ọ gara n'ihu na-ekwu na ụlọikpe na 2017 nyere ya ntọhapụ mana ndi nchekwa biara n' ụlọ ya chọrọ igbu ya nke mere o ji gbaa ọsọ.

O kwụrụ na ọ na-edu ndị Ipob, mana omume ha kwa ụbọchị anoghị ya n'aka dịka ọ si kwuo na ọ maghi na ha emebi ihe maọbu na-egbu mmadụ.
Dịka ajụjụ si aga, ọ gwara ndị DSS na ha chọrọ itinye ihe ọjọ nile na eme na ndịda ọwụwa anyanwụ n'isi IPOB mana mgbe ha rụrụ na ụlọịkpe ọga egosi na ọbu ndi nchekwa na-egbu ndị mmadụ.
Ọ jụrụ ha ihe mere ha ji n'ele anya na ihe ndi Ipob mere n' afọ 2020, ma hapụ ile anya ndi gburu mmadụ kemgbe afọ 2014, 2015, 2016.
Mgbe a jụrụ ya ka o si ewe ndi ọrụ, o si na ya anaghị ewe ndị ọrụ, na onye Biafra ọ bụla bụ onye otu IPOB.
Mgbe a jụrụ ya ihe gbasara iwu nọrọnụlọ o tinyere, Nnamdi Kanu kwuru na ọ gwara ndị mmadụ nọ n' Ọwụwa Anyanwụ ka ha nọrọ n'ụlọ mana o nweghị ndị o tinyere mma n'olu ka ha rube isi.
Tupu Igba ajụjụ ọnụ ahụ agwu, Nnamdi Kanu kwụrụ na onye ọbula gwara ndi nchekwa ka ha mee mwakpo n' ụlọ ya bụ ezigbo onye iro Naijiria maka ha na ndị a ma ama n' Ọwụwa Anyanwụ gụnyere Ọkammụta Ben Nwabueze na-akparịta ụka etu a ga-esi bie okwu ahụ n'ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị.
Onye ọkaiwu gọọmenti etiti bụ Awomolo jụrụ onye akaebe a ihe ha chere na nnyocha nke Nnamdi Kanu na ihe nile o mere, o kwuru na ha chọpụtara na ọtụtụ n'ime ogbugbu ndị a na-egbu n' Ọwụwa Anyanwụ bụ kpọmkwem n'ihi mgbasa ozi Nnamdi Kanu.
Ogbugbu ndị a gunyere ọnwụ Ahmed Gulak n'abalị 30 Mee, 2021, nke bụ mgbe Nnamdi Kanu gwara ndi mmadu ka ha nọrọ n'ụlọ, ọnwụ Gloria Mathew na Linus Musa ndi nke e gbụrụ ma wepụ isi ha.
E yigharịrị okwu ahụ ruo Mee 14, 20 na 21 nke afọ 2025.
Nnamdi Kanu: Onye akaebe Gọọmenti Naịjirịa amalitela igosi ihe onyoonyo ndị ọzọ
Ikpe Nnamdi Kanu nke ụbochi ishi, Tọzde 8 Mee amalitela na ụlọịkpe dika onye akaebe gọọmenti etiti ga-aga n'ihu na-agba akaebe ihe ọma gbasara ikpe Nnamdi Kanu.
Onye akaebe gọọmenti etiti enyela ihe akaebe vidiyo nke ebe Nnamdi Kanu na-akparị ndị na-eso ya ka ha megide ndị ọrụ nchekwa ma mebie ihe onwunwe gọọmentị
Ka ọ na eme ugbua, onye akaebe ahụ enyela ihe akaebe onyoonyo nke ebe Nnamdi Kanu na-ekwu imegide ndị ọrụ nchekwa ma mebie ihe ndị gọọmentị wuru n'ọwụwa anyanwụ mana onye ọka iwu Nnamdi Kanu jụrụ nnabata nke ihe akaebe ndị a mana ọ ga-enye ihe kpatara ya n'okwu ha ọzọ.
Lee ihe mere na ụlọikpe ụbọchi ise na ikpe Nnamdi Kanu Wenezde 7 Mee
Ka onye akaebe gọọmenti etiti nke na arụ ọrụ na DSS malitere igba akaebe ihe ọ ma gbasara Nnamdi Kanu, ọ gwara onye ọka ikpe na oge ha na agba onyeisi IPOB ajụjụ na ụlọ ọrụ ha, Kanu kwenyere mgbe ha ziri ya ihe onyonye vedio di iche iche o mere nke ọ na agwa ndi na-eso nzọmukwu ya ka ha mebie ngwungwu gọọmenti
Ọ kọwara na onye ọkaiwu ukwu nke gọọmentị Naijiria na 10th Juun 2021, zitere akwụkwọ ozi na-arịọ onyeisi ndị DSS ka o nyochaa Nnamdi Kanu maka ebubo ndị metụtara iyi ọha egwu nke onye ọka ikpe ahụ nabatara akwụkwọ ozi ahụ dị ka ihe akaebe.
O kwuru na ọkaiwu ukwu nke gọọmenti boro Kanu ebubo gunyere igba izu ọjọọ, igbu ọchụ, igba ihe ndi mmadụ ọkụ na igbu ndị ọrụ nchekwa
Onye ọru DSS nke na agba akaebe gara n'ihu na-ekwu na akwụkwọ a gosiri ebe Nnamdi Kanu mere mgbasa ozi site na facebook mgbe emechara ngharịịwe nke EndSARS ka ọ na-agwa ndi mmadụ bi na legoz ka ha chụrụ ndi nchekwa ebe ọbula ha nọ wee gbuo ha.
Kaa mkpọtụ nọ na-eme na ụlọ ikpe nyere mkpughe na-awụ akpata oyi n'ahụ nke onye akaebe na-ekwu, o kwuru na onwere mgbe Nnamdi Kanu mere mgbasa ozi site na facebook na-agwa ndi mmadụ ka ha rụpụta mgbọ ma jiri ya wakpo ndị ọrụ nchekwa.
Ọ gwara ndi ụlọikpe na site n'ntuziaka ndị a nile onyeisi ndi IPOB nyere ndi na-eso ya, ọtụtụ Ihe onwunwe na ihe ndị mmadụ nwere mmebiri dika ndu ndi mmadụ lara n'ihi nke gunyere ọnwu Ahmed Gulak na Imo steeti na ọku agbara ụlọ aka na-achi Imo steeti.
Mgbe onye ọkaiwu nke gọọmenti etiti gosiri onye akaebe DSS otu akwụkwọ, o kwuru na ihe ahụ bụ nkwuputa Nnamdi Kanu mere na 17 Julai nke ụlọikpe nabatara ya kaa akara ngosi PWG.
N'ime nkwuputa ahụ, Nnamdi Kanu kwuru na ọ chọrọghị ime nkwupụta edere ede banyere ebubo nke ọkaiwu ukwu nke gọọmenti AGF mere maọbu ikwu nkwupụta ọ bụla ọzọ n'ọnụ ma ọ bụ n'ede, n'ihi na ọ kwenyere na okwusigo ihe niile o nwere ikwu banyere ihe ana ajụ ya.
Onye akaebe a si na ha nwere na onyonyo ebe ha na-agba Nnamdi Kanu ajụjụ ọnu dika okwenyere na ọ bụ ya mere ufọdu ihe ndi egosiri ya na onyonyo nke gunyere ntụziaka na iwu ndi onyere ndi na-eso ya site na onyonyo facbook
Onye ọkaiwu gọọmenti etiti gara n'ihu chọrọ inye igwe eji etinye ozi nke anakpo flashdrive nke bu ọtutụ onyonyo ndia ahụ Nnamdi Kanu mere na facebook ka ọ buru ihe akaebe mana onye na anọchite anya ndi ọkaiwu onyeisi ndi IPOB, Emeka Etiaba jụrụ ka ha tinye na ụlọikpe ka akaebe
Mgbe emechara tinye Flasdrive ahu na onyonyo Telivishọn ka ndi nọ na ụlọịkpe hu nke emere na 12 December 2020, ihe ndi egosiri n'ime ya gunyere ọtụtụ ihe ndi Nnamdi Kanu kwuru dika:
- Anyị enweghị ike inyefe ala anyị n'aka ndi na-akpọ anwụrụ
- Nkwupụta nke nguzobe ESN (Kanu kwuru na ọ na-eche maka ndị gọvanọ nke ndịda ọwụwa anyanwụ ka ha mee ihe ndị nọ na ndịda anyanwụ mere, mana ebe ọ bụ na ha anaghị eme ya, anyi na-ewere aka anyi ime ya
- Anyi agaghị emechi anya na ele ndị agha Naijiria ka ha na-egbu ndi Biafra
- ESN bụ ihe anyi ji azaghachi nkwafu ọbara nke ana eme na ala igbo
- Onwu onye Biafra ọbula ga-enwe nkwughachi. Ọ bụrụ na ị gbuo onye Biafra ọbụla, a ga-egbu gị, na ihe ndi ọzọ
Mgbe nke onyonyo a gachara, enwere ọzọ etinyere nke anụrụ olu nke ha boro ebubo na ọ bụ olu Nnamdi Kanu ka ọ na agwa ndi mmadu ka ha mebie ma munye ọkụ ụlọ gọọmenti etiti ọbula nọ na Legọọs steeti.
Ọ si kwa na onyeisiala Tinubu nọ na nsogbu, n'ebe ọbula ọ gbara ọsọ ga, ha ga ejide ya.
Ọkaiwu gọọmenti Naịjirịa kpọrọ onyoonyo na ọdịyo dịka akaebe n'ikpe Nnamdi Kanu
Ụbọchị Tuzde 7 Mee, 2025 ga-eme ya abalị ise kemgbe ikpe maazi Nnamdi Kanu malitere n'ụlọikpe dị elu n'Abụja, nke Ọkaikpe James Omotosho nọ n'isi ya.
Cheta na ụbọchị Mọnde 6 Mee, 2025 gọọmenti etiti kpọrọ onye akaebe nke abụọ ha kpọrọ Mazị BBB (nke a abụghị ezigbo aha ya. E zoro aha ya maka ichekwa ya) nke gbara akaebe na ihe mgbochi.
Ihe a na-atụ anya ga-eme taa na ụlọikpe bụ na ndị ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu ga-agba ọnye akaebe gọọmenti etiti kpọtara nke na arụ ọrụ na DSS soo wee gba Nnamdi Kanu ajụjụ ọnụ mgbe anwụchịrị ya wee kpọta ya na ụlọ ọrụ DSS nọ na Abuja
Mgbe a na agba ya ajụjụ ọnụ ụbọchị Mọnde 6 Mee, 2025, n'ụlọikpe, o kwuru na oge ọ na-agba Kanu ajụjụ ọnụ, bụ nke e dekọrọ, onyeisi IPOB a kwetara na oji igwe mgbasaozi redio Biafra kpalite mmụọ ndị mmadụ imebi ihe.
Ọ gara n'ihu kwụọ na ọ bụ ya hiwere otu Eastern Security Network (ESN).
Mgbe nke a na-eme, onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi SAN jụrụ akaebe a maka na enyeghị ha akwụkwọ akaebe nke ihe niile onye DSS ahụ na-ekwu nọ
End of Soro mgbe ndị ọzọ Nnamdi Kanu gara ụlọikpe
Nnamdi Kanu: Ọkaikpe James Omotosho chụpụrụ nwunye Emmanuel Kanu n'ụlọikpe ya

Okaikpe James Omotosho enyela iwu ka ndị ọkaiwu Naịjirịa na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe wepụta ma nye ọkaiwu Nnamdi kanu ndekọ na ihe niile ha bidoro aka nwere na-ekpe ya ikpe.
Ọkaikpe James Omotosho mere ka a mata nke a n'oge ọ nụrụ ikpe Nnamdi Kanu n'Abuja dịka ndị ọkaiwu Gọọmenti etiti Naịjirịa kpọtara onye akaebe ọzọ bịara gbaa akaebe.
Ọ bụ oge onyeisi ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi gbachara onye akaebe nke mbụ na nke abụọ gọọmenti etiti kpọtara ajụjụ ọnụ ka ọkaiwu James Omotosho nyere iwu ahụ.
Omotosho yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n'ụbọchị Wenezde, Mee 7, 2025 ka ndị okaiwu Nnamdi Kanu nwee ohere gbaa onye akaebe DSS nke abụọ ahụ ajụjụ ọnụ.
Ihe mere Ọkaikpe jiri chụpụ Nwunye Emmanuel Kanu n'ụlọikpe
Ọkaikpe James Omotosho sị ka ndị ọrụ nchekwa dupụ Princess Kanu bụ Nwunye Emmanuel Kanu n'ụlọikpe ruo ụbọchị atọ a ga-ekpe ikpe ma napụkwa ya ekwenti ya.
E nwetara Princess Kanu maka ọ na-agbasa ozi n'ụlọikpe na ndụ na soshịal midịa ya.
Ọ sị na ọ kara ịtụ ya mkpọrọ mana o mere ya ebere maka na o chere na ọ bụ nwunye Nnamdi Kanu, chee na ebe di ya nọ na mkpọrọ, ọgaghị adị mma ka ụmụaka nọrọ sọọsọ ha.
Di ya bụ Emmanuel Kanu wee bilie n'ụlọikpe si na Princess Favour Kanu bụ nwuye ya. Ọkaikpe Omotosho wee si ka ndị ọrụ nchekwa dupu Princess Kanu n'ụlọikpe ma chụọ ya n'ụlọikpe ya ruo ụbọchị atọ maka na ọ dara nha ụlọikpe.

Nchịkọta ihe mere n'ikpe Nnamdi Kanu taa
Nchọkọta ihe niile mere n'ụlọikpe taa bụ na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu Gọọmenti etiti were ohere gbaa onye akaebe DSS wepụtara ajụjụ ọnụ.
N'olu bekee, ajụjụ ọnụ ahụ pụtara "cross examination and re-examination".
Nke a bụ ohere ọkaikpe ji amara ihe niile banyere onye akaebe, ihe onye akaebe maara banyere ikpe ahụ ma nyereaka ka ha kpebie ikpe n'ọdị n'ihu.
Ihe ndị ọzọ mere gunyere na:
- Gọọmenti etiti kpọtara onye akaebe DSS nke abụọ.
- Ndị ọkaiwu gọọmenti na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara onyeaka ahụ ajụjụ.
- Onye ọkaiwu gọọmenti etiti bụ Adegboyega Awomolo.
- Ndị ọkaiwu na-anọchịtaanya Nnamdi kanu gunyere Kanu Agabi, Onyechi Ikpeazu, Emeka Etiaba na ndị ọzọ
- Onye DSS nke abụọ gbara akaebe megide Nnamdi kanu arụọla ọrụ ihe ruru afọ iri abụọ na isii.
- Onye akaebe nke abụọ DSS kpọtara bụ onye gbara Nnamdi Kanu ajụjụ ọnụ n'oge e jidere ya.

Cheta na mgbe onye akaebe nke abụọ DSS kpọtara kwuchara okwu, ọkaiwu gọọmenti etiti bụ Awomolo chọrọ ka ihe o kwuru n'oge ọ gbara Nnamdi Kanu ajụjụ ọnụ nke o tinyere na dịskị bụrụ ihe a ga-eji kpee Nnamdi Kanu Ikpe, ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi kwuru na e nyeghị ha dịsk ahụ na mbụ tupuu ọkaikpe James Omotosho enye iwu ka e nye ha ihe niile e ji ekpe ikpe ahụ.
Ihe onye akaebe kwuru banyere Nnamdi Kanu oge a gbara ya ajụjụ ọnụ n'ụlọikpe

Dịka ikpe Nnamdi Kanu malitere ọzọ ụbọchị Fraịde 2 Mee, 2025 n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja, onye akaebe gọọmenti etiti kpọrọ ekwuola ihe ọ ma banyere Nnamdi Kanu na ebubo gọọmenti Naịjirịa boro ya.
Onye akaebe ahụ bụ onye ọrụ DSS, kwuru na enweghị ihe ọbụla gosiri na Nnamdi Kanu na-eyi ọha egwu oge a nwụchiri ya.
Nwaamadị ahụ bụ onye akaebe mbụ gọọmenti etiti kpọrọ, mere ka ọ doo anya na ha enwetaghị akụrụngwa ọbụla e ji eyi ọha egwu n'aka Nnamdi Kanu na onye nwaanyị ya na ya nọ aha ya bụ Maria Ibezimakor.
Nnamdi Kanu: E kpuchiri ihu ndị akaebe a kpọtara n'ikpe ya

Ikpe Nnamdi Kanu amalitela n'ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja, n'ihu Ọkaikpe James Omotosho.
Taa ka ikpe ahụ na-ebido ka ọ gachara afọ ole ma ole garaaga kemgbe Gọọmenti etiti Naịjirịa jidere Nnamdi Kanu tupuu ha akpụpụ ya ụlọikpe.
Gọọmenti etiti na-ebo Nnamdi Kanu ebubo inyi ọha egwu na-kwa i so ma bụrụkwa onye ndu otu na-azọ nwere onwe Biafra a nakpọ Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ nke gọọmenti machiri ma kpọọ ha otu na-enyi ọha egwu.
Cheta na ụbọchị 21 Maachị, 2025 ka Nnamdi Kanu gabụrụ n'ụlọikpe yọọ mgbaghara maka mba ọ bara n'ime ụlọikpe. Ọ yọrọ ọkaikpe makwa ndị ọkaịwu ya mgbaghara maka etu o si lee ha anya n'ihu.
Ha ekwughị maka beelụ ya. Ụlọikpe kwuru ka ọ gaghachị zara ọnụ ya maka ebubo asaa e boro ya n'ụlọikpe nke kachasị.

Ihe na-eme n'ụlọikpe ugbua
Ọtụtu ihe ka a na-atụ anya ga-eme n'ụlọikpe n'Abuja mana ndị megoro ugbua gunyere:
- Ụlọikpe ekwetela ka gọọmenti etiti Naịjirịa wepụta onye akaebe nzuzo. Nke a bụ arịrịọ Gọọmenti Naịjirịa rịọrọ ụlọikpe ka ndị niile ga-agbara ha akaebe gbaa ya na nzuzo ka a hara ị mara ndị ha bụ.
- N'oge ikpe ahụ bidoro ka ọkaiwu na-anọtịcha anya Nnamdi Kanu bụ Kanu Agabi gwara ụlọikpe na ndị ọkaiwu so ya dị mmadụ 22, mana Ọkaikpe James Omotosho kwuru na ya ga-anabata naanị ndị ọkaiwu mmadụ 13.
- Ọkaiwu nke gọọmenti etiti bụ Adegboyega Awolowo gwara ụlọikpe nay a entinyela akwụkwọ na mbụ na-arịọ ka ụlọikpe mee ka ndị akaebe niile gbaa akaebe na nzuzo maka ọnụdụ nchekwa ha bụ nke ụlọikpe nabatara.

Onye akaebe nzuzo nke mbụ kwuru ihe ọ maara maka Nnamdi Kanu
Onye akaebe nzuzo nke mbụ agwala ụlọikpe ọtụtụ ihe ọ maara gbasara Nnamdi Kanu na out IPOB.
Cheta na onye akaebe ahụ bụ onye ụlọikpe kwetere ka e kpuchie ya ma hara ime ka ọhanaeze mara onye ọ bụ mana ọ bụ onye ọrụ ụlọọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa a na-akpọ Department of State Services (DSS).
Ama ndị ọ gbara gunyere:
- E jidere Nnamdi Kanu nakwa otu nwaanyị n'ụlọ oriri na nkwarrị.
- Ọ sị na ọ bụ ya bụ onye ndu ndị ọrụ nchekwa nzuzo jidere Nnamdi kanu n'ụlọ oriri Golden Tulip Hotel, dị na Lagos International Airport n'Ọktoba 14, 2015.
- Ọ bụ mgbe ndị DSS mere nyocha site n'ime ụlọ banye n'ịme ụlọ niile n'ụlọ oriri na nkwarị ahụ ka ha jidere Nnamdi Kanu.
- Ha jidere Nnamdi kanu n'ime ụlọ 303 ya na nwaada aha ya bụ Maria Ibezimakor.
- Kanu ekweteghị ka e jide ya nke mere o jiri maa onye ọrụ nchekwa nzuzo aha ya bụ Bolaji isi.
- Ime ụlọ ebe ahụ Nnamdi Kanu nọ dịka ebe ọ na-agbasa ozi maka na e were ọtụtụ akụrụngwa e ji agbasa ozi dị ebe ahụ bụ nke ọ na e ji agbasa ozi.
- E jidere ya n'elekere iri na otu nkle n'ime abalị.
- DSS bukọrọ akụrụngwa mgbasaozi ndị ahụ bụ nke Nnamdi Kanu kwetere na ọ bụ nke ya.
- Onye akaebe nzuzo ahụ mechere kwuo na ha kpụgara Kanu n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha nọrọ gbaa ya ajụjụ ọnụ.
- Ọ gosikwara ụlọikpe ndekọ okwu, ajuju na ọsịsa bụ nke ha tinyere na CD ma nye ya ụlọikpe dịka ihe akaebe.
- Ụlọikpe nabatara igwe CD na-egosi ihe onyoonyo ahụ.

Ebubo ole ka e boro ya n'ikpe nke a?
N'ime ebubo niile e boro Nnamdi Kanu, lee ndị gbara ọkpụrụkpụ ị kwesiri ị mara:
- Ịgbasaozi kwuo na ndị mmadụ ga-anwụ, na ụwa ga-anọrọ jii bụ nke megidere iwu inyi ọha egwu nke Naịjirịa (Sec. 12b of terrorism act).
- Imanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ (Sit-at home order) na ikwu na a ga-egbu onye ọbụla nupuruisi n'iwu ịnọ n'ụlọ.
- Bido n'afọ 2018 ruo afọ 2021 ka ọ na-ekwu na ọ bụ onye otu IPOB ma bụrụkwa onye ndu otu ahụ bụ nke megidere iwu Naịjirịa (Sec 16 of terrorism act)
- Ịgbasa ozi ma kwuo ka ndị mmadụ jide ma gbuo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa site n'afọ 2018 ruo afọ 2021.
- Ịgbasa ozi bido n'afọ 2018 ruo afọ 2021 na-ekwu ka e gbuo ezinaụlọ ndị ọrụ nchekwa.
- Bido n'afọ 2018 ruo afọ 2021, ka ọ na-agbasa ozi gwa ndị otu IPOB ka ha na-arụpụta ogbunigwe.
- N'afọ 2015 ka o bubatara ngwa mgbasa ozi redịọ bụ nke o jiri aghụghọ sị na ọ bụ ihe nri n'oge o bubatara ya bụ nke megidere iwu Naịjirịa (Sec 47, 2a criminal code)
Etu ihe si dịrị n'ime ụlọikpe
Nnamdi Kanu emejọghị ihu ya ka ikpe si aga n'ụlọikpe. Mana ndị niile a kpọtara dịka ndị aka ebe ka ejiri ihe e ji ekpuchi ndị a na-eleta n'ụlọọgwụ kpuchie ka a ghara ịhụ ihu ha.
A na-akpọ ha otu n'otu ka ha bịa kwuo ihe ha ma maka okwu n'ụlọikpe.
Ọkaiwu nhazi ikpe nke Naịjirịa bụ Adeboyega Awomolo SAN na-ajụ ha ajụjụ ma o mecha ndị
End of Nnamdi Kanu na ihe e jiri mara ya
Nkenke nkọwa maka onye Nnamdi Kanu bụ
- Aha nne na nna mụrụ ya bụ Eze Israel Kanu na Ugoeze Nnenne Kanu. Ha bụ ndị Afara-Ukwu n'Umuahia, n'Abia steeti.
- Aha nne na nna ya nyere ya bụ Nnamdi 'Nwannekaenyi' Okwu Kanu.
- A mụrụ Nnamdi Kanu na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.
- Ọ gara Government College Umuahia, gakwa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.
- Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum Naịjirịa na Nsukka.
- O hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
- Otu Ipob na-achọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ mba Biafra.
- Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
- Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
- N'afọ 2017 ka ọ gbapụrụ ụlọnna ya n'Afara Ukwu n'ihi na ndị ọrụ nchekwa gbara egbe ebe ahụ. Nnamdi Kanu gwara BBC Igbo etu o si gbapụ ọsọ n'oge ndị nchekwa Naịjirịa n'onyoonyo.
- N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
- Ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ. Nwụnye Nnamdi Kanu bụ Uchechi Okwu Kanu, ya na ụmụ ha bi na Yurope.
- Nnamdi Kanu kwenyere na ma bụrụ onye ofufe 'Judaism'.

















