Lee etu olili ozu Cynthia Chizoba Oguzie tankị mmiri dagburu na Lekki si gaa n'Imo Steeti
A nọrọ ụbọchị Fraịde 25 Eprel lie ozu nwaada Cynthia Chizoba Oguzie tanki mmiri abụọ dagburu oge ọ na ehi ura n'ụlọ ya dị na Chevron Estate, Lekki, Legọs steeti n'ụlọ nna ya dị n'obodo Amankuta Amaike Mbieri dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli, Imo steeti.
Cheta na Cynthia gbara afọ 30 nwụrụ na Maachị 18, 2025 oge tanki mmiri dagburu ya n'ụlọ ebe o bị na Lekki,obibi ya dị na Legos steeti.

Ihe onye ezinaụlọ Cynthia Oguzie kwuru maka onwu ya
Oge BBC Igbo gbara nwanne Cynthia Oguzie aha ya bụ Obianuju Oguzie ajụjụ ọnụ, ọ gwara anyị na ọnwu nwanne ya dịka mwute
Obianuju kwuru na nwanne ya nwaanyị "nwụrụ ọnwu ike, ọ bụ ihe mberede".
Ọ gara n'ihu rịọ chukwu ka "ọnwụ erụghị eru ghara ịbịa n'ezinaụlọ ha ọzọ".
Banyere onye nwe ụlọ ahụ nwanne ya nwụrụ na ya, Obianuju kwuru na "Onye nwe ụlọ ahụ abụghị ezigbo mmadụ maka kemgbe ọdachi a mere, ọ kpọghị ezinaụlọ n'ekwenti iji mara etu ha si eme kemgbe ihe ojọọ a mere".
Obianuju katọrọ agwa onye nwe ụlọ ahụ ma kwuo na ezinaụlọ ha chọrọ ụdo.
N'aka nke ọzọ, enyi Cynthia Oguzie Njoku Chinenye kwuru n'anya mmiri juru ya anya oge ọ hụrụ na ezinaụlọ enyi na-eru uju maka ọnwụ enyi nke ọ kọwara dịka ihe mgbawa obi.
Chinenye kwara arịrị ma rịọ Olisa bi n'igwe ka ọ nabata mkpụrụ obi enyi ya nwaanyị.
Etu tankị mmiri si dagbuo otu nwaanyị na Lekki mgbe ọ na-ehi ụra

Ebe foto si, Cynthia Chizoba Oguzie/family
Ihe dị egwu mere na Lekki, Legọs steeti ebe otu nwaagbọghọ a na-akpọ Cynthia Chizoba Oguzie zutere ọnwụ mberede oge tanki mmiri abụọ si n'elu dagbuo ya.
Mkpamkpa ahụ kpara na Chevron Estate dị na Lekki, Legọs steeti n'ụbọchị Maachị 18, 2025.
Cynthia Chizoba Oguzie dị afọ iri atọ ma burụkwa onye ọchụnta ego na-agba ahịa ákwà.
Chizoba nwere ụmụaka abụọ ndị ọ hapụrụ tupu ọnwu ike ezute ya.
Ihe kachasị ewute ezinaụlọ Cynthia banyere ọnwụ ya

Ebe foto si, Cynthia Chizoba Oguzie's family / facebook
Nwanne Chizoba bụ Ifeanyi Oguzie gwara BBC Igbo na ọnwụ nwanne ya nwaanyị bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Ọ kọwaara ya dịka ihe na-agbawa obi.
Dịka o si kwuo "ihe kacha afụ anyị ụfụ n'obi bụ etu onye nwe ụlọ ebe tankị mmịrị dagburu nwanne anyị nwaanyị si akpasa ha agwa"
"Kemgbe mkpamkpa a kpara, onye nwe ụlọ ahụ enwebeghị ike ịkpọ ezinaụlọ anyị n'ekwentị maọbụ gwa anyị okwu"
"Mgbe anyị juru ese ebe onye nwe ụlọ ahụ nọ ka a gwara anyị na ọ nọ na mba ofesi".
"Onye nwe ụlọ ahụ sị na ya amaghị ka ụlọ ahụ dị kama na ọ bụ onye na-arụ ụlọ maara ihe ọ rụrụ".
Ọ sị na ọ bụ "site n'onyonyo na foto ka ọhụrụ etu esiri ruo ụlọ ahụ maka na ya nọ mba ofesi".
A napụrụ anyị nnukwu ego n'elu ozu nwanne anyị
Ifeanyi si n'ụlọọgwụ ebe ha bugara nwanne ha nwaanyị dị na Chevron Estate napụrụ ha nnukwu ego tupuu ha ekweta ka ha buru ozu nwanne ha nwaaanyị.
"Enweghị ihe ndị ụlọọgwụ ahụ mere karịa ịkwupụta na Cynthia anwụọla. Ndị ụlọọgwụ siri ọnwụ na anyị agaghị ebu ozu ya pụọ ma ọ bụrụ na anyị enyeghị ha ego ruru N250,000".
E dobela olili Cynthia n'ụbọchị Fraịde, Eprel 25 2025.
Ihe ndị uweojii kwuru
Mgbe anyị kpọrọ onye na-ekwuchitere ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin maka okwu a, o kwuru na ezinaụlọ Nwada ahụ emeghị ka ndị uweojii mara maka okwu ahụ.
BBC Igbo na-agba mbọ ịnweta okwu onye nwe ụlọ ahụ ebe tankị mmiri dagburu Cynthia Chizoba Oguzie, nakwa ụlọọgwụ bụ ndị ezinaụlọ Cynthia boro ebubo ịnapụ ha ego.









