Maduro gwara ụlọikpe na ya ka bụ Onyeisiala mba Venezuela, sị na a tọọrọ ya atọrọ

Foto gosiri mgbe a kpụtara Nicolas Maduro, nwunye ya n'ụlọikpe n'Amerịka

Ebe foto si, Screengrab/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Nicolas Maduro gwara ụlọikpe n'Amerịka na ya ka bụ Onyeisiala mba Venezuela ma kwuo na a tọọrọ ya atọrọ.

Maduro kọwara onwe ya dịka onye e jidere n'agha ma kwuo na aka ya dị ọcha n'ebubo niile Amerịka boro ya nke gunyere ire ọgwụike.

Amerịka jidere ya na nwunye ya n'ụbọchị Satọde garaaga ma kpụta ha n'ụlọikpe ebe ha ga-azara ọnụ ha.

Mgbe a kpụtara Maduro n'ụlọikpe, ndị ọrụ nchekwa gbara ya okirikiri.

Anya mmiri juru Maduro anya n'oge ọ na-ekwu na ya ka bụ Onyeisiala mba Venezuela.

A kpụpụla Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas Maduro na nwunye ya n'ụlọikpe New York

Ndị nchekwa mgbe ha kpọ Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas Maduro na nwunye ya Cilia Flores n'ụlọikpe dị na New York

Ebe foto si, Reuters

A kpụpụla Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas Maduro na nwunye ya bụ Cilia Flores n'ụlọikpe dị na New York, dịka gọọmenti Amerịka boro ya ebubo ịtụ mgbere ahịa ọgwụike nakwa ihe gbasara ngwaọgụ.

Foto na-efesa na ịntanetị gosiri Maduro na nwunye ya ebe ndị nchekwa tụrụ ha ịga n'aka ma kpọrọ ha na-aga ụlọikpe.

A na-atụ anya na Maduro na nwunye ya bụ Flores ga-azara ọnụ ha n'ebubo ndị e boro ha.

N'aka nke ọzọ, ọdeakwụkwọ ngalaba nchekwa Otu Mbaụwa 'United Nations Security Council' bụ António Guterres sị na o nwere nchegbu na "a sọpụrụghị iwu mbaụwa tupu emee ihe e mere na Venezuela".

Trump ezigala ozi ịdọ aka na ntị nye Rodríguez dịka a ga-edu n'iyi ọrụ dịka onyeisiala Venezuela

Onyeisiala Donald Trump kwuru na ọ bụrụ na Rodríguez emeghị ihe o kwesịrị ime n'ụzọ ziri ezi, ọ ga-ebute nnukwu nsogbu nye mba Venezuela.

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Donald Trump adọọla onyeisiala ọhụrụ mba Venezuela bụ Delcy Rodríguez aka na ntị ma kwuo na o nwereike ịhụta nnukwu ihe mgbu ma ọ bụrụ na o meghị ihe o kwesịrị ime n'ụzọ ziri ezi.

A ga-edu Delcy Rodríguez n'iyi ọrụ dịka onyeisiala n'ụbọchị Mọnde 5 Jenụwarị, 2026 awa ole na ole tupu a kpụpụ Nicolás Maduro bụbu onyeisiala n'ụlọikpe dị na New York.

Rodríguez arịọla Onyeisiala Trump arịrịọ ma kwuo na ndị mba Venezuela na mpaghara ya niile chọrọ udo, ezi mmekọ na ịdịnotu. O kwuru na ha achọghị agha.

Cheta na mba Amerịka wakporo isiobodo Venezuela bụ Caracas n'ụbọchị Satọde, nwụchie Maduro na nwunye ma kpọga ha mba Amerịka.

Mba Amerịka boro Maduro ebubo ibubata ọgwụike na ịtụ mgbere ngwaagha nakwa ọtụtụ mpụ ndị ọzọ mana Maduro gọnarịrị ebubo ndị a niile.

Mba Amerịka kpọchiri Nicolás Maduro na nwunye ya na Metropolitan Detention Center dị na Brooklyn

Foto Onyeisiala Trump na ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere mwakpo Amerịka mere na Venezuela ma nwụchie Maduro na nwunye ya n’ụbọchị Satọde 3 Jenụwarị, 2026 nakwa foto ebe e kechiri Maduro dịka ọ nọ n'ụgbọelu USS Iwo Jima mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images/Donald Trump/ Instagram

Akụkọ kwuru na nga Metropolitan Detention Center (MDC) dị na Brooklyn ka gọọmenti Amerịka kpọchiri Maduro na nwunye ya dịka e ji ụgbọelu bute ha n'ọdọụgbọelu ndịagha Stewart National Guard Base dị na New York.

Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Trump gosiri foto ebe e kechiri Maduro anya dịka ọ nọ n'ụgbọelu Iwo Jima USS mba Amerịka.

Ụlọ nga Metropolitan Detention Center (MDC) bụ naanị ụlọ nga gọọmenti etiti Amerịka nwere na New York ma bụrụkwa ụlọ nga e kwuru na a kpọchiri ụfọdụ ndị kpara ajọ n'Amerịka gụnyere otiegwu R Kelly, Ghislaine Maxwell nakwa Sean "Diddy" Combs.

Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Trump kwuru na mba Amerịka ga-enwere ọnọdụ ọchịchị na Venezula ruo oge ha hụrụ na enwere udo tupu ha enyefee ọchịchị n'aka ndị mba ahụ.

Cheta na mba Venezuela etinyela ọnọdụ gbatagbata dịka ha katọrọ mwakpo ahụ mba Amerịka mere ma nwụchie Onyeisiala Maduro na nwunye.

Amerịka awakpola mba Venezuela, kpụrụ Onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro na nwunye ya - Trump

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas Maduro

Ebe foto si, Getty Images / Reuters

Nkọwa foto, Trump na Maduro

Donald Trump bụ Onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ha wakporo mba Venezuela ma kpụrụ Onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro na nwunye ya.

Trump kọwara ogbunigwe ha tụrụ na mba Venezuela dịka "nnukwu mwakpo".

Dịka Trump si kwuo n'akara Truth soshal mịdịa ya "mba Amerịka emeela nnukwu mwakpo na mba Venezuela, ma kpụrụ Onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro na nwunye ya".

Trump kwuru na Amerịka kpụrụ ha abụọ si na mba Venezuela pụọ mana o kwubeghị ebe a kpụgara ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na "e mere nke a dịka iwu mba Amerịka si kwadoo".

Trump kwuru na ya ga-akọwa ihe mere na mgbe na-eteghị aka.

Gịnị ka Onyeisiala Venezuela bụ Maduro mere?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas maduro na-enwe nnukwu nghọtafe kamgbe ọnwa ole ma ole gara aga'

Nke a butere na ndịagha Amerịka iwakpo ma jide ụgbọmmiri bu ajọ ọgwụike nke ha sị n'aka mba Venevuela dị na.

Mana oteela aka mba Amerịka na-ebo Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicolas Maduro ebubo na ọ bụ onyeisi otu na-ere ọgwụike ọjọọ na mba ụwa, mana Maduro sị na ebubo e boro ya abụghị eziokwu.

Cheta na mba Ameeika adịla na mbụ kwuo na ha ga-enye onye ọbụla nyereaka ka ha jide Maduro akatamkpo ego.

N'aka nke ọzọ, Sinetọ Mike Lee bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị republikan n'Amerịka kwuru na a ga-ekpe Maduro ikpe n'Amerịka.

Mike Lee kwuru nke a ka ya na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio kwụchara okwu.

Ọ si na ya adịghị atụ anya ihe ọzọ Amerịka ga-eme mba Venezuela.

Mana etu ọnọdụ si dị ugbua, anyị na-eche ka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gwa uwa okwu ma kọwaa ihe ndị ọzọ mere ha ji mwakpo mba Venezuela.

Etu Amerịka si mwakpo mba Venezuela kpụrụ Maduro

Tupu ndị agha mba Amerịka akpụrụ Onyeisila mba Venezuela bụ Nicolas Maduro na nwunye ya bụ Cilia Flores, ọtụtụ ndị mmadụ kọwara ihe ha hụrụ.

Ha si na ogbunigwe dara na mpaghara dị iche iche n'isi obodo mba ahụ bụ Caracas n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde nakwa n'egige ndịagha ha dị icheiche na mpaghara ahụ.

Ndiagha mba Amerịka mwakporo Venezuela ma kpụrụ Maduro bụ nke a na-akpọ *Delta force", ndị ọrụ ha bụ ibu agha megide iyi ọha egwu.

Na soshal Midia ka onyonyo ebe Ogbunigwe dara nakwa ụgbọelu na-efahari n'isi obodo ahụ mana BBC amaghị na Onyonyo ndị ahụ ọ bụ eziokwu.

Mana n'ebe ndị ọzọ a tụrụ ogbunigwe bụ na steetị a na-akpọ Miranda, Aragua na La Guaira dịka gọọmenti mba Venezuela si kwuo.