A na-akpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa dịka Trump siri kwuo?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Olaronke Alo
- Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Unit
- Onye dere ya, Chiamaka Enendu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Unit
- Onye dere ya, Ijeoma Ndukwe
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eyiela egwu ọhụrụ na ọ ga-awakpo Naịjirịa ma ọ bụrụ na gọọmenti egbochighị "ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst".
N'ihe onyonyo o wepụtara n'akara soshal midia 'Truth Social ya, o kwuru na ọ ga-emeso Naịjirịa omume na-adịghị mma site n'inye ndịagha ya iwu ka ha buru egbe banye na Naịjirịa. Mana kedụ ebe ọchụchụ obi ọchịchị White House si bịa.
Kemgbe ọtụtụ ọnwa gara aga, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Washington boro ebubo ma kwuo na ndọ omekome na-akpa nkata megide ndị ụka Kraịst na Naịjirịa
Mana BBC chọpụtara na ụfọdụ ihe ha gbadoro ụkwụ ebu ebubo ndị a, bụ a na-enweghị ike ikwu ka ọ bụ eziokwu.
Nsa Septemba, onye ntaakụkọ Bill Maher gara n'ihu kpọọ ihe na-eme na Naịjirịa "genocide".
O kwuru na ndị otu Boko Haram egbuola mmadụ ruru otu narị puku (100,000) kemgbe afọ 2009 ma gbaa ụlọụka 18,000 ọkụ.
Ọnụọgụgụ ndị a bụ nke ọtụtụ mmadụ na-ekwu maka ya na soshal midia.
Mana gọọmenti Naịjirịa katọrọ ebubo ndị a ma kwuo na ọ bụghị etu ọnọdụ si dị na Naịjirịa.
Ha agọnarịghị na a na-enwe ọtụtụ nsogbu na Naịjirịa. Mana ndị ọchịchị kwuru na ndị na-eyi ọhe egwu na-egbu ndị na-anabataghị nkwenye ha - ndị alakụba, ndụ ụka Kraịst nakwa ndị ọzọ.
Otu ndị ọzọ na-atụle etu ihe si aga na Naịjirịa kwuru na ọnụọgụgụ ndị ụka Kraịst e gburu dị ntakịrị ma kwuo na ọ bụ ọtụtụ ndị okpukperechi alakụba ka e gburu.
Otu onye ọrụ nchekwa doro anya bụ Chritian Ani kwuru na ọ bụ eziokwu na e gburu ndị ụka Kraịst, mana o nweghị ike ịkọwa ka ọ bụ naanị ha ka ndị omekome ahụ bu n'obi.
Gịnị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mba Amerịka na-ekwu?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Sinetọ Texas bụ Ted Cruz, bụ onye na-ekwu okwu banyere nke a kemgbe. Ozi o dere N'Ọktoba 7 n'akara X ya, kwuru na "kemgbe afọ 2009, e gbuola ihe ruru ndị ụka Kraịst 50,000 na Naịjirịa ma kpọọ ụlọụka ruru 50,000 ọkụ ma mebikwaa ụlọakwụkwọ ụlọụka dị 2,000".
N'ozi melu o zitere BBC, ụlọọrụ ya kwuru na ọ gaghị akpọ nke a genocide dịka Maher mana o kwuru na ọ bụ "mkpagbu".
Mana Cruz boro gọọmenti ebubo ịgba nkịtị ma na-akwado ogbugbu ndị ụka Kraịst. Trump gara n'ihu kwuo na Naịjirịa bụ mba "e menyere ihere", ma kwuo na gọọmenti na-akwado ogbugbu ndị ụka Kraịst.
Gọọmenti Naịjirịa gọnarịrị ebubo a ma kwuo na ọ na-agba mbọ ibu agha megide ndị a na-eyi ọha egwu. Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti nabatara ka Amerịka bịa site n'ụzọ iwu kwadoro iji nyere Naịjirịa aka buo agha megide ndị omekome
Nke bụ eziokwu bụ na ajọ ọnọdụ bụ ihe na-echere gọọmenti Naịjirịa aka mgba - a na-enwe ọtụtụ mwakpo dị iche iche n'ụfọdụ izuụka.
Boko Haram - ndị e kwuru na ha tọọrọ ụmụakwụkwọ chibok kemgbe afọ iri gara aga, anọọla kemgbe afọ 2009 mana ọ bụ na mpaghara ugwu ka ha kacha awakpo. Ọtụtụ ndị otu na-eyi ọha egwu ndị ọzọ apụtala nke gụnyere Islamic State West Africa Province
Ọnụọgụgụ ndị ụka Kraịst mba Amerịka kwuru na e gburu bụ nke na-anwụ akpataonyi mana enwghị ike ịchọpụta ka ọ bụ eziokwu.
Kedụ ebe ọnụọgụgụ ha si?
A bịa n'ihe gbasara ọnụọgụgụ ha, Cruz gbadoro ụkwụ na nchọpụta ụlọọrụ International Society for Civil Liberties and Rule of Law (InterSociety) wepụtara na 2023 - ọ bụ ụlọọrụ kwụrụ onwe ya na-edekọ maka mmetọ ikike mmadụ na Naịjirịa. Ụlọọrụ Cruz zitere BBC ụfọdụ nchọpụta ndị ọzọ banyere nke a - nke ufọdụ n'ime ha bụ Inter Society chọpụtara ya.
Anyịzịgaara Maher ozi iji chọpụta ebe o si nweta ọnụọgụgụ nke ya mana ọ zaghachighị anyị, mana ọ dị ka ọ bụ n'InterSociety ka o si nweta nke ya maka enwechaghị ihe dị iche na ya na nke Cruz wepụtara.
Ọ bụrụ maka ndekọ ihe gbasara mmekọ mba Amerịka na Naịjirịa, nchọpụta InterSociety abụghị nke kwụrụ ọtọ.
Nchọpụta ha mere n'ọnwa Ọgọst 2025, nke nwere nchọpụta ndị ọzọ ha mere n'afọ 2025, ha kwuru na ndị na-eyi ọha egwu na Naịjirịa egbuola ihe karịrị ndị ụka Kraịst 100,000 kemgbe afọ 2009.
O kwuru ndị alakụba 60,000 nwụrụ kemgbe ahụ.
InterSociety ekwughị ebe ha si nweta ọnụọgụgụ ndị a, nke mere ka a ghara inwe ike ịma ka ihe ha kwuru ọ bụ eziokwu.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Kedụ maka ndị e gburu na 2025?
InterSociety kwuru na e gburu ndị ụka Kraịst 7,000 malite n'ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Ọgọst 2025. Ọnụọgụgụ a bụ nke onyeomeiwu Amerịka bụ Riley M Moore olu ya na-ada ụda banyere okwu n'ụlọomeiwu nta Amerịka na ọtụtụ ndị ọzọ kesara na soshal midia.
InterSociety tinyere akụkọ 70 si ụlọmgbasaozi dịka ebe ha si nweta ọnụọgụgụ nke afọ 2025. Mana ọtụtụ akụkọ ndị ahụ ekwughị ndị bụ ndị ahụ nwụrụ.
Iji maa atụ, InterSociety rụtụrụ aka n'akụkọ si Al Jazeera banyere mwakpo mere na mpaghara ugwu Naịjirịa, ma kwuo na ha kwuru na ndị Boko Haram tọọrọ ndị ọrụ ugbo 40 bụ ndị ụka Kraịst na mpaghara Damboa, Borno Steeti.
Mana Al Jazeera ekwughị ka ndị ahụ abụ "naanị ndị ụka Kraịst" dịka InterSociety si kwu.
InterSociety gwara BBC na ha mere nnyocha iji ebe ndị ahụ si mana ha akọwaghị etu ha si mee ya na nke a ma kwuo na ha maara maka ndị ụka Kraịst site n'akụkọ gbasara ndị ụka Kraịst.
Olee ndị aka ha dị n'ogbugbu ndị a?
Ndị ha gụnyere n'ọnụọgụ ndị na-akpa arụ a bụ otu ndị Alakụba gụnyere Boko Haram, nakwa ndị Fulani na-achị ehi. Ndị Fulani bụ agbụrụ ndị Alakụba kachasị mejupụta, ma bụrụkwa ndị bi na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka, a maara nke ọma maka ịchị ehi na atụrụ.
Ngụnye a gụnyere ndị ọchịehi Fulani, nke ndị InterSociety kọwara dịka ndịagha okpukperechi "jihad" n'ozi ha niile, bụ ebe ọgbaaghara siri malite na Naịjirịa gbasara etu a ga-esi kọwaa ogbugbu ndị a.
Dịka ndị ọchiehi ahụ bụ ndị okpukperechi Alakụba, ọtụtụ ndị nchọcha na ngalaba a ajụla ịnabata ya dịka agha okpukperechi, ma kwuo na ihe na-ebute ya oge ụfọdụ bụ ịchọ ohere maka ala na mmiri.
Ọgbaaghara adapụtala n'etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị Alakụba nakwa ndị na-eso ụzọ Kraịst gburugburu Naịjirịa.
Onye nkọwa okwu nchekwa bụ Maazị Ani siri arụmarụ kwuo na "ịsị na ha bụ ndị agha okpukperechi jihad bụ ikwubiga okwu oke. O nweghị ihe ọbụla jikọtara ya na nke ahụ. Ọ bụ nke kachasị metụta ndị omekome na ndị ekperima."
Confidence McHarry bụ nnukwu onye nkọwa okwu nchekwa n'ụlọọrụ mkpọtụrụ na-ahụ maka Afrịka bụ SBM Intelligence kwuru na oge ụfọdụ, ọgbaaghara ndị ahụ na-abụ n'ihi nsogbu agbụrụ na ịzọ akụnaụba.
InterSociety kwukwara ihe a maara na Naịjirịa dịka ndị ojiegbe, ma kwuo na ha na-abụkarị ndị agbụrụ Fulani na mpaghara north-west, bụ ndị tinyere aka na ntọrị, ma bụrụkwa ndị a ma ama maka igbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na ndị Alakụba.

Ebe foto si, Reuters
Gịnị ka otu nchọcha ndị ọzọ kwuru?
Ọnụọgụ nke otu InterSociety wepụtara dị ezigbo elu karịa ozi ndị ọzọ e nwetara gbasara ọnụọgụ ndị na-eso ụzọ Kraịst e gburu na Naịjirịa.
Otu na-enyocha ọnọdụ ọgbaaghara nke ọma n'ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Acled ewepụtala ọnụọgụ dị iche. Ọ dị mfe inweta ma nyochaa ebe ha bipụtara nchọpụta ha.
Nnukwu onye nkọwa ha bụ Ladd Serwat etinyeghị ọnụ na ozi otu InterSociety kama ha gwara BBC na ọnụọgụ mmadụ 100,000 nwụrụ anwụ a na-ebugharị na soshal midịa ga-agụnye omume niile metụtara ọgbaaghara ntuliaka na Naịjirịa, nke mere na ọ gaghị abụ eziokwu ịsị na ihe a bụ ọnụọgụ ndị na-eso ụzọ Kraịst e gburu kemgbe afọ 2009.
Acled chọpụtara na ọ bụ ihe erughị mmadụ 53,000 gụnyere ndị Alakụba na ndị na-eso ụzọ Kraịst ka e gburu kemgbe afọ 2009 site n'ọgbaaghara ndọrọndọrọ ọchịchị.
ọ bụrụ na e lekwasị anya site n'afọ 2020 ruo n'ọnwa Septemba 2025, Acled kwuru na ihe ruru ndị nkịtị 21,000 ka e gburu site na ntọrị, mwakpo na ndakpo nakwa site n'iji ihe ndị na-agba agba.
Ọ chọpụtara ọnọdụ 384 ebe e lekwasara ndị na-eso ụzọ Kraịst anya site n'afọ 2020 ruo n'ọnwa Septemba 2025, nke e jiri gbuo mmadụ 317, nke pụtara na ha nọchitere anya obere mmadụ ndị e gburu egbu.
Ebe Aled siri nweta ozi ya bụ soshal midịa, ebe e nwere ike inyocha ozi niile, otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ nakwa ndị na-agbakọọrọ ha aka n'obodo.
Kedụ maka ọnụọgụ Trump wepụtara?
N'ozi o bipụtara n'ọbaozi Truth Social n'ụbọchị Fraịde 31 Ọktoba 2025, Trump sịrị na egbuola ndị nke Kraịst 3,100. Ọ na-arụtụ aka n'ozi ụlọọrụ Open Doors wepụtara maka ọnwụ ndị ahụ n'ime otu afọ, malite n'ọnwa Ọktoba 2023, ka onye na-arụ na White House kwuru.
Open Doors bụ ụlọọrụ enyemaka na-eme nnchọcha gbasara mkpagbu ndị nke Kraịst n'ụwa niile.
N'ozi ahụ, ha kwuru na e gburu ndị nke Kraịst 3,100 ma gbuokwa ndị Alakụba 2,320 n'ime ọnwa iri na abụọ ahụ.
Open Doors gbakwunyekwara ihe ha kpọrọ "Otu ndị Fulani na-eyi ndụ egwu" n'ọnụọgụ ndị na-akpa arụ, ma kwuo na ha maara maka ihe ruru ọkara atọ n'ime ndị na-eso ụzọ Kraịst e gburu n'ime ọnwa iri na abụọ ahụ.
Nnukwu onye nchọcha n'ụlọọrụ Open Doors bụ Frans Veerman sịrị "ihe anyị na-ahụ ugbua bụ na a ka na-elekwasị ndị nke Kraịst anya maka mkpagbu, mana ọnụọgụ ndị Alakụba rịrị elu ka ndịagha nnupuisi Fulani na-alakwasịkwa anya.
Ndị nkọwa okwu sịrị na e meela ọtụtụ mwakpo ọjọọ n'ụlọ okpukperechi ndị Alakụba nakwa n'obodo ha na mpaghara north-west nke Naịjirịa.
"Mmadụ nwereike ịsị na nke a bụ akụkụ enweghị nchekwa," ka Maazị McHarry kwuru. "Ihe mere ahụtaghị ya dịka ihe metụtara okpukperechi bụ maka na ndị na-eme mwakpo ahụ megide ndị Alakụba bụkwa ndị Alakụba n'onwe ha."








