Nnamdi Kanu arịọla ka ụlọikpe kpọgaa ya n'ụlọmkpọrọ dị n'Abuja

Ebe foto si, BBC, Getty Images
Dịka a machara ya ikpe n'ubọchị 20 Nọvemba, 2025 ma tụọ ya nga n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto, onyendu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu arịọla ụlọikpe ka ha were ikike ha kpọgaa ya n'ụlọmkpọrọ dị n'Abuja maọbụ Nasarawa.
Kanụ rịọrọ arịrịọ a site n'ọnụ onye nnọchiteanya ya bụ Demdoo Asian, nke otu Legal Aid Council.
Demdoo gwara ụlọikpe ka ha nye Gọọmenti Naịjirịa nakwa ụlọọrụ Nigerian Correctional Service iwu, nke ga-amanye ha ịkpọga Nnamdi Kanu n'ụlọmkpọrọ ọbụla dị nso n'ụlọikpe ahụ.
Ọ rịọrọ ka a kpọgaa Kanu n'ụlọmkpọrọ ọbụla dị nso dịka nke nọ na Suleja, iji nyere ya aka mezuo ihe niile a chọrọ maka mkpegharị ikpe ya.
Ka o sinadị, Ọkaikpe James Omotosho gwara Demdoo sị ya mee ka Gọọmenti Naịjirịa na ụlọọrụ Nigerian Correctional Service mata gbasara nke a n'ihi na ha nọ n'ụlọikpe oge a chabiri ikpe.
N'ihi nke a, Demdoo jiri ọnụ nkịtị rịọ ụlọikpe ka ha mee ka ndị okwu ahụ metụtara mara maka ya.
Ọkaikpe Omotosho nabatara arịrịọ ahụ ma kwupụta 27 Jenụwarị, 2026 dịka ụbọchị ọzọ a ga-elebara okwu ahụ anya.
DSS gwara anyị na a kpọgaala Nnamdi kanu n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto - Nnaemeka Ejiofor

Ebe foto si, Maxwell Opara/Facebook
Otu n'ime ndị Ọkaiwu Nnamdi kanu bụ Nnaemeka Ejiofor ekwuola na ọ bụ eziokwu na a kpọrọla Nnamdi Kanu gaa n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti.
Ejiofor kwuru na ndị ọrụ DSS mere ka ọ mata nke a oge ya na ndị otu ya gụnyere Ọkaiwu Maxwell Opara na Ijeoma Ifedinobi gara n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja.
Ọ gbarụrụ ihu kwuo na ọnọdụ a ga-ebute mkpọbiụkwụ maka akwụkwọ mkpegharị ikpe Nnamdi Kanu na-achọ ịgba n'ụlọikpe.
Ọ kpọkuru ndị ọ dị n'aka ka ha kpọghachite Nnamdi Kanu n'Abuja maọbụ ebe ọzọ ga-adịrị ha mfe ịnọrọ hazie ihe niile maka mkpegharị ikpe ya, tinyekwara ebe nwere ezi nchekwa.
"Ihe ịmaaka anyị nwere ugbua bụ na Nnamdi Kanu agaghị enwekwa ike ịgba ụfọdụ akwụkwọ ndị ọ chọrọ ịgba n'Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja," ka Ejiofor kwuru.
Ka o sina dị, o kwuru na ndị DSS kwere ya nkwa na ụlọmkpọrọ ebe a kpọgara Nnamdi Kanu nwere ezigbo nchekwa.
Ọkaiwu Maxwell Opara gosiri olileanya na akwụkwọ mkpegharị ikpe Nnamdi Kanụ ga-ezu oke n'izuụka na-abịa abịa maka iwepụ ya n'ụlọikpe.
A kpọrọla Nnamdi Kanu gawa n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti - Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/X
A kpọgaala onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti.
N'ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor bipụtara n'akara ọbaozi X ya, ọ sịrị: "ugbua ka e si n'ụlọọrụ DSS dị n'Abuja kpọrọ Nnamdi Kanu gawa n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti, ebe na-agaghị adịrị ndị Ọkaiwu ya, ezinaụlọ ya, na ndị nke ya nso."
N'otu aka ahụ, nwanne Nnamdi Kanu bụ Kanunta Kanu boro ebubo na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu nyere iwu ka a kpọgaa onyendu Ipob na mpaghara ugwu.
Kanunta dere n'akara ọbaozi X ya sị: "A kpọgaala Nnamdi Kanu n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti".
"Tinubu nyere iwu ka a kpọgaa Nnamdi Kanu na mpaghara ugwu, ebe isi ụlọọrụ otu Boko Haram na ISWAP."
Ọnọdụ a na-abịa n'ime otu mkpụrụ ụbọchị Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja machara Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ọha egwu gọọmenti boro ya, ma tụọ ya mkpọrọ ọka.
Ọkaiwu na-anọchịtaanya gọọmenti Naịjirịa sị ka a maa Nnamdi Kanu ikpe ọnwụ

Ọkaiwu na-anọchịtaanya gọọmenti Naịjirịa n'ikpe Nnamdi Kanu bụ Adegboyega Awomolo agwala ụlọikpe ka a maa Nnamdi Kanu ikpe ọnwụ.
Awomolo na-ekwu nke a dịka ọkaikpe James Omotosho machara Nnamdi Kanu ikpe n'ebubo asaa e boro ya nke gbadoro ụkwụ n'inyi ọha egwu ma gbado ụkwụ n'iwu megidere iyi ọha egwu bụ 'Terrorism Prevention (Amendment) Act, 2013'.
Awomolo gwara ụlọikpe na iwu ahụ kwuru na ọ bụ ọnwụ bụ ntarama ahụhụ dịrị onye ọbụla a mara ikpe iyi ọha egwu.
N'okwu ya "dịka a magoro Nnamdi Kanu Ikpe, enweghịzị ihe ọzọ na-abụghị inye ya ntaramaahụhụ".
"Ahụhụ dịrị onye a mara ikpe n'ebubo nke mbụ, abụọ, anọ, ise na isii dịka ngalaba 12H nke iwu megudere inyi ọha egwu nke afọ 2013 bụ ọnwụ".
"Eji m obi m niile na-ekwu na ụlọikpe enweghị ihe ọzọ ha kwesiri ime maka nke. Naanị ọnwụ bụ ntaramaahụhụ dịrị onye a mara ikpe n'ebubo ndị ahụ maka n'iwu nyere gị ikike ka inye ntarama ahụhụ a, anyị na-atụanya na ị ga-eme ihe iwu kwuru".
Nnamdi Kanu: Ọkaikpe Omotosho akwụsịtụla ikpe ya ma kwuo na a ga-alaghachite inye ya ntaramaahụhụ ya

Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja amaala Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ikpe n'ebubo asaa gọọmenti etiti Naịjirịa boro ya.
Ebubo ndị ahụ gụnyere ebubo iyi ọha egwu, ịkpalite ndị mmadụ ka ha gbuo ndị uweojii, isonye n'otu Ipob nke gọọmenti kwuru na ha bụ otu na-eyi ọha egwu, ịgwa ndị otu Ipob ka ha rụọ ogbunigwe, ịkpalite ndị mmadụ ka ha gbuo ndị uweojii, ezinaụlọ ma mụnye ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa ọbụla ha hụrụ ọkụ, ibubata igwe mgabsaozi transmita ma kwuo na ọ bụ ihe e ji ebi n'ụlọ nakwa ịgbasaozi na-eyi ọha egwu.
Ọkaikpe Omotosho kwuru nke a n'ubochi Tozde 20 Nọvemba, 2025 dika o nyere mkpebi ya n'ikpe ebubo gọọmenti Naịjirịa boro Nnamdi Kanu.
Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Omotosho akwụsịtụla ikpe ahụ ma kwuo na ọ ga-alaghachita ma kwuputa ntaramahụahụ ọ ga-enye Nnamdi Kanu.
Gịnị mere n'ụlọikpe taa?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ụlọikpe malitere taa bụ Tọzde 20, Nọvemba, 2025, Ọkaikpe James Omotosho nyere Nnamdi Kanu na ọkaiwu gọọmenti etiti ohere ka ha gwa ụlọikpe okwu tupu ọ malite inye mkpebi ya n'akwụkwọ arịrịọ ụfọdụ e chere ya n'ihu.
Banyere arịrịọ ntohapụ beelu ọ rịọrọ, Ọkaikpe Omotosho kagburu ya. O kwuru na e nwere ụzọ beelu abụọ nke bekee kpọrọ Bail pending outcome of trial na Bail to set free.
Ọkaikpe Omotosho kwuru na Nnamdi Kanu ekwughị ụdịrị beelu nke ọ chọrọ ka ulọikpe ahụ nue ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọjụjụ Nnamdi Kanu jụrụ ịzara ọnụ ya n'agbanyeghị ọtụtụ ohere e nyere, bụ nke gosiri ụlọikpe ahụ na Nnamdi Kanu nabatara ebubo ndị ahụ gọọmenti etiti boro.
Ọ bụ ngwangwa nke a mere ka Nnamdi Kanu malitere ịbara Ọkaikpe Omotosho mba nke mere ka Ọkaikpe nye iwu ka ndị ọrụ nchekwa wepụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Ọkaikpe Omotosho kwuru na iwu kwadoro ya ịga n'ihu kpebie ikpe ahụ n'agbanyeghị na e wepụrụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Ọkaikpe Jame Omotosho kwuru na o nyere Nnamdi Kanu ohere ọtụtụ ugboro ka ọ zara ọnụ ya mana o kweghị n'agbanyeghị arịrọ ọ rịọrọ ya.
Ụlọikpe kwuru na oge mbụ, na iwu e ji ekpe Nnamdi Kanu ikpe bụ iwu a kpọrọ Terrorism Prevention and Prohibition Act 2013. Ọkaikpe Omotosho mere ka o doo any ana mpaghara 30 iwu ahụ nyere ụlọikpe Ukwu Etiti ikike ikpe ya ikpe.
Kedụ ka ikpe ya si malite?
Ikpe Nnamdi Kanu bụ ikpe ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe ebubo iyi ọha egwu gọọmenti etiti Naịjirịa boro ya ọtụtụ afọ.
Oge mbụ a nwụchiri Nnamdi Kanu bụ n'afọ 2015 maka ebubo iyi ọha egwu na ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị, mana kemgbe ahụ, ọtụtụ ihe pụtara n'ikpe ya.
N'afọ 2017, Kanu gbapụrụ na Naịjirịa oge ụlọikpe nyere ya ntọhapụ beelu. Nke na-abịa dịka ndịagha 'Operation Python Dance' wuchiri n'ụlọ ya n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Na Juun 2021, a nwụchiri ya n amba Kenya ma kpọlata ya Naịjirịa mana ndị ọkaiwu ya kọwara nke a dịka megidere iwu.
Ngwangwa a kpọlatara ya na Naịjirịa, ndị ọkaiwu ya katọrọ ikpe a na-akpe ya n'ụlọikpe. Ha kwuru na ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu bụ nke megidere iwu Naịjirịa ya ma kwuo na e metọrọ ikike ya dịka nwaafọ Naịjirịa.
Ọkaikpe ewepụla Nnamdi Kanu n'ụlọikpe maka agwa ya n'ụlọikpe

Ọkaikpe amalitela inye ikpe ka e wepụrụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Ọkaikpe James Omotosho kwuru na Nnamdi Kanu kpara agwa megidere iwu ụlọikpe ahụ ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha wepụ Nnamdị Kanu n'ime ụlọikpe ahụ.
Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Omotosho na-aga n'ihu n'ikpe ahụ n'agbanyeghị na Nnamdi Kanu anọghị n'ime ụlọikpe.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe Ukwu Etiti Naịjirịa dị n'Abuja kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde Nọvemba 20, 2025 ka ọ ga-enye mkpebi n'akwụkwọ nke Gọọmentị Etiti gbara onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Gọọmentị Etiti nwuchiri Kanu na Kenya n'ọnwa Juun afọ Juun 2021, kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iyi ọha egwu na ikpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
A na-atụ anya na ọkaikpe James Omotosho nwere ike ịma ya ikpe dịka Kanu jụrụ ịzara ọnụ ya oge e nyere ya ohere ka ọ zara ọnụ ya ma jụọ ọkaikpe ka ọ gwa ya iwu ọ gbadoro ụkwụ ekpe ya ikpe .
Nke ọzọ bụ na Ọkaikpe nwere ike ịgbado ụkwụ na mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyeburu n'ọnwa Ọktoba afọ 2022 nke kwuru na ikpe amaghị Kanu.
Nke atọ bụ na Ọkaikpe Omotosho nwekwara ike iyigharị maka ụbọchị ọzọ n'ọdịnihu.
Ndị ọrụ nchekwa ebidola igosi ike ha n'Aba, Abia steeti
Dịka ikpe Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra na-aga n'ihu n'Abuja taa, ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa ebidola ime ngosi ike ha n'Aba nakwa Unuahia dị n'Abia steeti.
Ndị uweojii gbara ụlọ nna Nnamdi Kanu gburu gburu, ebe ọtụtụ nyi uwe nkịtị ndị ọzọ nyi uwe ndị uweojii.
Ndị ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Abia steeti kwuru na ha hụrụ na ndị ọrụ nchekwa kwụrụ chimchim na-echekwa ụlọọrụ ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na steeti ahụ.
Ha sị na e chekwara Operation Base (FOB) nke 144 Battalion dị nso n'ebe nkwụsị ụgbọala a na-akpọ Osisioma.
Onye ntaakụkọ anyị na-ekwu na ndị uweojii na steeti ahụ bidoro igosi ike n'Aba.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọghị ka a mara onye ha bụ kwuru na ha kwụsịrị ebe ha na-aga maka na ha amaghị etu ikpe Nnamdi Kanu ga-esi gaa nakwa ihe nwereike ime.
Mana mgbe a na-adepụta akụkọ a enweghị ọgbaaghara ebe niile ka juru onyi na-enghị nsogbu.
Nnamdi Kanu akpụpụla ndị akaebe gbara ama megide ya n'ụlọikpe

Ebe foto si, @AloyEjimakor/X
Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe megide ndị gbara ama megide ya n'ụlọikpe.
Nke a dị n'ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor bipụtara n'ọbaozi X ya n'ụbọchị Tuzde 18 Nọvemba, 2025.
Ozi ahụ Ejimakor wepụtara kwuru na Kanu boro mmadụ abụọ ahụ ebubo ịgba ama ụgha oge ha ṅụchara iyi.
"Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ megide ndị akaebe abụọ gbara ama megide ya oge a na-ekpe ya ikpe, maka na ha jiri obi ha gbaa ama ụgha oge ha ṅụchara iyi," ka ozi ahụ kwuru.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke Ọkaikpe James Omotosho nọ n'isi ya na-akwado ikwupụta ikpe ha n'ụbọchị Tọzde 20 Nọvemba 2025, gbasara ebubo iyi ndụ egwu na ịgba ọchịchị mgba okpuru nke Gọọmenti Naịjirịa boro Nnamdi Kanu.
Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu akpọkuola Onyeisiala Tinubu ka a kwụsị ikpe Nnamdi Kanu

Ụfọdụ ndị omeiwu Naịjirịa nọ n'okpuru otu 'Parliamentary Action Group in Defense of Justice and Democracy', akpọkuola Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ka o nye nnukwu ọkaikpe Naịjirịa iwu ka ọ kwụsị ikpe Mazi Nnamdi Kanu nke na-aga n'ihu kemgbe ọtụtụ afọ.
Akwụkwọozi ndị omeiwu ahụ wepụtara kpọkwara oku ka e nwee mkparịtaụka iji chọpụta usoro ka mma iji dozie ikpe Nnamdi Kanu.
Ha kwuru na ọ bụrụ na a tọhapụ Nnamdi Kanu, ọ ga-enyere aka belata ajọ ọnọdụ nchekwa nakwa ụfọdụ nsogbu a na-enwe n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Ụfọdụ ndị omeiwu binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ gụnyere Ikenga Ugochinyere, Amobi Godwin Ogah, Anthony Adebayo Adepoju, Emeka Idu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
Cheta na Ọkaikpe James Omotosho kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde 20 Nọvemba, 2025 ka ọ ga-enye mkpebi ya n'ebubo gọọmenti etiti Naịjirịa boro ya nke gunyere iyi ọha egwu nakwa ịkpa nkata ikwatu gọomenti. Nke a na-abịa dịka ohere ụlọikpe nyere Kanu ka ọ zara ọnụ ya gara.
Nnamdi Kanu kwuru na ihe mere o ji ghara ịzara ọnụ ya n'ikpe ahụ bụ maka na ụlọikpe egosighị ya iwu ha gbadoro ukwu iji maa ya ikpe.
Nnamdi Kanu agbaala NMA akwụkwọ ego ya dị N50bn maka ebubo metụtara mpụtara nnyocha ahụike ya

Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agbaala otu jikọrọ ndị dọkịta na Naijiria bụ Nigeria Medical Association (NMA) akwụkwọ maka ebubo na ha nyere ụlọikpe akwụkwọ mpụtara nnyocha ahuike adịgboroja n'isi ya.
N'akwụkwọ nke ọ gbara n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, Kanu chọrọ ka ụlọikpe nye NMA iwu ime ya nnyocha ọhụrụ nke ndi ọkammụta ahụike enweghi aka n'ikpe ya n'ụlọikpe no n'isi ya.
N'akwụkwọ ikpe ahụ bu akara CV/4584/25, nke ọkaiwu Maxwell Opara mere ka o rute BBC Igbo aka, Kanu boro NMA ebubo 'ịkpụ mpụtara adigboroja' nakwa igbochi ikpe kwụrụ ọtọ.
Cheta na n'abalị 23 ọnwa Septemba afọ 2025, NMA nyeburu ụlọikpe mpụtara nnyocha ha mere nke Ọkaikpe James Omotosho gbadoro ụkwụ were kwuo na ahụ siri Kanu ike ịzara ọnụ ya n'ikpe a na-ekpe ya maka ebubo meụtara iyi ọha egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.
Gọọmenti Naịjirịa ji iwu na-anaghịzi arụ ọrụ ekpe Nnamdi Kanu ikpe - Mazi Nnamdi Kanu Global Defence Consortium

Ebe foto si, @MaziKanuntaKanu
Onyeisi otu na-ekwuchitere Nnamdi Kanu n'ụwa (Mazi Nnamdi Kanu Global Defence Consortium) bụ Onyedikachi Ifedi ekwuola na e ji iwu na-anaghịzi arụ orụ ekpe onye ndu Ipob ikpe.
Nke a dị n'ozi e bipụtara n'akara ọbaozi nwanne Nnamdi Kanu bụ Kanunta Kanu n'ụbọchị Sọnde 16 Nọvemba 2025, nke isiokwu ya bụ "Ịdọ aka na ntị doro anya gbasara ihe ọjọọ dị n'ikpe Nnamdi Kanu."
Ifedi kwuru na ndị otu ya wepụtara ozi ahụ iji mee ka ọhanaeze na mbaụwa mara gbasara ebe ikpe Nnamdi Kanu chewere ihu n'okpuru Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja.
O kwuru na ihe a na-eme Nnamdi Kanu bụ nke na-ezighị ezi, nke na-adịghị n'iwu nakwa nke na-adịghị mma maka ikpe ziri ezi na Naịjirịa n'ọdịnihu.
"Gọọmenti Naịjirịa na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe site n'ịgbakwasị ụkwụ n'iwu e ji egbochi iyi ndụ egwu (e megharịrị emegharị) nke afọ 2013. Mana a kagburu iwu ahụ kpamkpam oge e webatara iwu e ji egbochi ma kwụsị iyi ndụ egwu n'afọ 2022".
"Iwu a kagburu akagbu bụ iwu nwụrụ anwụ. E nweghị ike iji iwu na-adịghị adị kpee maọbụ maa mmadụ ikpe," ka ozi ahụ kwuru.
Ifedi bokwara ebubo na Ọkaikpe Omotosho gwara Nnamdi Kanu ugboro ugboro na ya agaghị anụrụ okwu ọbụla ga-agba ụkwụ megide iwu ahụ.
Ọ rịọrọ otu jikọtara ndị Ọkaiwu na Naịjirịa, otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ, ndị mgbasaozi na ndị nlereanya mbaụwa ka ha saa anya ha mmiri iji hụ ihe na-eme.
Nnamdi Kanu ewepụla okwu ya n'Ụlọikpe Mkpegharị
Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agaala Ụlọikpe Mkpegharị maka mkpebi Ọkaikpe James Omotosho nwere gbasara ikpe ya.
Ọ bụ nwanne Nnamdi Kanu nke nta bụ Kanunta Kanu kwupụtara nke a n'ozi o bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Wenezde 12 Nọvemba 2025.
Kanunta kwuru na Nnamdi Kanu gawara Ụlọikpe Mkpegharị n'ihi ọjụjụ Ọkaikpe Omotosho jụrụ ileba anya n'okpụrụkpụ okwu ndị e chere ya n'ihu.
Na nzaghachi nke ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor nyere BBC News Igbo banyere ma nke a abụ eziokwu, ka Ejimakor kwuru na Nnamdi Kanu degara ụlọikpe mkpegharị akwụkwọ mkpesa ka o gbochie Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ikpebi ikpe ya n'ụbọchị Tọzde abalị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba, 2025.
O kwukwara na Nnamdi Kanu degara akwụkwọ mkpesa ahụ n'ihi na Ọkaikpe Omotosho ekweghị ilebanye anya n'okpụrụkpụ okwu ndị e chere ya n'ihu.
Cheta na Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja kwuru na Nnamdi Kanu agaghị enwekwa ohere ịzara ọnụ ya n'ebubo iyi ndụ egwu Gọọmenti Naịjirịa boro ya.
O nwere mkpebi a dịka ụlọikpe ahụ nyechara Nnamdi Kanu abalị asaa iji zara ọnụ ya n'ebubo Gọọmenti Naịjirịa boro ya, nke metụtara ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa nakwa iyi ndụ egwu.
"Ịga n'ihu n'ikpe ahụ dabere n'iwu a kagburu n'afọ 2013 pụtara mmetọ usoro iwu, mmetọ iwu obodo na erubeghị isi n'usoro mbaụwa si ekpe ikpe ndị omekome," ka Kanunta dere.

Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ekpebiela na onye ndu otu nnwereonwe Bịafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu etufuela ohere e nyere ya izara ọnụ ya.
Ụlọikpe ahụ nyeburu Nnamdi Kanu abalị asaa iji zara ọnụ ya n'ebubo e bogara ya nke metụtara ịkpa nkata ịkwatu gọomentị Naijiria nakwa ịyi ndụ egwu.
Mana dịka oge ikpe ruru, Nnamdi Kanu jụrụ ịzọrọ onwe ya, kama ọ jụwara ọkaikpe iwu ọ guzoro n'elu ya ekpe ya ikpe.
Ọkaikpe Jọstis Omotosho kwuru na o lufuele ohere ahụ ma gaa n'ihu tinye ikpe Nọvemba 20, 2025 ka ọ bụrụ ụbọchị ọ ga-enye ikpe Nnamdi Kanu gbasara ebubo gọọmeti etiti boro ya nke gunyere iyi ọha egwu nakwa ị kpa nkata ikwatu gọomenti.
Nke a na-abịa dịka Nnamdi Kanu gwara ọkaikpe na ọ gaghị amalite ịzara ọnụ ya bụrụ na ụlọikpe egosighị ya ebe ha gbadoro ukwu iji maa ya ikpe.
Ọkaikpe yọrọ Kanu ka ọ zara ọnụ ya ma kọwara ya na ọnọghị ya n'aka ị gwa ya ebe ụlọikpe gbakwasịrị ukwu iji maa ya ikpe.
James Omotosho gwara Kanu na ọ ga-aza ajụjụ ya na mkpesa ya niile kemgbe ikpe izara ọnụ ya bidoro ma onye wa ikpe ya.
Mana Kanu gara n'ihu jụụ na ọgaghị azara ọnụ ya. Ọkaikpe Omotosho gwara Kanu n'ụbọchị taa bụ Fraịde bụ ikpeazu o nyere ya iji zara ọnụ ya nke bụ na ụlọikpe ga-ewere na ọ wepụla ikike izara ọnụ ya.
Cheta na tupu ikpe amalite ọfụma n'ụbọchi taa, Kanu gwara ọkaikpe na ọ chọrọ itinye usoro ọhụrụ maka ikpe ya.
Usoro ọhụrụ Kanu tinyere nke agụpụtara n'ụlọikpe nwere arịrịọ atọ ọ chọrọ ka ụlọikpe meere ya nke gunyere
otu, ọ chọrọ ka ụlọikpe wepụ 'ikpe amaghịm" nke bekee kpọrọ 'not guilty plea' nke o tinyere n'ọnwa Maachị afọ 2025 dịka ọ kọwara na e nwetara ya n'ụzọ aghụghọ nke iwu na-akwadoghị.
Nke abụọ, Kanu chọrọ ka ụlọikpe wepụ iwu niile ha tinyere gbasara ikpe ya nakwa etu ikpe ya si aga n'ụlọikpe.
Nke atọ, Nnamdi Kanu chọkwara ka ụlọikpe tọhapụ ya ozugbo.

Ikpe Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu taa bụ Fraịde 7 Nọvemba, 2025. Lee ụfọdụ ihe ndị a na-atụ anya ga-eme n'ụlọikpe.
Dịka Ọkaipke James Omotosho gwara Nnamdi Kanu n'ụbọchị nke ikpeazu ọ bịara ụlọikpe ka ọmalite izara ọnụ n'ụbọchị taa bụ Fraịde 7 Nọvemba, 2025.
Ya bụrụ na ọmaliteghị izara ọnụ ya, ụlọikpe ga-ewere ya na o mechiela ikpe ya ma gbado ukwu n'akaebe ndị kpọtara ya ụlọikpe gosiri jiri maa ya ikpe.
Cheta na Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-amalite izara ọnụ ya ma ọ bụrụ n'ụlọikpe gosi ya iwu kwadoro nakwa ebe ha gbakwasịrị ukwu ikpe ya ikpe.

Ebe foto si, BBC/Aloyejimakor/Facebook
Mazi Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nke gọọmenti Naịjirịa machiri edeela akwụkwọ ozi zigara Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump.
N'akwụkọ ozi ahụ, Nnamdi Kanu kọwara etu ikpe ya si bido, ọnọdụ nchekwa na ndịda ọwụwa anyanwụ.
Kanu jikwara ohere ahụ kwuo ọtụtụ ihe megoro n'etiti ya na gọọmenti Naịjirịa kamgbe o bidoro ịzọ nwere onwe Biafra.
Ọ gwara Onyeisiala Trump ka "e mee nnyocha banyere ndị e gburu na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na ihe ndị ọzọ".
Ebubo Nnamdi Kanu boro ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa

Ebe foto si, BBC/Aloy Ejimakor/Facebook
N'akwụkwọ ahụ Nnamdi Kanu degara Donald Trump ka o kwuru na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa agbaala mbọ igbu ya ugboro anọ.
Kanu kwuru na ọnọdụ igbu ndị mmadụ na Naịjirịa na-eme na Benue, Kogi na mpaghara ugwu awụsa bụ ndị na-enyi ọha egwu, mana ihe na-eme na ndịda ọwụwa anyanwụ dị iche.
Ọ kọwara na ndịda ọwụwa anyanwụ, ndị ọrụ nchekwa bụ ihe kacha egbu ndị mmadụ, nwere asị kpuchie arụ ha kpara ma taa ndị ha gburu ụta.
O dere ugboro ole ma ole ndị ọrụ nchekwa gburu ndị ọ kpọrọ "Judeo-Christians" na Naịjirịa ma dee ụbọchị o mere dịka:
- Ụbọchị ncheta Biafra e mere na Nkpor - Mee 30, 2016.
- Ndị e gburu na National High School Aba - Febuwarị 9, 2016
- Ndị nwụrụ n'Operation Python Dance 2 - Seputemba 12 - 14, 2017
- Ndị e gburu n'Obigbo, Port Harcourt - Oktoba, 2020
N'ime ụbọchị a niile, Nnamdi Kanu tinyere ihe akaebe nke gunyere ndekọ UN Spacial Rapporteur Agnes Callamard, UN Callamard Report, Amnesty International, na ndekọ ndị ọzọ.
Ụlọikpe agwala Nnamdi Kanu ụbọchị ịkpeazụ o nwere ịmalite ịzara ọnụ ya

Nnamdi Kanu agwala Ọkaikpe James Kolawole Omotosho nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na "a ghọgburu ya oge ọ rịọrọ arịrịọ n'ebubo na-adịghị adị".
Nnamdị Kanu onye kwuru nke oge ọ nwụchiri n'ụlọikpe ahụ n'ụbọchị Wenezde 5 Nọvemba, 2025 dịka ikpe ya na-aga n'ihu, gara n'ihu mee ka o doo anya na nghọgbu ahụ bụ nke metọrọ ikike ya dịka nwaafọ Naịjirịa.
O kwuru na ya ga-azara ọnụ mana tupu o mee nke a, ọ chọrọ ịma ebubo e boro ya nakwa iwu kwadoro ebubo ahụ.
Mana Ọkaikpe Omotosho nyere Nnamdi Kanu ndụmọọdụ banyere etu o si eso ikpe ya.
N'okwu ya "Ọ dị mma ka ị chọọ ọkaiwu maara ihe ekwe na-akụ banyere ikpe mpụ ka ọ nọchiteanya gị n'ikpe a."
N'agbanyeghị na ọkaiwu gọọmenti Naịjirịa bụ Adegboyega Awomolo (SAN) kpọrọ oku ka ụlọikpe ahụ wezuga ohere o nyere Nnamdi Kanu ka ọ zara ọnụ ya, ụlọikpe ahụ gara n'ihu nye Nnamdi Kanu ohere ịzara ọnụ ya.
Ụlọikpe gara n'ihu yigharịrị ikpe ahụ n'ụbọchị Fraịde 7 Nọvemba 2025 ma kwuo na ọ bụrụ na Nnamdi Kanu amaliteghị ịzara ọnụ ya ụbọchị ahụ, ha ga-ewezuga ohere ahụ.
N'aka nke ọzọ, ụlọikpe dọrọ mmadụ anọ bụbu ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Maxwell Opara, Nnaemeka Ejiofor, Mandela Umegborogu na Aloy Ejimakor aka na ntị banyere etu ha si akpa agwa ọkachasị na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ dịka ndị ọkaiwu.
Ihe a na-atụanya ga-eme n'ikpe Nnamdi Kanu

Dịka ikpe Mazi Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu n'ụbọchị Wenezde 5 Nọvemba, 2025, ndị ọkaiwu ya ekwuola ihe ha na-atụanya nwereike ime n'ikpe ya.
Oge BBC Igbo gbara ndị ntaakụkọ ya ajụjụọnụ banyere ihe nwereike ime n'ụlọikpe, ha kwuru na ha nwere olileanya na ụlọikpe ga-elebanye anya n'ihe Nnamdi Kanu kwuru banyere iwu ahụ gọọmenti Naịjirịa gbadoro ụkwụ ebo ya ebubo.
Cheta na Nnamdi Kanu kwuru na a kagbguola iwu ahụ eji ebo ya ebubo ma kwuo na gọọmenti Naịjirịa enweghị ike ikpe ya ikpe.
Ụlọikpe ekwuola na ha ga-anapụ Nnamdi Kanu ohere ịzara ọnụ ya ma Nọvemba 5 gafechaa

Ebe foto si, AFP via Getty Images / BBC
Onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ụlọikpe na-achọ imanye ya ka o bido usoro ịzara ọnụ ya n'ebubo iyi ọha egwu gọọmenti Naịjirịa boro ya.
Nnamdi Kanu kwuru nke a n'ụlọikpe dị elu n'Abuja ma gwa Ọkaikpe James Omotosho na ya enweghị okwu ọbụla ya ga-azara ọnụ ya.
Kanu bụ onye gosiri iwe ya n'ụlọikpe jụrụ Ọkaikpe Omotosho ihe mere e ji jichie ya n'ụlọmkpọrọ.
Kanu kwuru na adịghị eji iwu na-adịghị n'akwụkwọ iwu obodo na-ekpe mmadụ ikpe ma gwa ụlọikpe ka a gwa ya iwu e ji ekpe ya nke ọ kwuru na ọdịghị.
Ọ bụ nke a ka Kanu ji sị na ikpe a na-ekpe agbadoghị ụkwụ n'iwu ọbụla ma gwa ụlọikpe ka a tọhapụ ya taa n'ihi na ya agaghị aga n'ụlọ ndị uweojii nzuzo (DSS) ebe e jichiri ya.
Ọsịsa Ọkaiwu James Omotosho nyere Nnamdi Kanu
Ọkaikpe James Omotosho kọwara etu ikpe Nnamdi Kanu si bido kemgbe afọ 2015, ruo n'oge a gbanwere ọkaikpe nakwa mgbe ya bidoro ikpe ahụ.
Omotosho kọwara na ya nyere iwu ka onye e boro ebubo (Nnamdi Kanu) malite usoro ịzara ọnụ maka na ụlọikpe chọpụtara na o nwere okwu o kwesiri ịza ajụjụ maka ya nke a kpọrọ "prima facie".
Ọ kọwara na ọ bụ ka ụlọikpe nụ olu onye ọbụla mere ya ji sị ka onye e boro ebubo (Nnamdi Kanu) bido ịzara ọnụ ya.

Ọsịsa ọkaiwu Gọọmentị Naịjirịa nyere maka ihe Nnamdi Kanu kwuru
Ọkaiwu Naịjirịa bụ Adegboyega Awomolo kwuru na ọsịsa niile Nnamdi Kanu chọrọ iweta banyere ebubo e boro ya dị n'akwụkwọ e ji kpụpụ ya ụlọikpe.
Awomolo kọwara na ha enyeela ọsịsa maka ajụjụ iri Nnamdi Kanu jụrụ ma gwa ụlọikpe ka o kwubie okwu ma tinye ụbọchị a ga-enye mkpebi banyere ikpe ahụ.
N'ikpeazụ ọkaikpe James Omotosho yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n'abalị ise nke ọnwa Nọvemba 2025 ka onye e boro ebubo (Nnamdi Kanu) malite usoro ịzara ọnụ ya maọbụ ị hapụ ohere ahụ.
Nnamdi Kanu: Ihe a na-atụanya n'ụlọikpe taa

Dịka ikpe onye bụbu onye ndu otu Indigenous People of Biafra na-azọ nwere onwe na-aga n'ihu n'ụlọikpe taa, a na-atụanya na ụlọikpe ga-enwe mkpebi banyere usoro ikpe ya.
N'oge garaaga, Ọkaikpe James Omotosho gwara Nnamdi Kanu ka ọ malite usoro ịzara ọnụ ya n'ebubo iyi ọha egwu gọọmenti Naịjirịa boro ya.
Mana Kanu gwara Ọkaikpe Omotosho ka atọhapụ ya maọbụ nye ya beelụ maka na ya enweghị ikpe ọbụla.
Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe ga-amara na Nnamdi Kanu enwetela ọkaiwu ga-amalite usoro nzara ọnụ maọbụ ụlọikpe a ga-agbakwasị ụkwụ n'ebubo niile gọọmenti Naịjirịa boro ya were kpebie ikpe.
Ọ bụrụ na Kanu ebidoghị usoro ịzara ọnụ ya taa, ụlọikpe ga-etinye ụbọchị a ga-enye mkpebi.
N'aka nke ọ, ọ bụrụ na Nnamdi Kanu malite usoro ịzara ọnụ ya, maọbụ nweta ọkaiwu ga-enyere ya aka bido ya, ụlọikpe ga-enye ya ụbọchị ọ ga-azara ọnụ ya tupu e nwee mkpebi ikpe.
Ndụmọdụ Ọkaikpe James Omotosho nyere Nnamdi Kanu

Ka Nnamdi Kanu na-esi ọnwụ na ya agaghị amalite usoro ịzara ọnụ ya banyere ikpe a na-ekpe ya, ọkaiwu James Omotosho nyere ya ndụmọ ma gwa ya ihe o nwereike ịpụta.
James Omotosho kwuru na abịa n'ikpe dị etua nakwa ọnọdụ dị etua, onye a na-ekpe nwere naanị ihe atọ cheere ya nke gunyere:
- Ịgwa ụlọikpe na ya enweghị ikpe.
- Ọ bụrụ na ụlọikpe anabataghị na ya enweghị ikpe, ọzọ bụ na ọ ga-amalite ịzara ọnụ ya.
- Ọ bụrụ na o kweteghị ịzara ọnụ ya mara na ọ chọrọ ka ụlọikpe gbado ụkwụ n'ebubo maọbụ ihe niile ndị kpụtara ya ụlọikpe kwuru.
Omotosho gara n'ihu kwuo na ya kwesiri ịkọwara Nnamdi Kanu ihe ndị a maka na ọ bụghị ọkaikpe ma nye ya ndụmọdụ ịjụ ese nke ọma.
"A na m enwere oge a niile m nwere na-akọwa ihe a maka na Chineke ga-ata m ụta ma m hara ịkọwara ya maka na ọbụghị onye ọkaikpe".
O mechere nye Nnamdi Kanu abalị asaa ka o were jụọ ajụjụ ma nwete ndụmọdụ n'aka ndị ọkaikpe maara ihe banyere ikpe a na-ekpe ya.
Omotosho ji ohere ahụ inyeharịa ikpe ahụ n'abalị 4, 5, na 6 nke ọnwa Nọvemba, 2025 ma kwuo na ọdịara Nnamdi Kanu ibido ịzara ọnụ ya maọbụ ịgbado ukwụ n'ebubo niile ndị kpụtara ụlọikpe boro ya.

Nnamdi Kanu agwala Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe dị elu n"Abuja na naanị ihe ọ ga-eme ugbua bụ inye ya ntọhapụ beelụ maọbụ ịsị ya laa na ya enweghị ikpe ọbụla.
Kanu kwuru nke a n'ụlọikpe taa bụ Mọnde 27 Ọktoba 2025 dịka a na-atụ anya na ọ ga-amalite ịzara ọnụ ya banyere ikpe a na-ekpe ya maka ebubo iyi ọha egwu na ebubo ndị ọzọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọikpe ekwesighị ikpe ya ikpe maka na ha enweghị ikike ikpe ya ikpe.
Ọ gara n'ihu kwuo ma ya asaala anya mmiri tulee akwụkwọ Gọọmenti Etiti agbara ya ma chọpụta na ya enweghị ikpe ọbụla.
N'okwu ya "Ọkaikpe, soro m kelee Chineke maka na atulera m akwụkwọ a gbara m ma chọpụta na enweghị m ikpe ọbụla".
"Ugbua gị ka ọ dịara ịsị m laa na m enweghị ikpe ọbụla maọbụ inye m ntọhapụ beelụ".
"E ji ebubo adịgboroja jichie m".
"Enweghị iwu dị n'akwụkọ iwu Naịjirịa nke gọọmentị gbara m akwụkwọ zọdere ụkwụ na-ekpe m ikpe"
Ọ gara n'ihu kwuo na ya enweghị ikpe ọbụla, na ya agaghị amalite ịzara ọnụ ya.
Ihe mere m ga-eji pụta dịka onye akaebe Nnamdi Kanu – Nyesom Wike

Ebe foto si, BBC, Screenshot
Minista na-ahụ maka Abuja bụ Nyesom Wike ekwuola na ya agaghị apụta dịka onye akaebe Nnamdi Kanu naanị maka na o depụtara aha ya n'akwụkwọ akụkọ.
Ka o sina dị, Wike rụtụrụ aka ma kwuo na ọ bụrụ na ụlọikpe kpọọ ya ka ọ pụta gbaa ama maọbụ wepụta ihe akaebe, na ya ga-eme nke ahụ na-eleghị anya n'azụ.
Nyesom Wike kwupụtara nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka n'ụtụtụ Fraịde 24 Ọktoba 2025.
N'oge mkparịtaụka ahụ a haziri n'Abuja, Minista kwupụtara na o nwebeghị onye ziteere ya akwụkwọ ka ọ pụta dịka onye akaebe n'ikpe onyendu IPOB.
Wike kwukwara na ọ maghị ihe mere Kanu jiri kpọọ aha ya dịka otu n'ime ndị akaebe ya, ma kwuo na ọ bụ naanị Kanu pụrụ ịkọwa nke ahụ.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị ole na ole gara aga ka Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indiginous People of Biafra (IPOB) kpọpụtara aha ọtụtụ ndị ga-agbara ya akaebe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Otu n'ime ndị Kanu kpọrọ aha bụ Nyesom Wike, onye bụbu gọvanọ Rivas steeti ma bụrụkwa Minista na-ahụ maka Abuja ugbua.
Ihe Nnamdi Kanu gwara ọkaikpe taa

Nnamdi Kanu arịọla ọkaikpe James Omotsho ka ọnye ya ohere ma bigharịa ikpe ya ụbọchị ọzọ maka na ndị ọkaiwụ ya ọ chụrụ enyebeghị ya akwụkwọ ikpe ya.
Kanụ meere arịrịọ a dịka o kwesịrị ịmalite ịzara ọnụ ya n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụbọchị taa bụ Fraịde 24 Ọktoba.
"Ndị ọkaiwu m enyebeghị m akwụkwọ ikpe m, egbochiri ndị kwesịrị iwetara m ya unyahu"
Kanu rịọkwara ụlọikpe ka ha nye iwu ka ndị ụlọọrụ DSS hapụ ndị ọbịa si mba ọzọ bịa ihụ ya maka na o nwere ndị akaebe iri abụọ na atọ si mba Yurope, Amerịka nakwa Etopia.
Ọkaiwu gọọmenti bụ Awomolo gwara ụlọikpe na o nweghị nsogbu na Kanu chọrọ ka enye ya ruo ụbọchị Mọnde 27 Ọktoba, 2025 kama na Nnamdi Kanu cheta kwa na ụlọikpe nyere ya ụbọchị isii ịmalite ịzara ọnụ ya ma mechie ikpe ya.
Ọkaipe Omotosho kwuru na site n'ime mmụọ nke ịnụ ihe ziri ezi ọ ga-enye Kanu ohere ịmalite ịzara ọnụ ya n'ụbọchị Mọnde 27 Ọktoba, 2025 ma gwa ya ka o jiri abali ole na ole o nwere jiri kpọrọ ihe.
Omotosho nyekwara iwu ka DSS kwe ka Kanu gaa hụ ndị ọkaiwu ya ọbụlagodi na Satọdee na Sọnde maka ịkwado ọfụma.

Nnamdi Kanu awụchiela n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụbọchị taa bụ Fraịde 24 Ọktoba na njikere ịzara ọnụ ya.
Cheta na Kanụ chụpụrụ ndị ọkaiwu ya n'ụbọchị Tọsde ma kwuo na ọ ga-eji aka ya anọchite onwe ya n'ikpe ya.

Dịka Nnamdi Kanu chụpụrụ ndị ọkaiwu ya ma bido ikwuchitere onwe ya, o kwupụtara ụfọdụ ọdachi ndị nọ n'ikpe ya ma kwuo na ụlọikpe enweghị ikike ikpe ya ikpe.
Okaikpe Omotosho gwara ya n'ihe ndị nile okwupụtara n'ụlọikpe enyeela iwu gbasara ya.
Kanu gara n'ihu gwa ụlọikpe ka enye ya ọtụtụ oge ka o nwere ike ikpụkọta ọbụrụ ya ọfụma ma kpọta ndị o tinyere aha ga-abụ ndị akaebe ya dịka ọ na-amalite ịzara ọnụ ya.
N'agbanyeghị arịrịọ ka enye ya obere oge, ọkaikpe Omotosho si na iwu o nyere ka ọ zara ọnụ ya ụbọchị isii ga-adị.
Omotosho bigharịrị ikpe ya ga ụbọchị Fraịde 24 ọktoba, 2025.
Ndị uweojii anwuchiela Omoyele Sowore dịka ọ bịara ikpe Nnamdi Kanu

Anwuchiela Omoyele Sowore, onye na-agba mbo maka ikike diiri onye ka ọ na-aputa ikpe Nnamdi Kanu mere n'ụlọikpe ukwuu n'Abuja.
Ndị uweojii ekwubeghị ihe mere ha jiri nwuchịe ya mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka ngagharịiwe o mere.
Cheta na n'ụbọchị 20 Ọktoba ka Sowore hazịrị ngagharị iwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu ebe ha nwuchịrị ọkaiwu na nwanne Nnamdi Kanu.
Ndị mmadụ boro Sowole ebubo na ọ ya mere eji nwuchie nwanne Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya mana ezinaụlọ Nnamdi Kanu si na ebubo ahụ abụghị eziokwu.
Akụkọ na-efegharị na-enwere ike ị kpọpụ Sowore ga ụlọikpe

Ọkaiwu Kanu Agabi ekwuola na Nnamdi Kanu nwere ikike ịnọchite onwe ya n'ikpe ya n'ụlọikpe.
Onye bubu onye ndụ ndị ọkaiwu kwuru nkea dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụtụtụ taa bụ Wenezde dịka a malitere ikpe ya ka o kwesịrị ịgọrọ onwe ya n'ebubo iyi ọha egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.

Kanu kwuru nke a n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụtụtụ taa bụ Wenezde dịka a malitere ikpe ya ka o kwesịrị ịgọrọ onwe ya n'ebubo iyi ọha egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmenytị.
Onye ntakụkọ anyị nọ n'ụlọikpe kwuru na oge ọkaikpe ji ikpe ahụ bụ James Omotosho jụrụ ya kedụ onye ga-anọchitezi gị? Ọ sara sị' Agam anọchite onwe m."
Onye ndu ndị na-anọchitebu Kanu bụ Ọkaiwu Kanu Agabi kwuburu na ya na-ewezuga onwe ya n'ikpe Kanụ ya na ndị ogbo ya gụnyere Onyechi Ikpeazu, Emeka Etiaba, Nunghe Mela Audu, Paul Erokoro, Uchenna Njoku na ndị ọkaiwu ndị ọzọ nwere agba
Jọstịs Omotosho nyere iwu ka ndị ọkaiwu ndị ahụ hapụ ụlọlọikpe belụ sọ ndị welitere isis a kpọrọ Senior Advaocate of Nigeria na Bekee.
Ihe mere Nnamdi Kanu ji tinye aha Wike, Umahi, Sanwo-Olu dịka ndị ga-agbara ya akaebe

Ebe foto si, Others, Ebonyi Govt House, Wike/X
Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu gọọmentị machiri a na-akpọ Indiginous People of Biafra (IPOB) akpọpụtala aha ọtụtụ ndị ga-agbara ya akaebe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Nke a na-abịa dịka ikpe ebubo iyi ndụ egwu gọọmentị Naịjirịa boro ya eruola n'ogogo ebe ọ ga-azara ọnu ya n'ụbọchị Tọzde 23 Ọktoba 25.
Otu n'ime ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Nnaemeka Ejiofor kọwara ihe mere Kanu jiri tinye aha ndị nọ na gọọmenti Naịjirịa dịka ndị akaebe ya.
Ejiofor kwuru na aha ndị niile Kanu tinyere bụ ndị nwere otu ihe maọbụ ihe ọzọ gbasara ha n'ikpe ahụ.
Ọ sị na ndị akaebe Kanu tinyere aha ha dị iri abụọ na atọ nke gunyere ụfọdụ ndị nọ na gọọmenti ugbua.
Ndị a gunyere ndị Gọvanọ, ndị Mịnịsta, nakwa onye bụbu ọkaiwu gọọmenti etiti na mịnịsta na-ahụ maka ikpe bụ Abubakar Malami, onye bụbu Onyeisi ndịagha bụ Ọchịagha Tukur Yusufu Buratai na ndị ọzọ.
N'okwu ya "ndị anyị tinyere aha ha bụ ndị ikpe Nnamdi Kanu gbasara".
Ọ gara n'ihu kọwaa na "mgbe ndị ọkaikpe gọọment Naịjirịa na-ekwupụta ebubo ndị ha boro Kanu n'ụlọikpe, ha kwuru na ọ bụ Malami mere nnyocha n'isi Nnamdi Kanu, ebe Buratai nyere iwu ka ndịagha wakpoo ụlọ ya dị n'Afara Ukwu Umuahia n'afọ 2017."
Lee ndị ọzọ Kanu sị ga-agbara ya akaebe n'ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images,Sanwo-olu/X, Ebonyi Govt House, Wike/X
Kanu gakwara n'ihu tinye aha Dave Umahi bụ mịnịsta na-ahụ maka ọrụ, Nyesom Wike bụ mịnịsta na-ahụ maka Abuja, Gọvanọ Legọs steeti bụ Sanwo-olu, aịjirịa, nakwa onye Ọchịagha TY Danjuma na ndị ọzọ mere ya mmadụ iri abụọ na atọ.
N'akwụkwọ Nnamdi Kanu wegara n'ụlọikpe, ọ gwara Ọkaikpe James Omotosho na ọ dịla njikere ịzara ọnụ ya n'ebubo niile ahụ e boro ya.
Ụbọchị ole ka Kanu nwere iji zara ọnụ ya
N'oge ịzara ọnụ ahụ, Kanu na-akwado ịkpọta ndị akaebe e kewara ụzọ abụọ, nke bụ ndị ọ bụ iwu na ha ga-abịarịrị na ndị dị mkpa ha kwesịrị ịbịa gbaa akaebe n'ikpe ahụ.
Ọkaikpe Omotosho dị na mbụ nye ya ụbọchị isii ịzara ọnụ ya n'ebubo ndị ahụ malite n'ụbọchị 23 Ọktoba, 2025.
Mana Kanu gwara ụlọikpe ka e nye ya ụbọchị iri itoolu maka na ndị ọ chọrọ ka ha bịa gbaara ya akaebe buru ibu, na ọ gaghị adị mfe ha niile ịbị n'ụlọikpe n'ime ụbọchị atọ ahụ.
Cheta na tupu ikpe Nnamdi Kanu nke a eruo n'ọnọdụ ọ ga-akpọ ndị akaebe ma zara ọnụ ya maka ebubo niile e boro ya, na e jidere ya na mba Kenya n'afọ 2021 ma kpụlata ya Naịjirịa na-ekpe ya ikpe dị icheiche.
N'ọnwa Jenụwarị 19, 2022 ka Ọkaikpe Benson Anya nke ụlọikpe dị elu n'Ụmụahịa, Abịa steeti kpebịrị ikpe ma kwuo na etu ndịagha Naịjirịa si mwakpoo ụlọ Nnamdi Kanu dara iwu.
Ọ gwara gọọmenti Naịjirịa ka ha kwụọ Nnamdi Kanu otu ijeri naịra (N1b) tie ya aka n'obi, nyọọ ya mgbahara maka ihe e mere ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na-enweghị mgbe Nnamdi Kanu gbara ọsọ ịbịa ụlọikpe mana ọ gbara ọsọ ndụ ya mgbe ndịagha mwakporo ụlọ ya n'afọ 2017.
Mana ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu ugbua gunyere ịgba ọsọ hara ịbịa ụlọikpe, inyi ọha egwu, na ebubo ndị ọzọ dị icheiche.










