Gịnị mere Soludo ji napụ Bianca Ojukwu echichi e chiri ya?

Ebe foto si, Charles Soludo/Bianca Ojukwu/Facebook
Ihe malitere dịka ihe ọnụ achọọla ịghọ ihe e ji adụ aka n'ọnụ dịka Gọọmentị Anambara Steeti kagburu echichi e chiri nwunye Odumegwu Ojukwu nakwa Mịnịsta nta na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Bianca Ojukwu.
Na nsonso a, Lolo Ojukwu gosiri obiụtọ ya n'ọbaozi ya na Facebook dịka Obi Austin Chukwuezugo Ndigwe bụ Ezeuzu nke Atọ n'Ọka ,Anambara steeti chiri ya echichi 'Anyanwu Na-Awalụ Ọra', n'emume Ịgụ Aroh e mere.
Mana emume nkwanyere ugwu ahụ amasịghị Gọọmentị Anambra steeti.
N'ozi nke Kọmịshọna na-ahụ maka Okpuru Ọchịchị na echichi na steeti ahụ bụ TonyCollins Nwabunwanne binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Wenezde, o kwuru na echichi ahụ si n'aka Eze adịgboroja nke mere ya echichi adịgboroja.
Ozi ahụ sịrị, "Dịka onye welitere isi n'otu Apga, ị nara echichi n'aka onye ọkwa ya dịka onye eze bụ onye gọọmenti anabataghị na-ebute mgbagwoju anya nye ọha n'ebe Gọọmenti Anambara kwụ n'okwu metụtara omenala na steeti a."

Ebe foto si, Anambara Government

Ebe foto si, Anambra Government
N'ụbọchi Tuzde, abalị iri atọ nke ọnwa Disemba afọ 2025, Bianca Ojukwu kwupụtara afọ ojuju ya na nkwanye uju e nyere ya ma sị na o gosiri ịhụnanya e nwere n'ebe ọ nọ.

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook
Ojukwu onye gbara ama na "E nyekwara m igodo alaeze ochie a wkuru sị, "Ejighị m ịhụnanya na nkwanye ugwu ndị alaeze a na ndị igbo nile gosiri m egwu egwu."
Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu
Dịka okwu ahụ na-aga,ụfọdụ ndị na-akwado ebe gọọmentị kwụ, ebe ụfọdụ na-akatọ ya.
Oto onye ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ achọghị ka a kpọ aha ya n'okwu a kwuru na Oriaku Ojukwu kwesịrị ịjụ ese tupu ọ nabata echichi ahụ.
"Ọ kwesiri ịjụ Gọvanọ tupu ọ nara echichi ahụ."
" Ọ bụrụ na ọ bụ onye na-echeta ihe, ọ gara echeta na o nwere oge Gọvanọ gwara onye chiri ya echichi ahụ na ọ bụghị ya bụ Igwe Ọka."
Mana Emmanuel Ike Okoli kwuru sị, " O doghị anya ma ihe na-ese okwu ọbụ Eze ka ọ bụ Bianca Odumegwu Ojukwu naara echichi kaọbụ echichi ya.
Nke bụ eziokwu bụ na Bianca tozuru echichi e chiri ya." Eze agaghị ga ị narara ikike tupu o nye onye ọbụla echichi."
Ihe ụmụafọ Ọka na-ekwu
Mana ụfọdụ umụafọ Ọka kweshiri dịka ha kwadoro echichi e chiri Bianca Ojukwu wu.
N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Ọkammuta Emmanuel Obi binyere aka ma wepụta ụbọchị mbụ nke Ọnwa Jenụwarị afọ 2026, ndị Ọka gbarụrụ ihu n'ozi ahụ si n'aka Gọọmentị Anambra steeti pụta.
Ozi ahụ sịrị,"Anyị bụ ụmụnwoke na ụmụnwanyị Ọka nakwa ndị na-akwado omenala Igbo jụrụ ma katọọ ndachi nke Gọọmentị Anambra dachiri n'echichi "Anyanwu N'Awalu Ora" (Light of the Community) nke Obi Dr. Austin Chukwuezugo Ndigwe, MON, JP, Ezeuzu III nke Ọka chiri Ambassador Bianca Odumegwu-Ojukwu."
Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ ọha Ọka gụnyere ndị okenye, ndịiche na ndị obodo gbakọrọ aka họpụtara ma chie Obi Austin Nwigwe "Ezeuzu nke Atọ", ma sị na ịkpọ ya Eze 'adịgboroja" bụ "mkparị" nye ha.










