Buhari,Odira Nwobu, Pa Adebanjo, Nkechi Nwejeh na ndị ọzọ a ma ama nwụrụ n'afọ 2025

Pa Ayo Adebanjo, Nkechi Nwejeh na Odira Nwobu

Ebe foto si, BBC/Nkechi Nwejeh/Odira Nwobu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Afọ 2025 wetara ọtụtụ ihe anụrị na mkpalite mmụọ mana o wetakwara ihe obi mgbawa na anyammiri.

Ụfọdụ ndị a ma ama na Naijiria gụnyere ndị ihe ejije, ndị e ji okwu ha agba izu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị sooro afọ a laa.

Lee ụfọdụ n'ime ha:

1. Muhammadu Buhari

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari

Aka chịburu Naijiria bụ Muhammadu Buhari nwụrụ n'abalị 13 nke ọnwa Julai afọ 2025 ka ọ gbachara afọ 82.

Buhari chịrị Naijiria dịka onye agha malite afọ 1983 rue 1985.

Ọ laghachiri chịkwa dịka onye nkịtị malite n'afọ 2015 rue afọ 2023.

2. Odira Nwobu

Odira Nwobu

Ebe foto si, Odira Nwobu

Otu n'ime ndị ọnwụ ha mara ahụ ọtụtụ ụmụ Naijiria jijiji n'Afọ 2025 bụ nke Odíra Nwobu dịka nwụrụ ọnwụ ntụmadị ka ọ gbachara afọ 43.

Nwaamadi a bụ onye ejije nakwa onye ọkpaọchị nwụrụ n'abalị 24 nke ọnwa Novemba afọ 2025 na Saụt Afrịka ebe ọ gara ezumike, .

A mabeghị ihe gburu nwaafo Anambara steeti ahụ e bulatara ozu ya na Naijiria na nso nso a nwaa amadi ahụ bụ onye.

3. Pat Ugwu

Pat Ugwu

Ebe foto si, Pat Ugwu/Facebook

Onye ihe ejije Nollywood a nwụrụ n'ọnwa Febụwarí afọ 2025 ka ọ gbachara afọ 35.

Ugwu, onye Enugwu steeti esonyere n'ọtụtụ ihe ejije gụnyere; 'Twist of Fate' (2020),'Lack of Money' (2018, nakwa 'Port-Harcourt Lady' (2019),

4. Pa Ayo Adebanjo

Pa Ayo Adebanjo

Ebe foto si, Uche Akolisa/BBC

Na-amangehị ka ọ kaara nka tupu ọ laa mụọ ka ọ gbachara afọ 96 , ọnwụ Pa Ayo Adebanjo bụ onye nwụrụ n'udo n'ụlọ ya na Lekki Legọs n'abalị 14 nke ọnwa Febụwaryị afọ 2025 ghọrọ ọtụtụ ụmụafọ Naijiria ihe mwute.

Oke osisi a e ji eje mba bụ onye e ji iti mkpu ka mpaghara Naijiria ọbụla nweta oke ruru ha n' ọchịchị onyekwuucheya na Naijiria.

5. Fabian Adibe

Fabian Adibe

Ebe foto si, Fabian Adibe/Instagram

Nwoke a bụ aka ochie n'ihe ejije Nollywood nwụrụ n'abalị 20 nke Ọnwa Ọgụst afọ 2025 ka ọ gbachara afọ 82.

A gaghị echefu Ichie Adibe bụ nye mere agwa 'Ogbuefi Uzowulu' n'ihe ejije 'Things Fall Apart' nke ụlọ ntakụkọ NTA mere nke bụ ntụagharị akwụkwọ Chinua Achebe dere.

6. Nkechi Nweje

Nkechi Nwejeh

Ebe foto si, Nkechi Nwejeh

Agbara nwaanyi a bụ onye ihe ejije Nollywood a ma ama nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Maachị afọ 2025 ka ọ gbachara afọ 57.

7. Doyin Okupe

Doyin Okupe

Ebe foto si, Doyin Okupe/Facebook

Dkta Doyin Okupe bụbụ ọnụ na-ekwuru Goodluck Jonathan oge ọ bụ onyeisiala nwụrụ n'ọnwa Maachị ka ọ gbachara afọ 72.

Onye Ogun Steeti, Okupe nwụrụ ka ọrịachara ọrịa kansa ogologo oge.