Amerika agaala n'ihu n'inyo ihe na-eme n'ọhịa Sambisa

Donald trump

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Mba Amerịka amalitela ọrụ inyo ihe na-eme na Borno steeti, dịka ndịagha ha tụchara ndịagha nnụpụisi ụka Alakụba ogbunigwe na mpaghara Ugwu Naijiria Ụbọchịụka. Ekeresimesi.

Igwe e ji atụle ka ụgbọelu si efe gosiri na otu ụgbọelu na-efegharị na mpaghara oke ọhịa Sambisa bụ ebe e ji mara ndị Boko Haram na ndị ISIS.

https://www.bbc.com/igbo/articles/clyd0zn0r4eo

Tupu ha tụọ ogbunigwe ha tụrụ ụbọchi Ekeresimesi, ndịagha Amerịka mere otu ihe ahụ na mpaghara Sokoto,Yobe na mpaghara mmiri 'Lake Chadi.

Dịka Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Yusuf Tuggar si =gwa BBC, ogbunigwe ahụ Amerịka tụrụ ga-enye ohere Amerịka ị ga n'ihu n'ọrụ mkpocha na nzacha ndị agha nnupụisi ụka Alakụba.

Akpakara ogbunigwe a tụrụ na Sokoto bụ ya dakwara na Kwara- Gọọmentị Etiti

Mohammed Idris

Ebe foto si, Mohammed Idris/ Screengrabs

Nkọwa foto, Mohammed Idris kwuru na ọ bụ akpakara ogbunigwe Amerịka gbara dara na Sokoto nakwa Kwara Steeti

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Naijiria bụ Mohammed Idris akọwaala ihe bere nwịị na okwu ọgbụnigwe gbara na Kwara Steeti Ụbọchị Ekeresimesi.

Ogbunigwe gbara n'Offa dị na Kwara steeti nakwa mpaghara Tangaza dị na Sokoto Steeti n'abalị 25 nke ọnwa Disemba afọ 2025.

Onyeisiala Donald Trump gbara ama na ọ bụ ndịagha Amerịka gbara ogbunigwe na Sokoto , dịka o doghịbu anya ebe nke gbara na Kwara sị.

Mana n'ozi nke Idris binyere aka ma wepụta n'Abalị Fraide abalị 26 nke ọnwa Disemba, o kwuru na ọ bụ akpakara ogbunigwe a gbara na Sokoto dara na Kwara.

Ọ sịrị, " A tụrụ ogbunigwe 16 site mmiri 'Gulf of Guinea', bụ nke e ji 'drone were zipụ bụ nke e ji achụ ndị ISIS na-agbalị ịbata Naijiria site na mpaghara Ugwu

"Ka ya bụ ihe na-aga, akpakara ya dara na Jabo dị n'Okpuru Ọchịchị Tambuwal dị na Sokoto Steeti nakwa nso ụlọnkwarị dị n'Ọffa Kwara Steeti."

"Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị onye nwụrụ na ebe abụọ ahụ.

Aka Amerịka adị n'ogbunigwe gbara na Kwara Steeti ụbọchị Ekeresimesi?

Ebe Okpunigwe gbara na Kwara Steeti

Ebe foto si, BBC/Abdulgany Saad

Dịka akụkọ na-akpọtụ na ndịagha Amerịka gbara ogbunigwe na Sokoto Steeti ụbọchị Ekeresimesi, akụkọ si Kwara steeti na-ekwu na ọgbụnigwe gbara n'obodo Offa dị n'Okpuru Ọchịchị Offa nke steeti ahụ, merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ ụbọchị Tọzde 25 Disemba, 2025

Mana o dobeghị anya ma ọ bụ Amerịka dịka ya bu ihe mere n'otu abalị Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto Steeti.

Ụfọdụ ndị obodo na-arụ ndịagha Naijiria aka, ebe ụfọdụ bụ ndị oyinduegwu.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC na ọ bụ oge ọ kụrụ elekere iri na itoolu nke abalị Ekeresimesi Otu onye bi n'Offa a kpọrọ Kazeem, sị na ọ hụrụ ihe mere. Eluụlọ na aja ọtụtụ ụlọ kụsara. ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ."

Mana o nweghị onye nwụrụ.

Ogbunigwe

Ebe foto si, BBC/ Abdulgany Saad

Otu onye ọrụ ụlọnkwari 'Solid Worth Hotel' Ọffa bụ ebe ogbunigwe ahụ dara soro metụtara bụ Musau Adeyemi kwuru o buru nnukwu ibu ma na-atụ egwu.

O kwuru na kemgbe ogbunigwe ahụ dara na ndị ọrụ nchekwa ewegharala ọnọdụ n'ụlọnkwari ma jụ mmadụ ịbata.

Onyeisioche okpuru Ọchịchị Offa Onarebu Sulyman Olanrewaju kwuru na ọ bụ ndịagha na-atụle nwaagha ka ogbunigwe ahụ danahụrụ.

N'ozi o nyere BBC Olanrewaju sịrị na ihe mere enweghị ka o siri metụta Amerịka

Ka ọ dị ugbua Ndịuweojii steeti ahụ ekwuola na ha na-enyocha ihe mere.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kwara Steeti bụ Adetoun Ejire Adeyemi onye gwara ndị ntaakụkọ na ogbunigwe gbara n'ezie kwuru sị na nnyocha na-aga n'ihu iji maka ihe mere kpọmkwem.

Ihe Africom, Tuggar, Tambuwal,ndị ọzọ kwuru banyere ogbunigwe Amerịka tụrụ na mpaghara Ugwu Naijiria
Aminu Tambuwal, Donald Trump na Yusuf Tuggar

Ebe foto si, Tambuwal,Getty Images/Yusuf Tuggar/X

Ndịisiagha Amerịka na mpaghara Afrịka bụ 'US Africa Command (Africom) ekwuola na gọọmentị Amerịka nwetara nkwado ogbo nke Naijiria tupu ha mee mwakpo megide ndịagha nnupuisi ụka Alakụba n'ụbọchị Tozde.

Ozi a na-abịa dịka ndịagha Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto megide ndịagha nnupuisi ụka Alakụba n'ụbọchị Tọzde, abalị 25 nke ọnwa Disemba, afọ 2025.

Ibrahim Babangida,Donald Trump na Yusuf Tuggar

Ebe foto si, Getty Images

N'ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara n'akara X ha kwuru sị "Onyeisiala Amerịka na odeakwụkwọ na-ahụ maka agha nke mba Amerịka nyere ha iwu site na njikọ aka ndị ọchịchị Naijiria were tụọ ndị oyiọhaegwu ISIS ogbunigwe n'abalị 25 nke ọnwa Disemba na Sokoto."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Nkọwa ha dabara n'ọsịsa Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Yusuf Tuggar nyeburu.

Tuggar kwuru sị, "Ọ bụ Naijiria zunyere Amerịka ohi ụka ha ji bịa ya bụ ije. Mụ na odeakwụkwọ gọọmenti Amerịka bụ Marco Rubio kpara ụgboro abụọ; nkeji 19 tupu a kuso nakwa nkeji 5 tupu o mee."

Yusuf Tuggar, Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ

Ebe foto si, Yusuf Tuggar/X

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ụmụ Naijiria dịka Dele Farotimi na Omoyele Sowore katọrọ mwakpo ndịagha Amerịka mere ndị oyinduegwu, sị na o megidere ikike Naijiria nwere dịka mba kwụụrụ onwe ya.

Dịka ụfọdụ na-aka ya, ọtụtụ ụmụ Naijiria etoola nzọpụkwụ ahụ ọchịchị Trump zọpụrụ.

Onye bụbụ Onyeisi Ụlọnnochiteanya Naijirịa nakwa Gọvanọ chịburu Sokoto Steeti bụ Aminu Tambuwal tọrọ mmekọrịta dị n'etiti ndịagha Naijiria na ogbo ha nke Amerịka n'ime mwakpo ahụ e mere ma sị na ọ ga-achụ ndị oyinduegwu ụkwụ eru ala.

Tambuwal gara n'ihu sị," Ọ dị mkpa ka ọhanaeze mata na ọ bụ ndị oyindụegwu, ọ bụghị ndị nkịtị aka ha dị ọcha."

Otu ọnye ọkaiwu bụ Bulama Bukarti, kwuru na 'Obi dị m ụtọ na ọ dịka Onyeisiala na Gọọmentị Naijiria gbakọrọ aka, na-abụghị na Amerịka gara mee uche ha n'onwe ha." '"Na Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto na-arụtụ aka na ọ bụ otu Lakurawa bụ ndị na-akpa ike dị egwu n'ikpeazụ a ka anya ha gara na ya."

Ka ọ dị ugbua, Trump ekweela nkwa na Amerịka ga-aga n'ihu n'ịtụ ogbunigwe ma ọ bụrụ na ndị oyiọhaegwu gaa n'ihu n'igbusịsị ndị ụka Kraistị.

Aminu Tambuwal

Ebe foto si, Aminu Tambuwal/X

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Donald Trump: Ndịagha Amerịka atụọla ndị oyiohaegwu ogbunigwe mbụ n'Ugwu Naijiria

Donald Trump

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agbala ama na ndịagha mba ahụ atụọla ndị agha nnupuisi ụka Alakụba ogbunigwe n'Ugwu Naijiria.

Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na ogbuigwe gbara na Sokoto n'abalị ụbọchị Ekeresimesi, abalị 25 nke ọnwa Disemba, afọ 2025.

Cheta na nsonso a, Trump majara kwuo na ya ga-ezite ndịagha na Naijiria iji gboo ọgụ na mgbusịsị o kwuru a na-egbusisi ndị Ụka Kraisti.

Ogbunigwe a gbara

Ebe foto si, screengrab

N'ozi Trump wepụtara n'akara ọbaozi ya na Facebook n'ụtụtụ Fraide, , O kwuru sị, "n'Abalị a e nyere m ntuziaka ka Ọchịagha nke Amerịka tụọ megide ndị oyinduegwu ISIS na-egbusịsị ndị Ụka Kraistị nọrọ onwe ha."

Trump onye kwuru na ha tụrụ n'ebe dị iche iche na Naijiria ,gara n'ihu kwuo na n'ọchịchị ya agaghị enye ohere ka ndịagha nnupusi ụka Alakụba na-akpa ike.

Gọọment Naijiria kwuru na nwere nkwekọrịta ha na Amerịka ịrụkọ n'okwu nchekwa.

Ozi na Ministrị na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ

Ebe foto si, FEderal Ministery of Foreign Affairs,Nigeria