Odira Nwobu: E buletela ozu ya na Naịjirịa

Ebe foto si, Odira Nwobu/Facebook
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị bụ na e buletela ozu Odira Nwobu na Naịjirịa.
Ọkaiwu Chukwujekwu Chukwudi gwara BBC Igbo na ozu Odira batara Naịjirịa n'ụbọchị Tuzde Disemba 16, 2025.
Cheta na Odira Nwobu nwụrụ na mba Saụt Afrịka n'ụtụtụ Mọnde 24 Nọvemba, 2025, dịka Onyeisi otu jikọrọ ndị ejije na Naijiria a kpọrọ 'Actors Guild of Nigeria' (AGN) na Bekee bụ Emeka Rollas si gwa BBC Igbo.
Gịnị ka nnyocha 'autopsy' e mere kwuru?

Ebe foto si, Odira Nwobu/Facebook
Ngwa ngwa akụkọ ọnwụ Odira Nwobu gbasara ebe niile, ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere ihe gburu ya.
Ọtụtụ akụkọ dị iche iche malitere ifegharị banyere ihe gburu nwaamadị ahụ nke gụnyere na ọ nwụrụ n'elu nwaanyị dịka ọ ṅụchara ọgwụ na-akwalite mmekọ nwoke na nwannyị.
Iji chọpụta nke bụ eziokwu, BBC Igbo kpọtụụrụ Ọkaiwu Chukwudi onye gwara anyị na 'ọbụghị eziokwu na Odira Nwobu nwụrụ n'elu nwaanyị'
O mere ka o doo anya na a ga-eme nnyocha autopsy iji chọpụta ihe kpatara ọnwụ nwaamadị ahụ.
Ọ gwara anyị na mpụtara nnyocha autopsy e mere apụtala kama na ezinaụlọ Odira Nwobu achọghị ịgwa ọhanaeze ihe autopsy ahụ kwuru.
N'okwu ya 'Ọ bụ eziokwu na mpụtara nnyocha autopsy ahụ apụtala mana ezinaụlọ Nwobu achọghị ịgwa onye ọbụla ihe autopsy ahụ kwuru na ọ bụ ya gburu Odira Nwobu".
Ihe i kwesịrị ịma maka Odira Nwobu, onye ihe ejije 'Nollywood' lara mmụọ na Saụt Afrika

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Odira Nwobu anwụọla ka o gbachara afọ 43.
Nwobu nwụrụ na mba Saụt Afrịka n'ụtụtụ Mọnde abalị 24 Nọvemba, 2025, dịka Onyeisi otu jikọrọ ndị ejije na Naijiria a kpọrọ, 'Actors Guild of Nigeria' (AGN) na Bekee bụ Emeka Rollas si gwa BBC Igbo.
Rollas kwuru sị, "Ọ bụ eziokwu na Odira Nwobu anwụọla. Ọ nwụrụ na mba Saụt Afrịka".
Oge a jụrụ ya ihe butere ọnwụ nwaamadị ahụ, Rollas kwuru na e nweghị onye ma ihe gburu Odira Nwobu.
Ọ gwara anyị na a ga-eme nnyocha 'autopsy' iji chọpụta ihe gburu ya.
O kwuru na ọ ga-ewepụta akwụkwọ ozi zuru oke ma ọ bụrụ na e mechaa nnyocha ahụ.
Emeka Rollas mere ka o doo anya na Odira Nwobu na mmadụ asatọ ndị ọzọ na-akwalite ngwaahịa bekee kpọrọ 'influencers' mere njem na mba Saụt Afrịka iji kwalite ngwaahịa ụlọọrụ na-arụ ụlọ obibi.
Foto ikpeazụ Odira tinyere n'akara soshal midia ya

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram
Foto atọ dị n'elu bụ foto ikpeazụ Odira Nwobu tinyere n'aka Instagram n'ụbọchị Sọnde 23 Nọvemba, 2025 tupu ọ nwụọ n'ụbọchị Mọnde 24 Nọvemba, 2025.
Foto a bụ na mba Saụt Afrịka ka Odira Nwobu sere ya.
Onye bụ Odira Nwobu?

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram
A mụrụ Odira Nwobu n'ọnwa Mee 24, 1982, n'Enugwu Steeti. Ọ bụ onye obodo Umubelle dị n'opuru ọchịchị Awka Saụt, Anambra Steet.
Ọ malitere ime ejije ngwangwa ọ gụchara akwụkwọ Sekọndrị. Ejije mbụ o mere bụ 'Joseph the Dreamer'. Ọ gaala n'ihu mee ejije ruru 60 nke gụnyere Goat Lover nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. A maara ya dịka onye ejije ya na-atọ ọchị nke ukwuu.
N'ọnwa Jụlaị 2025, Odira nwere ihe mberede okporoụzọ nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite ikwu na ọ nwụọla.
Ọtụtụ ndị otu ya na-eme ejije kọwara ya dịka onye nwere obi umeala dịka ha na-ezitara ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Ọtụtụ ndị enyi ya gụnyere Dike Osinachi a maara dịka Apama, Odunze Anthony onye e ji Rolex maara nakwa ọtụụ ndị ọzọ ekwuputala mwute ha n'ọnwụ enyi ha nwoke bụ Odira Nwobu.











