Ị mabu ihe iri na abụọ ndị a maka Mr Ibu?

Mr Ibu

Ebe foto si, Real Mr IBU Instagram

N'ụbọchị Satọde ka ozi pụtara banyere ọnwụ nwaamadị a ma ama na-eme ihe ejije mkpaọchị. Lee anya ka ị hụ ụfọdụ ihe ndị ị maghị banyere Mr Ibu.

  • Ezigbo aha ya bụ John Ikechukwu Okafor (Mr Ibu), ọ bụ nwaafọ Nkanu West nke Steeti Enugwu.
  • O nwere ụmụnne mana onye nke a maara nke ọma bụ nwanne ya nwaanyị Queen Chioma Egboh.
  • N’oge nna ya nwụsịrị, ọ gara biri na nke nwanne ya nwoke dị na Sapele bụ ebe ọ nọọrọ na-arụ ụmụ irighiri ọrụ iji nyeere onwe ya aka n’agụmaakwụkwọ ya.
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ College of Education, Yola ma mechaa gbahapụ agụmaakwụkwọ ya n’ihi nsogbu ego. Ka emesịrị, ọ natara ọzụzụ n’ụlọakwụkwọ Institute of Management and Technology, Enugwu.
  • Tupu ya abanye n’ịkpa ndị mmadụ obi ụtọ, ọ bụụrụ onye na-alụ ọgụ ‘Shotokan Karate’ dịka o ruru n’ọkwa ‘black belt’ mgbe ọ ka dị naanị afọ 16.
  • Ọ bụụrụ onye nhazi ejije bụ ‘producer’ tupu ya amalite ime ihe ejije n’onwe ya.

7. O nwere ọmarịcha ụlọ na Steeti Legọs.

8. Ọnọdụ ahụike ya bịara dị njọ n’afọ 2022 nke mere ka afọ ya zaa. O boro ebubo n’oge ahụ na otu n’ime ndị ikwu na ibe ya kwụrụ onye ọrụ ya ụgwọ ka o nye ya nsị n’otu mmemme ọ gara. Ka e mesịrị, o nwetara onwe ya n’otu ụlọọgwụ onye nkịtị nwe.

9. Afọ 13 gara aga Mr Ibu lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Stella-Maris Okafor ma mụta ụmụ atọ nke gụnyere ndị nwoke abụọ bụ Emmanuel na Jay Jay tinyekwara otu nwaanyị bụ Chelsea.

10. E wezuga ụmụ ndị nke ahụ Stella mụtara, Mr Ibu nwekwara ụmụ ndị ọzọ nke gụnyere Jasmine Okafor.

11. Mr Ibu akpaala ike dị egwu n’ime ihe ejije kemgbe ihe karịrị afọ 20 gara aga dịka o sonyere n’ọtụtụ ihe ejije dị iche iche ndị gụnyere Open and Close, Mr Ibu, Sherikoko, Unbreakable, The Album, Desperate Search, Recharge Card, The Eve, Victim of Love, Honeymoon Guy, dgz.

12. Ejije o sonyerela gụnyere 'Hotel De Jordan', 'Agony', 'Rolling Stone', 'FourFourty' dgz.

13. Okafor bụkwa onye ọtụtụ ụlọ ahịa dịka Glo,Gotv jirila ihu ya ree ahịa

14. Ọ nwuru n’ụbọchị Satọde 2 Maachị 2024 dịka o nwechara obi nkụchi bụ ‘Cardiac arrest’.

Gịnị gburu Mr. Ibu?

Mr Ibu

Ebe foto si, Real Mr IBU Instagram

Nkọwa foto, Mr Ibu na-arịa ọrịa kamgbe afọ 2023

Ọ bụghịzi ihe nzuzo na onye ejije a ma ama bụ John Okafor nke e ji Mr Ibu mara nọ na-arịa ọrịa kamgbe afọ 2023.

Nke bụ eziokwu bụ na ọ gbara ihe niile n'anwụ oge ọ rịọrọ ka ọha nyere ya aka n'ọnwa Oktoba afọ 2023.

Oge ahụ, nwada Jasmine gwara BBC Igbo na; 'a mabeghi ihe na-arịa nna m', mana e mechara o kwuo na a wara ya ahụ ihe ruru ugboro ise.

Nke kacha nke bụ na e mechara bee ya otu ụkwụ maka na ọbara ya nọ na-akpụkọ n'akụkụ ahụ ya dị icheiche nke a kpọrọ 'blood clot' na Bekee.

Mana ihe kụwaziri akụ oyibo nsugbe ma dọbie ndụ onye ọkpaọchị ahụ bụ na dịka onyeisi otu ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria, AGN bụ Emeka Rollas siri kwuo; "Ibu nwere obi nkoropu mana ọ lọghachiteghi, ọ bụ ihe mwute mana ọ laala".

Nke a bụ ozi Rollas zipuru iji kwuo na Ibu anwụọla.

BBC Igbo ka na-agba mbọ inweta ezinaụlọ ya mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu eitnyela ọnụ n'ọnwụ dịmkpa ahụ ma kwuo na ihe efularịla ndị Naịjirịa.

Ihe Peter Obi kwuru maka ọnwụ Mr. ibu

Peter Obi na Mr Ibu

Ebe foto si, Peter Obi/Mr IBU

Onye Igbo a ma ama zọrọ ọkwa onyeisiala napati Labour bụ Peter Obi soro tie ezinaụlọ Johan Okafor aka n'obi.

Na mgbasaozi Obi dere n'akara soshal midịa ya, o kwuru na 'ọnwụ ya bụ ihe na-agbawa obi, ọ bụ otu oke osisi na-eme ejije bu ịkpaọchị, obi aṅụrị na obi ụtọ na-ekesasị"

O kwuru na oge Ibu dara ọrịa, o soro kpee ekpere ka ọ gbakee ma nwee olileanya na ọ ga-agbake. N'okwu ya, "ọ bụghị naanọ ndị ọrụ ụ ejije ka ihe fularịrị site n'ọnwụ ya, mana ọ bụ nye obodo niile n'ihi na ndị ejije na-eme mmadụ ịchị ọchị na-enyere anyị inagide oke ebili mmiri anyị na-agabiga na ndụ"

Ihe ndị AGN kwuru maka ọnwụ Mr. Ibu

N'aka nke ha, onyeisioche otu jikọtara ndị na-eme ihe ejije na Naịjirịa ‘Actors Guild of Nigeria’ (AGN) bụ Emeka Rollas ebeela akwa banyere onye otu ha nwụrụ anwụ bụ John Okafor (Mr Ibu) dịka ọ sịrị na “ọnwụ emekwaa ọzọ. A gbaa mbụ ọ tụ n’ogwe, a gbaa abụọ, ọ tụ n’ogwe, ọ bụ naanị ogwe ka apịịrị akụ?”

Ọ kọwara Mr Ibu dịka onye na-eme ihe ọchi nke ukwuu ma bụrụkwa onye agaghị echefu echefu maka nnukwu ntụnye oke ya n’ihe ejijie ‘Nollywood’.

Dịka o siri kwuo “Mr Ibu nwere ọrịa obi nke mere na ọbara anaghị agazu ya ahụ nke ọma, ọ bụkwa ọrịa ahụ mere e ji bee ya ụkwụ ugboro abụọ. N’ụbọchị Satọde, ọnọdụ ya bịara kawanye njọ dịka o nwere obi nkuchi bụ ‘cardiac arrest’ nke mechara bute ọnwụ ya.”

O nyere ndị na-eme ihe ejije ndụmọdụ ka ha were okwu ahụike ha kpọrọ ihe dị oke mkpa iji gbanahụ ịdabanye n’ọnọdụ gbatagbata.

Onyeisiala Tinubu akwala arịrị maka ọnwụ Mr. Ibu

N['otu aka ahụ, ụlọọrụ onyeisiala Tinubu ezipụla akwụkwọ ozi na-akwa arịrị maka ọnwụ onye ọkpaọchị na onye na-eme ejije a ma ama na Nollywood bụ John Okafor nke e ji Mr Ibu mara.

N'ime akwụkwọ ozi ahụ nke onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Ajuri Ngelale binyere aka, ọ kasiri ezinaụlọ Ibu nakwa ụmụ Naịjirịa niile obi.

N'okwu ya; "ana ma akasi ezinaụlọ ndị a na-eme ejije bụ ndị wetara ọtụtụ ọṅụ na obi aṅụrị nye nde kwuru nde ndị Naịjirịa site n'ọchi ha na-akpa."

O kwuru ka ndị mmadụ nwee nkasi obi 'n'ihi na agbanyeghi na ha anwụọla, ha ka dị ndụ site n'ọrụ ha rụrụ bụ ihe ga-echetara ndị mmadụ maka obi aṅụrị ha kesara n'ụwa'.

Onyeisiala tikwara ndị otu Actors Guild of Nigeria AGN aka n'obi ma kpee ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndọkwa.

Mr. Ibu: Nwamadị a bụ ọkaibe n'ime ihe ejije anwụọla

Ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na Legọs na Satọde 2 Maachị 2024

Ebe foto si, Mr. Ibu/Instagram

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ na-efegharị na mgbede Satọde a bụ na ome ihe nkiri a ma ama bụ John Okafor e ji Mr. Ibu maara anwụọla.

Otu onye bụ enyi ndị ezinaụlọ Mazzị Okafor na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo nke a mana ezinaụlọ ya ekwupụtabeghi ọnwụ ya.

O kwuru na Mr. Ibu nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Legọs bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ n’ụkwụ e bere ya n’ọnwa Nọvemba afọ 2023.

Otu onye ọzọ na-eme ihe ejije gwakwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu na Mr. Ibu anwụọla.

Nwa ya nwaanyị bụ Chioma Jasmine Okafor depụtara ihe n’akara Whatsapp status ya n’elekere abụọ nke ehihie, nke gosiri eserese obi mgbawa (broken heart emoji), mana o mechara wepụ ya.

BBC Igbo kpọtụụrụ nwa ya bụ Jasmine n’ekwentị mana ọ zaghị ya ruo mgbe akụkọ a pụtara.

A kpọkwara onyeisi ndị na-eme ihe ejije na Naịjirịa 'Actors Guild of Nigeria' bụ Emeka Rollas mana ọ zaghị.

Cheta na Mr. Ibu dara n'ute ọrịa n'afọ gara aga nke mere e jiri bepu ta otu ụkwụ bụ n'ụlọọgwụ bụkwanụ ebe ọ nọ ruo ugbua ọ nwụrụ.