Mr Ibu Health Condition: "Ana m ekele Chineke na m ka dị ndụ taa - Mr. Ibu

Aha onyonyo, Mr Ibu on sick bed: "Ana m ekele Chineke na m ka dị ndụ taa - Mr. Ibu

John Okafor na-eme ihe nkiri Nollywood e ji Mr Ibu maara akọwaala ihe ọ gabigara n'ute ọrịa ma kelee Chineke na ọ gbakeela.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ibu sị na ọ kaara ịnwụ n'ute ọrịa kama na ọ bụ Chineke zọrọ ya ndụ.

N'okwu ya "Ihe m gabigara n'ute ọrịa, ọ bụrụ n'ọnwụ, mmadụ anwụchaala mana Chineke ekweghi ka ọ dị etu ahụ."

Ibu sị ka mmadụ atụkwasịla obi n'ebe mmadụ ibe ya nọ kama ka ọ bụrụ n'ebe Chineke nọ maka na ọ bụ ya zọrọ ndụ ya.

Ibu bụ a ma ama n'ịkpaọchị mere ihe e jiri maara ya dịka ọ kọwara na ụdịrị ikuku ahụ si n'ike ya na-apụta mgbe ọ nọ n'ute ọrịa dịka ebe a tụrụ ogbunigwe, na isi ya na-emebi ikuku dịka akwa rere ere.

Ọ gakwara n'ihu kelee nwunye ya, ezinaụlọ ya nakwa ndị enyi bịara leta ya n'ute ọrịa ma sị na ọ maghị na ndị mmadụ si etu ahụ hụụ ya n'anya.

Nwunye ya bụ Stella-Maris Okafor mere ka o doo ewu na ọkụkọ anya na o nweghi mgbe ha sị ka ndị mmadụ bịa tụkọtara ha ego maka ọnọdụ ahụike di ya dịka akụkọ si fegharịa na soshal midia.

Ọ sị na ndị enyi Mr. Ibu nwere agba n'ebe dị iche iche bịara nyere ha aka site n'obi ọcha ha na ọ bụghị na ha rịọrọ arịrịọ.

Stella-Maris gakwara n'ihu kelee ndị enyi nakwa ndị ọrụ Mr. Ibu maka inyere ha aka n'ụzọ dị iche iche.

Cheta na akụkọ banyere ọrịa Mr. Ibu wuru ewu na soshal midia n'ọnwa gara aga, nke mere ndị mmadụ ji na-asị na ọ kpọrọ oku ka a tụọrọ ye ego.

Onye bu Mr ibu?

  • Ezi aha ya bụ John Ikechukwu Okafor mana e ji 'Mr Ibu' bụ agwa o mere n'ihe onyonyo wuru ewu n'afọ 2004 a kpọrọ 'Mr Ibu' were mara ya.
  • Onye Eziokwu dị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-West n'Enugwu steeti, John Okafor bụ ọkpachi e ji ime iberibe mara.
  • Ejije o sonyerela gụnyere 'Hotel De Jordan', 'Agony', 'Rolling Stone', 'FourFourty' dgz.
  • Okafor bụkwa onye ọtụtụ ụlọ ahịa dịka Glo,Gotv jirila ihu ya ree ahịa
  • Okafor lụrụ nwaanyị ma jidekwa ụmụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: