Is Osinachi Husband a pastor: Dị Osinachi Nwachukwu ọ bụ ụkọchukwu?

Peter Nwachukwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu

Ndị mmadụ na-ajụ onye bụ Peter Nwachukwu kamgbe ọnwụ nwunye ya wuwara na soshial midịa bụ Osinachi Nwachukwu, onye oti egwu a ma ama.

Kamgbe Epreelu 9, 2022 ka aha Peter ji ewu dịka akụkọ ọnwụ nwunye ya bụ Osinachi Nwachukwu pụtachara n'elu soshal midia.

Kama nne Osinachi Nwachukwu zara ajụjụ ụfọdụ na-ajụ ma di nwa ya ọ bụ 'Pastor'?

Ọ zara sị na ọ bụ 'Pastor' na nghọta nke ya.

Ọtụtụ ndị ma di na nwunye a tụmadị ọgụ egwu Frank Edwards ama ama pụtakwara na-ekwupụta na ọ bụ aka ike Peter Nwachukwu ji eso nwunye ya butere ọnwụ nwunye ya.

Ka ọ dị ugbua ndị uweojii Naịjirịa anwụchiela Peter Nwachukwu onye nke ha si na ha na-enyocha maka ebubo mmekpa ahụ ọ na-emekpa nwunye ya, ọtụtụ mmadụ gụnyere ezinụlọ Osinachi boro ya tupu nwunye ya anwụọ.

Peter Nwachukwu, di Osinachukwu otiegwu guru; Ekwueme'

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook

Nkọwa foto, Peter Nwachukwu, di Osinachukwu otiegwu guru; Ekwueme'

Onye bụ Peter Nwachukwu?

  • Peter Nwachukwu bụ di Osinachi Nwachukwu, ọgụ egwu egwu ama ama ụwa na-akwara arịrị ugbua maka etu o si nwụ nso nso a.
  • Nwachukwu bụ onye ụka na-aka ụka na Dunamis International Gospel Centre mabụrụkwa onye na-agbasa oziọma n'ụlọụka ahụ.
  • Ọ bụ onye Ụboma dị n'Ukpor dị n'okpuruọchịchị Nnewi South, Anambra state dịka Igwe Ụkpọr bụ dọkịta Felix Onyimadu si kwu.
  • Igwe Ukpor gwara BBC Igbo na ezigbo aha nna Peter Nwachukwu bụ Okekenwa.
  • O kwuru na ọ maghị ọtụtụ ihe gbasara Nwachukwu makana nwa amadi ahụ edenyeghị aha n'akwụkwọ ndị ụmụ nna nke o ji esonye n'ihe ha na-eme.
  • Peter Nwachukwu hụrụ nwunye ya n'ụlọụka ebe ọ ga-agụ egwụ ma mechaa lụwa ya dịka ejima Osinachi na nne ya si kọrọ BBC Igbo.
Peter Nwachukwu Facebook

Ebe foto si, Peter Nwachukwu Facebook

Nkọwa foto, Peter Nwachukwukwu nọ n'akụkụ foto ụkọchukwu ya Paul Enenche na nwunye ya.

Ihe mere aha Osinachi Nwachukwu ji ewu ewu

Aha nwada Osinachi Nwachukwu onye gụrụ 'Ekwueme' na-akpọtụ ebe nile na soshal midia kemgbe ụbọchị Satọde 9 Eprel, 2022 mgbe akụkọ pụtara na ọ nwụọla.

Hyacinth Ogbu bụ onye nchịkọta egwu otu 'Glorious singers' bụ ebe Osinachi na ejima ya bụ Amarachi Eze malitere iti egwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu.

Ogbu sị na ọ bụ ihe mwute nye ndị otu ha nakwa ezinaụlọ Nwachukwu na Madu maka akụkọ banyere ọnwụ Osinachi.

Osinachi Nwachukwu na-eti egwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu

Nwachukwu, onye gụrụ egwu ọtụtụ ndị ụka kraịst ma bụ "Ekwueme" bụ onye egwu ya na-amasị ma na-akpalite mmụọ ndị mmadụ n'ụzọ dị iche iche.

Ndị mmadụ na-agba akaebe etu egwu ya si eme ka ha na-echee echiche maka ndụ ha na mmekọrịta ha na Chukwu kere ha.

Ndị maara Nwachukwu kọwara ya ka dịka ezigbo mmadụ nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anọ ọkụ n'obi.

Ihe di ya sara BBC Igbo:

Tupu ndị uweojii anwuchie Peter Nwachukwu bụ di Osinachi BBC Igbo gbara mbọ ịnụta olu di ya site n'izigara ya ozi ma kpọọkwa ya.

O gosiri na ọ gụrụ ozi ndị ahụ mana ọ zachịghaghị.