Osinachi Nwachukwu: 'N'ọnụ ndị mmadụ ka m nụrụ na Osinachị anwụọla, o ruru ụbọchị olemole tupu Peter agwa m' - Oriakụ Madu nne Osinachi Nwachukwu

Akụkọ ọhụrụ apụtala n’okwu ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ onye otiegwu ụka a ma ama lara mmụọ n’ụbọchị Fraịde bụ ụbọchị asatọ n’ọnwa Eprel, 2022 n’Abuja.
Nne Osinachi Nwachukwu, ejima ya na nwanne ya nwaanyị ezipụtala ozi ịtụnanya banyere ọnọdụ alụmdinanwunye Osinachi na di ya bụ Peter.
Na mkparịtaụka a, ha kọwara etu mmiri si baa n’ọpịọ ụgbọgọrọ.
Ejima Osinachi bụ Amarachi Madu ji anya mmịrị akwa boo ebubo etu nwamadị Peter si na-akpagbu ma na-emegbu ejima ya bụ Osinachi.

Ebe foto si, Screen shot
Ọ kọwara na Peter anaghị ekwe Osinachi mesapụ ahụ n’ụlọ nakwa n’ezi.
Amarachi kwuru na o teela ha siri na-ahụ mmegbu nwanne ha n’aka di ya.
“Nwoke a bịara dịka ezigbo mmadụ mana anyị amaghị na ọbụghị ihe o gosiri anyị ka ọ bụ n’ezie”
Nwanne Osinachi nke tọrọ ya bụ Favour Madu gbara ama ebubo ndị a nke ejima Osinachi boro ma kwuo na nwanne ha tara oke ahụhụ n’aka di ya nke ha niile gbara mbọ ịhụ na ọnọdụ kwụsịrị.
Nwaane ya kwukwara "Di ya anaghị ekwe ya hụ ndị be anyị, ọ naghị ekwe anyị bịaruo ezinụlọ ha nso"
Nne Osinachi Nwachukwu boro ebubo kwuo na Peter ekweghị ya hụ ụmụ ụmụ ya bụ ụmụ Osinachi ruo afọ asatọ nke bụ na e kweghị ya bịa ọmụgwọ lete ụmụ anọ Osinachi na di ya mụrụ.
Ha bokwara ebubo na di Osinachi na-anapụ ya ego ndị na-akpọ ya oku ịgụ egwu na-enye ya

Ebe foto si, Osinachi Nwachukwu Singing Ministry Int’l/Facebook
N’ihe onyonyo a, ndị be Osinachi gosiri iwe ha ma gosi etu obi siri gbawa ha dịka a na-ebo ebubo n’aka di Osinachi nọ n’ọnwụ ya.
Ezinaụlọ Osinachi kwuru na ha na-achọ ikpe ziri ezi n'okwu etu ọnwụ ya siri gaa.
Onye bụ Osinachi Nwachukwu?
Osinachi Nwachukwu bụ onye otiegwu ụka ọtụtụ ndị mmadụ na gburugburu Naịjirịa ma agbanyeghị na ọ na-eji asụsụ Igbo agụrụ chi ya egwu.
Ihe ndị dị mkpa ị kwesịrị ima maka ya gunyere:
- Egwu bụpụtara ya ka ụwa mara ya bụ 'Ekwueme' nke ya na Prospa Ochimana gbakọrọ aka gụọ n'afọ 2019, ọdọ egwu Youtube gosiri na ndị mmadụ e kịrela egwu ahụ ugboro nde iri asaa na otu.
- Ya na ụkọchukwu Abuja a ma ama bụ Paul Enenche gụkọkwara "Nara Ekele" bụ egwu na-ewu ewu n'ụka
- Nwaada a na-ejikarị asụsụ Igbo agụ egwu ya dịka ọgụọla ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere nke o wepụtara ihe onyonyo ya nsonso a ọ kpọrọ 'Ike mo'

- Nwachukwu bụ ejima, ejima ya bụ Amarachi Eze na-agụkwa egwu
- Ọ bụ onye Isuochi dị n'Abia Steetị ma lụọ Peter Osinachi bụ onye Nnewi South dị n'Anambra Steetị.
- Ha mụtara ụmụ anọ.

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook
Ihe di ya sara BBC Igbo:
Tupu ndị uweojii anwuchie Peter Nwachukwu bụ di Osinachi BBC Igbo gbara mbọ ịnụta olu di ya site n'izigara ya ozi ma kpọọkwa ya.
O gosiri na ọ gụrụ ozi ndị ahụ mana ọ zachịghaghị.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Ihe m hụrụ ebe ọkụ gbara nwaanyị na nwanne ya nwoke- Onyeisi nche
- Etu aka si kpara nwoke a sị ji ọkụ kpọgbuo nwunye ya na ọgọ ya nwoke
- Etu e si gbuo ihe ruru mmadụ 26 n'obodo Ezza, Ebonyi Steeti
- Ana m ekele Chineke na m ka dị ndụ taa - Mr. Ibu
- Etu ọkụ ihe mberede si tagbuo ndị ‘sister' Katọlik abụọ na ndị ọzọ n’Anambra

