Chinyere Ogudoro: Ihe m hụrụ ebe a sị e sunyere ọkụ gbara nwaanyị na nwanne ya nwoke - Onye nche

Aha onyonyo, Ihe m hụrụ ebe ọkụ gbara nwaanyị na nnanne ya nwoke- Onye nche

Onyeisi nche ụlọ hụrụ ebe a sị e sunyere ọkụ nke gbara nwaanyị na nwanne ya nwoke akọwaala ihe ọ hụrụ dịka ya bụ ihe mere n'Abule-Ado dị na Legọs na nsonso a.

Ọ gwara BBC Igbo na o nwere onye hụrụ nwoke a bi n'ụlọ ahụ ka ọ gbachiri ọnụama ụlọ ahụ gawara mkpa ya.

Ya na ndị agbata obi gbatara dịka ha hụrụ ka ọkụ na-agba, inye aka menyụọ ọkụ were hụ nwanne nwaanyị ụlọ ya na-agba ọkụ bụ Ifeanyị Dimkpa ka o bu ọkụ n'ahụ gbapụta n'ime ọkụ.

Ọ kọwara na Ifeanyi binyeburu nwanne ya nwaanyị bụ Chinyere Ogudoro, onye si mba Scotland lọta Naịjirịa ọhụrụ n'ezinaụlọ ahụ tupu o nweta ọrụ were pụọ.

Ọ kọwara na ịhụ ya bụ ihe dịka afọ abụọ ya hụrụ Ifeanyị anya ikpeazụ tupu ọkụ ọgbụgba ahụ dọtara ha n'ụlọ ahụ.

Ifeanyị gwara ha na nwanne ya nwaanyị na di ya nwere nghọtahịe n'abali tupu ha alaba ụra.

Oge ha tetera n'ime abalị ha hụrụ na ahụ ha dere dịka a wụrụ ha ihe dịka mmiri.

Onye bụ Chinyere Ogudoro?

Edna Durueke bụ nwanne nne Chinyere Ogudoro, onye si mba Scotland lọta Naịjirịa ọhụrụ tupu o zute ọnwụ ya, kwuru na Ogudoro bụ nwaanyị ọkwa ya gbagotere n'ụlọakụ Naịjirịa tupu ọ gawa mba ofesi.

Ndị uweojii nwụchiri di ya bụ Ben Ogudoro(a na-enyocha munyere ọkụ ahụ) kwuru na Chinyere Ogudoro bu ụzọ nwụọ site n'ọkụ ahụ, ebe nwanne ya nwoke nwụrụ n'ụlọọgwụ.

A mụrụ Chinyere na nwanne ya nwoke ahụ n'ime ezinaụlọ mmadụ ise gụnyere ụmụnwaanyị anọ na otu nwoke.

Ọ dị afọ iri anọ na asatọ ebe nwanne ya nwoke dị afọ iri atọ na otu.

Chinyere mụụrụ di ya ahụ ụmụ anọ ebe nwanne ya ahụ ka lụchapụrụ nwunye n'ọnwa Mee afọ 2021.

Ihe mere Chinyere Ogudoro ka ji ewu

N'ụbọchị Sọnde, Eprel 3 2022, ka ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ha anwụchiela otu nwoke a sị mụnyere nwunye ya na nwanne nwunye ya nke nwoke ọkụ na ndụ.

Ihe a mere na mpaghara Abule-Ado dị na Legọs, n'abalị dịka nwaanyị ahụ aha ya bụ Chinyere Ogudoro na nwanne ya nwoke bụ Ifeanyi Joseph Njokure na-arahụ ụra.

BBC Igbo chọgara ezinụlọ ihe a metụtara iji nụ n'ọnụ ha etu ya bụ mkpamkpa ọjọọ si kpaa. Lee ihe ha kwuru ebe a:"Di m gara ibụlata nwanne ya nwaanyị ma bụrụ onye e ji ọkụ gbagbuo"

Muna Dimkpa, bụ nwunye Ifeanyi onye larala mmụọ, kọọrọ anyi na di ya gara ọdọụgbọelu Legọs n'ụbọchị Satọde ịga bulata nwanne ya nwaanyị ahụ bụ Chinyere onye si mba ofesi lọbata, mana ozi ọzọ ọ nụrụ bụ na ọkụ gbagburu di ya.