"Di m gara ibụlata nwanne ya nwaanyị ma bụrụ onye e ji ọkụ gbagbuo"

Aha onyonyo, ‘Etu di m si gaa ibụlata nwanne ya nwaanyị ma bụrụ onye e ji ọkụ gbagbuo’

N'ụbọchị Sọnde, Eprel 3 2022, ka ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ha anwụchiela otu nwoke a sị mụnyere nwunye ya na nwanne nwunye ya nke nwoke ọkụ na ndụ.

Ihe a mere na mpaghara Abule-Ado dị na Legọs, n'abalị dịka nwaanyị ahụ aha ya bụ Chinyere Ogudoro na nwanne ya nwoke bụ Ifeanyi Joseph Njokure na-arahụ ụra.

BBC Igbo chọgara ezinụlọ ihe a metụtara iji nụ n'ọnụ ha etu ya bụ mkpamkpa ọjọọ si kpaa.

Muna Dimkpa, bụ nwunye Ifeanyi onye larala mmụọ, kọọrọ anyi na di ya gara ọdọụgbọelu Legọs n'ụbọchị Satọde ịga bulata nwanne ya nwaanyị ahụ bụ Chinyere onye si mba ofesi lọbata, mana ozi ọzọ ọ nụrụ bụ na ọkụ gbagburu di ya.

Ihe ndị ezinụlọ kwuru gbasara ihe a merenụ

Aha nwoke a ndị uweojii boro ebubo na ọ gbara nwunye ya na ọgọ ya nwoke bụ Ben Ogudoro; aha nwunye ya bụ nwụrụ anwụ bụ Chinyere, ebe aha nwanne nwunye lakwara mmụọ bụ Ifeanyi.

Ifeanyi dị afọ iri atọ na otu, dịka ndị uweojii si kwuo; ọ lụọla nwaanyị mụta otu nwa ọhụrụ.

Chinyere n'onwe ya bi obodo oyibo ya na ụmụ ya, ebe di ya bụ Ben bi n'Abule-Ado, Legọs.

Ọ bụ n'otu ụbọchị ahụ Chinyere si obodo oyibo lọta ileta di ya ka o zutere ọnwụ ya.

Edna Durueke bụ nwanne nne Chinyere Ogudoro gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachị tụrụ ya n’anya.

“Ben Ogudoro eteela o ji aka ike eso nwanne anyị nwaanyị a nwurula ugbua site n'ọkụ ọgbụgba," Edna Durueke kwuru.

Mana Edna amaghị kpọmkwem ihe kpataziri esemokwu nke ruru n'ọnwụ mmadụ.

Ihe ndị ọrụ nchekwa Abule-Ado kwuru gbasara ya

Onyeisi ndị ọrụ nchekwa mpaghara Abule-Ado kọwakwara etu ha si chọpụta ya bụ ihe n'ụbọchị ahụ o mere.

O kwuru na ha hụrụ anwụrụ ọkụ si n'ụlọ ahụ apụta n'ihe dịka elekere iri n'otu nke abali, ha wee bịaruo nso ịmata ebe ọkụ ahu si apụta.

Mgbe ha bịarutere nso, ha hụrụ Ifeanyi (nwanne Chinyere) ka o si n'ọkụ ahu gbapụta ma na-eti mkpu na ọ maghị ihe mere ogo ya nwoke ji achọ ịwepụ ndụ ya na nwanne ya nwaanyị.

"Anyị buuru Ifeanyi gawa ụlọọgwu, mana e gburu oge tupu ọ malite ịnata ọgwụgwọ, anyị na-eche na nke a so n'ihe mere o ji mechaa kubie," onye nche ahụ kwuru.

O kwukwara na ndị nche hụrụ ka Ben Ogudoro si n'ime ụlọ ahụ na-enwu ọkụ gbaputa n'ime ụlọ ahụ na-eti mkpu.

"Ọ bụ mgbe anyị nụrụ ihe niile Ifeanyi kwuru oge ọ ka dị ndụ ka anyị mechara gwa ndiị uweojii ha wee nwuchie ya (Ben Ogudoro).”

Gini ga-emezi ugbua?

Onyeisi ndị nche Abule-Ado kwuru na ya ewerela ihe niile gbasara ọdachị a tinye n'aka ndị uweojii ka ha metọpụzie nnyocha dị na ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin sị na ha amalitela nnyocha ha.

O kwukwara na ihe niile nwa okorobịa ahụ kwuru tupu ọ nwụọ "nọ n'ime igwe okwu nchekwa 'recorder'".