Nwokoroọbịa gburu nwoke a n'Ihitte/Uboma zutere ọnwụ ya n'aka ndị ntoroọbịa obodo

Njinji jiri n'obodo Umuawuchi dị n'Ihitte/Uboma nke Imo Steetị bụ ebe e gburu otu nwokoroọbịa e kwuru si n'ụlọmkpọrọ pụta na nso nso a.
Akụkọ sị na nwokoroọbịa a gburu otu nwoke, merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma gbaa ụlọ otu nwaanyị ọkụ nke mere ndị ntoroọbịa ji tụọ ụtụ aka ma kụgbuo ya.
Otu onye si n'obodo ahụ bụ Fidelis Odire kọwaara onye ntaakụkọ BBC Igbo etu ihe niile a si mee.
Ọ sị na nwokorọbịa a kpọrọ ThankGod Osuagwu si n'ụlọmkpọrọ pụta mụnyere ụlọ nwaanyị di ya nwụrụ anwụ bụ Amarachi Osuagwu ọkụ.

Nwunye di nwaanyị a bụ Cordelia Osuagwu jụrụ ThankGod ihe mere o ji kpaa ụdị agwa a, ThankGod buuru mma gbuwa nwaanyị a isi.
Ọ kwụsịghị ebe ahụ, dịka ThankGod gara n'ụlọ dị nso ma were egbe gbajie otu ụkọchukwu a kpọrọ Daniel Nwokonkwo ụkwụ.

Ọ gaara n'ihu na-aba mba na ọ ga-emesi ndị niile aka ha dị n'ihe mere o ji gaa mkpọrọ ike.
Nwoke ọzọ bụ Dan Okafor pụtara ka ọ maara ihe na-eme mana ThankGod eburu mma gbukasịa ya ahụ nke butere ọnwụ ya.
Nke a meziri ndị ntoroọbịa jiri gbakọta aka nwuchie ThankGod ma mụnye ya ọkụ dịka onyeisi ndị nze obodo si kwuo.
Onyeisioche Ihitte/Uboma bụ Chike Olemgbe si n'obodo ahụ ezigaara ezinaụlọ nwoke a egburu ozi iti aka n'obi.

O kwere nkwa na ọchịchị ga-agba mbọ ịhụ na ụdịrị ihe emeghi ọzọ n'obodo.
Onyeze obodo a bụ Eze Cyril Okafor ekweghi etinye ọnụ n'okwu a ma sị na a kọwabereghi ya ihe mere.
Ndị ntoroọbịa na-achọghị ka a kpọọ aha ha sị na ndị obodo amaliteghi ọsịsọ na-eleba anya na ndị na-aṅụ ma na-ere anwụrụike anya.
Ha sị na e kwesịrị ileba anya ma kwụsị ndị mmadụ ire anwụrụ maọbụ ọgwụ ike n'obodo ha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:








