Elizabeth Ndubisi Chukwu: Ndị mmadụ na-ajụ ihe gburu nwaanyị a gara njem na South Africa

Ebe foto si, Facebook/Chartered Insurance Institute of Nigeria
Akụkọ na-ewu na soshal midia bụ na nwa afọ Naijiria bụ Uju Ndubisi Chukwu alaala mmụọ n'ime ụlọ ndina akpọrọ "Emperor Palace Hotel, Casino and Convention Centre" nke dị na Johannesburg, Saut Afrika..
Mana ihe maọbụ onye gburu ya ka gbara onye ukwu na onye nta gharịị.
Uju Ndubisi Chukwu bụ osote onyeisi otu 'Chatered Insurance Institute' nke Naijiria tupu ihe mee ya.
Akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ọ gara ọgbakọ nke ndị otu 'African Insurance Organisation' na mba Saut Afrika ka o zutere ọnwụ ya.
Ndị African Insurance Organisation kwenyere na Ndubisi Chukwu bịara nzukọ ha ma sị na ọnwụ ya tụrụ ha n'anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Chidi Odinkalu, onye bụbu onyeisi 'National Human Rights Commission' kwuru na a hụrụ ozu Ndubisi-Chukwu n'ime ụlọ ndị njem ebe ọ lakpuru n'abali iri na atọ nke ọnwa Juun afọ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ka ọ dị ugbua, amatabeghi ọtu ya bụ arụ siri mee.
Abike Dabiri-Erewa - bụ onye na-ahụ maka ndị Naijiria bi mba ofesi - sị na ihe onyonyo akụrụmgwa CCTV gosiri na onweghi onye bara ime ụlọ ya bụ nwaanyị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ihe Gọọmentị Naijiria kwuru
Dabiri-Erewa sị na gọọmentị ga-eleba ya bụ okwu anya iji chọpụta etu mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
BBC Igbo kpọrọ Abike Dabiri n'akara ekwentị mana ọ zaghị.
Akara ekwentị nke ụlọọrụ nnochite anya mba Saut Afrịka na Naijiria agaghị aga n'ihi na ha anaghị arụ orụ ụbọchị Satọọdee.
Akụkọ na-ewu na Tuwita kwuru na emeela nnyocha nke Bekee kpọrọ 'autopsy', wee chọpụta na ọbụ ntọgbu ka a tọgburu Ndubisi Chukwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ụlọ ndina ahu sị na obi gbawara ha maka ihe mere,ma sịkwa na ha na-eme ihe ha kwesiri ịhu na nyocha ihe mere gara ọfụma dịka ọ dịzị n'aka ndị uweojii.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Mana BBC Igbo achọpụtabeghi eziokwu dị na ya bụ akụkọ.
Anyị ga-esochi akụkọ ọfụma ma hu isi ya. Akụkọ ka na-abịa
Akụkọ ga-amasị gi:









