Cameroon vs Nigeria: Ndị nkwado agbataobi abụọ a agaghị achịsa onwe ya ọchị taa

Kameroon ga-ezute Naịjirịa n'obodo Alexandrịa taata bu ụbọchi nke isii nke ọnwa Julaị.
Ndị otu nkwado Super Eagles nke akpọrọ "Fan Club" egosila obi ụtọ ha n'ebe Super Eagles nọ site na izukọta n'Alexadrịa Egypt were egwu n'ọṅụ n aekwuputa na Naijiria ga enwe mmeri.
Kemgbe afọ 2000, Kameroon emeribeghị Naịjirịa n'asọmpi bọọlụ ọbụla.
Na nzute 22 mba abụọ a bụ agbatobi ọ bụ sọsọ ugboro anọ ka Kameroon nwetere mmeri.
Mmeri atọ n'ime anọ ahu bụkwa na mgbacha Iko Mba Afịrịka.
Dịka Madagaska ji okpu abụọ chara ọku merie Naịjirịa n'agba nke mbụ, ha ga-achọ iji asọmpi a hicha ihere.
Kameroon n'onwe ha nwetere nhatanha n'asọmpi ha na mba Bene gbara agbanyeghị na ọ bu ha kacha gbaa na ya bụ asọmpị.
N'afọ a, ha agbara asọmpi asaa. N'ime ha, onweghi nke emeriri ha.
Ndị nwereike pụta n'ọgbọ
- Naịjirịa: Akpeyi; Awaziem, Omeruo, Balogun, Aina; Etebo, Ndidi; Simon, Iwobi, Musa; Ighalo
- Kameroon: Onana; Fai, Ngadeu-Ngadjui, Yaya, Oyongo; Zambo Anguissa, Mandjeck, N'Jie; Choupo-Moting; Bahoken, Toko Ekambi
Ka osina dị, ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị nwere olilanya na asọmụmpị Naịjirịa na Kameroon a ga-adị ezigbote ọkụ.
Asọmpị a ga-eso n'elekere ise nke mgbede.
Ndị na-akwado Naịjirịa jukwara n'ọgbo n'Ijipt iji nye ha nkwado pụrụ iche.




Lee kwa etu ndị Super Eagles ji na-ekele ndị Naịjirịa
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post















