Super Falcons: Naịjirịa nọzi na kwara pụ kwara pụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu Jamini ji ọkpụ goolu atọ gbanye ndị Super Falcons Naịjirịa ọgbaghara n'isi mgbe ha zutere onwe ha taa.
Ọ bụ na nkeji iri na itoolu ka Alexandra Popp onye ndu ụmụnwanyi Jamani jiri otu goolu were mepee akwụkwọ na asọmpi a.
Ka nkeji asatọ gachara ka enyere Jamanị Penaltị mgbe ogbuopị jiri igwe VAR were huta na ọ bu penalty n'ezie.
Na nkeji 26 ọzọ Sara Dabritz nke Jamini gbara penaltị ahu were ziga onye nche boolu Naịjirịa bụ Chiamaka Nnaedozie gawa Aba kama boolu gawara Owerri.
Dịka ndị super Falcons mere ka ha etetela n'ura, Lea Scụller nke Jamanị were kwa goolụ ọzọ na nkeji 81 were chụpụ ha kpam kpam.
Na agbanyeghị mmeri a, ndị Super Falcons gbaliri ike ha ma gosị kwa ndị Naijirịa na olileanya dị maka asọmpi iko mba ụwa nke 2023.








