Super Falcons agafeela agba nke abụọ ka Thailand tunyere ha azụ

Ebe foto si, Daniela Porcelli
Super Falcons nke Naịjirịa ga-ezute otu egwueregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Jamanị n'obodo Grenoble ụbọchị Satọde n'agba nke abụọ asọmpị Bekee kpọrọ 2019 "Women's World Cup".
Super Falcons tozuru iso n'agba nke abụọ ka Chile ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Thailand, nke nyere ya ohere ịbanye ụgbọ dịka ha turu ugo ọkamma na ndị ikpeazu.
Ọ bụ na Monde bụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Juun ka Falcons sụrụ mpị nke ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa na-asị na VAR napụrụ ha mana omere abalị atọ iji chọpụta ka ha a ga-etuozu ịga agba nke abụọ.
Dịka agbachaala asọmpi niile dị n'agba nke mbụ, Falcons pụtara dịka nke kachasị mee ọfụma na ndị achịtaghị aja nke ga-enye ohere itozu gaa agba nke abụọ.
Ọ bụ otu egwuregwu atọ na-agafe dịka nke ka mma na ndị ikpeazụ.
Kameroon bụ mba ọzọ n'Afịrịka ritere uru a ụnyaahụ.
Dịka ha mere ụfọma n'asọmpị ha na Frans, ọtụtụ ndị na-akwado ha nwere olilanya na ha ga-agba mbọ na agna nke abụọ a.








