Nigeria vs France: Fransị agbarala Naịjirịa ụgbọ nwamkpi?

Ebe foto si, AFP
Ngwongwo eji mara Super Falcons kụwasịrị taa dịka Fransị meriri ha n'asọmpi Ikombaụwa ụmụnwaanyị.
Ọ bụ ihe ịtụ anya mgbe Renard nyere goolu ya na nkeji 79 maka na ọ bụ ugboro abụọ ọ gbara ya bụ penariti.
Nnadozie chetara penariti nke mbụ Renard gbara mana ọ dara iwu nke teknụzụ VAR gosiri eji nye ya ọzọ.
Iwu a ọ dara mekwara na Nnadozie dị afọ 18 rite akwụkwọ edo ebe Ngozi Ebere ritere akwụkwọ ọbara na nkeji 75.
Norway ji kwa goolụ abụọ merie mba Sawụt Koria mgbe ha zutere onwe ha.
Frans pịara Saụt Koria 4:0 ma jirikwa 2:1 merie Norway, nke nyere ha owere ịbụrụ sọsọ ndị gafere agba nke abụọ na "Group A".

Ebe foto si, Ngozi Okobi/Twitter
Naịjirịa na onwe ha agbataghị ihe mgbe ha zutere Norway ji 3:0 sị ha ga nu mụta ọfụma.
Falcons na-eche ugbua ịchọpụta ma ha a ga-alachita ma ha a ga aga ihu n'asọmpi a.
Ogbunigwe agbagbuola mmadụ iri atọ na Borno

Ebe foto si, AFP
Ndị ọrụ gbata gbata na-ekwu ọnụ ọgụgụ mmadu nwụrụ n'ebe ndị omekome atọ gbara ogbunigwe dị ha n'ahụ na Borno Steeti nwereike rịa.
Mmadụ iri atọ nwụrụ n'ihe a mere n'ebe a na-ekiri TV ka ihe ruru mmadụ iri anọ n'asatọ merụrụ ahụ.
Onwebeghị otu sị na ọ bu ha kpara mkpamkpa a.
Ihe Peter Obi gwara Buhari

Ebe foto si, Val Obienyem
"mewe ka ndị isiala India na Saụt Afịrịka!"
Onye kwuru nke a bụ aka chịbụrụ Anambra steeti bụ Peter Obi ka o na-adụ Onyeisiala Buhari ndụmọdụ maka ime ọsịsọ wepụta aha ndi ya na ha ga-arụ ọrụ.
Onye ga-achị Osun steeti?

Ọ bụ n'ụbọchị nke ise nke ọnwa Jụlaị ka a ga-ama onye ga-akwụrụ ka gọvanọ Osun steeti.
Ụlọikpe ukwu bụ Supreme Court ga-ekpebi ikpe dị n'etiti Ademola Adeleke nke PDP na Gboyega Oyetola nke APC maka ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ.












