Arsenal vs Man City: 'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha

Pepe na-agbara Arsenal bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images

Manchester City ji iwe ọnyụpa ha gbara kamgbe izuụka sị ka ha kugbuo ndị Arsenal n'ihu 'nne na nna ha'.

Ha asọghị anya na ha bịara n'ụlọ Arsenal ma jiri ọkpụ goolu atọ characha a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier league.

N'ime nkeji 2 ka Man City malitere tiwe Arsenal manwụ site na goolu Kevin De Bruyne nyere.

A ka-akpụ nke ahụ n'ọnụ mgbe Raheem Sterling mezuru ya goolu abụọ na nkeji 15.

Tupu Arsenal na-ama nke egwu na-akụ nwamadị a bụ Kevin De Bruyne gbakara neetị ọzọ na nkeji 40.

N'agbanyeghi Arsenal nwara ike mana ọ dịka a ga-asị ha bụ 'Oji ọnụ agba egbe'.

Ugbua Arsenal nọ n'ogogo itoolu na tebụlụ Premier league ebe Man City bụ ndị atọ.

Manchester United lara na nta ọnya Everton

Nke a mere Manchester United na Everton jiri were otu ọkpụ goolu gbaa onye lawa onye lawa.

Ebe foto si, Getty Images

Orie gaara ala n'isi Manchester United dịka ha nabatara Everton n'ụlọ ha n'asọmpi Premier League.

Ihe mgbe Man. United si n'aka mgbe onye otu ha bụ Victor Lindelof nyere onwe ha goolu na nkeji 36.

Ngwa ngwa nke a mechara, Everton kwechiri, mee ka ọ raa Man. United ahụ ịzsa goolu ahụ.

Man. United sigidere ọnwụ ruo na nkeji 77 mgbe obere ụzọ neetị mepere site n'aka Mason Greenwood.

Nke a mere Manchester United na Everton jiri were otu ọkpụ goolu gbaa onye lawa onye lawa.

Manchester United alaghachịla n'ogogo nke isii na tebụlụ bụ nke ọtụtụ na-asị na e jiri mara ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: