Standard Liege vs Arsenal: Arsenal ọ na-agbazi okirikiri n'ukwu ose?

Ebe foto si, Getty Images
A ga-asị na Arsenal na-emezi kpọọpịị n'asọmpi ha, dịka ọ bụ ha merie taa echi ha ama afọ n'ala.
Ọ bụ eziokwu na ha a ga-efela n'agba nke abụọ asọmpi Uefa Europa mana ike adịghị ha merie 'obere agụ' Standard Liege.
Ndị Standard Liege bu ụzọ nye ha goolu abụọ na nkeji 47 na 69 site n'aka Samuel Bastien na Selim Amallah.
Mana ha sitere ọnwụ saa goolu abụọ ndị a site n'enyemaka Alexandra Lacazette na Bukayo Saka na nkeji 79 na 81.
Asompi gosiri na 'ihe na-ebe ka na-ebe' n'ebe otu egwuregwu Arsenal nọ. Ajụjụ ndị mmadụ abụrụ 'Kedụ mgbe nke a ga-ebi?'
Punch emeghi njọ ịkpọ Buhari 'Major General' - NUJ

Ebe foto si, Getty Images
Otu jịkọtara ndị ntaakụkọ bụ Nigerian Union of Journalist ekwuola na atụmatụ ndị ntaakụkọ Punch ịkpọ onyesiala Buhari ọchịagha abụghị ihe ọjọọ
N'ozi odekawụkwọ ndị otu a bụ Shuaibu Usman Leman wepụtara, ọ sị ka a hụta nke a dịka ụzọ e ji a nwụchi gọọmentị na ngada dịka iwu si kwadoo.
Ọ sị na ọ dị mma ka e nye ndị ntaakụkọ ohere ịrụ ọrụ ha dite n'ịgbaso ọchịchị dị mma nke gụnyere ịkwụwa aka ọtọ, irube isi n'iwu dgz.
Leman sị na nke a bụghị ịkparị maọbụ ileda gọọmentị anya dịka ọtụtụ ndị si na-eche ya.

Ebe foto si, NUJ
A tụọla ndị ọrụ Inec abụọ mkpọrọ

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe dị na Yola nke ọkaikpe Nathan Musa nọ n'isi ya atụọla ndị ọrụ Inec abụọ mkpọrọ afọ iri anọ na abụọ maka iri aka azụ.
Ụlọikpe a nyere sị EFCC nwụchie onye bụbụ minista mmanụ agbịdị Diezani Allison-Madueke maka inye ndị a nde narị naịra atọ na iri isii na abụọ ka ha mee nrụrụaka na ntuliaka onyeisiala n'afọ 2015.
Ụlọomeiwu ga-enyocha mwakpo ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọomeiwu enyela iwu ka kọmitii ha na-ahụ maka ụlọikpe nyocha mwakpo a sị na ndị DSS wakporo ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Onyeisi kọmiti a bụ sịnetọ Opeyemi Bamidele wepụtara atụmatụ a sịte na ọtụtụ mkpesa ndị mmadụ mere.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Liverpool ji akụkụ anya ha na-akpị Takumi Minamino bụ nwafọ Japan na-agbara Red Bull Salzburg bọọlụ.
Dịrektọ ndị Salzburg bụ Christoph Freund dị na ha Liverpool na-akpata nkata maka orire na ọzụzụ Minamino.
Nkeji
Ọ bụ Ipob na-ekesa akụkọ na e gburu ndịagha - Sagir Musa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa sị na otu ihe onyonyo na-efegharị na intanet gosiri ihe ha sị dịka ebe ndị Boko Haram a na-egbu ndị agha Naịjirịa bụ aka ọrụ Ipob.
Sagir Musa bu ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa sị na ihe onyonyo a bụ arụrụ arụ ma sịkwa na ọbụghị na Naịjirịa ka o mere.
Ihe onyonyo a gosiri ebe ndị dị ka ndị oyi egwu ji ụmụnwoke tupu ha agbagbuo ha.

Ebe foto si, Reuters
N'ime akwụkwọ mgasa ozi o zipụrụ Musa sị: "Ndi agha Naịjirịa na ekwusike na onweghi ihe ọbụla mere dị otu a. Onweghi ihe ọbụla mere dịka igbu ọtụtụ ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị iri nke ọnwa Decemba."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na nyocha ha mere ihe onyonyo a gosiri na ọ bụ arụrụ arụ.
"Ọbụghị na Naịjirịa ka ihe a mere."
Ndị agha Naịjirịa sị ka ndị mmadu gbajọọ ya bụ ihe onyonyo.
BBC Igbo ka na-enyocha ya bụ ihe onyonyo.
Mgbo agbara ịnụta n'ọnụ Ipob amịtaghi mkpụrụ makana ekwenti ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful agaghị.
Ndị Afrịka ga-enwete 'visa' ma ha ruo Naịjirịa

Site n'afọ 2020 gawa, ndị Afrịka niile ga-enwezi ohere ịbata Naịjirịa na-ejighi akwukwọ ikike Bekee kpọrọ 'visa'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru nke a n'Ijipt ka ọ na-ekwu okwu na nzukọ ọ gara maka udo na mmepe mpaghara Afrịka.
Ya bụ Naijirịa bụzi buru akpa gị bịawa ma ịbụru onye Afrịka.

Ndị ọrụ latrik akwụsịla abụbụọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ọkụ latrik bụ nke akpọrọ National Union of Electricity Employees (NUEE) sị na nzukọ ha na gọọmentị nwere ụnyaahụ mịtara mkpụrụ nke mere ha jiri kagbuo abụbụọrụ ha.
Ụlọọrụ ọkụ Ikeja Electric dere ozi a n'akara Twitter ha:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Abụbụọrụ tinyere ọtụtụ mpaghara Naịjirịa n'ọchịchịrị dịka ọkụ latrik nyụru pịnyụ.
N'ozi NUEE zipụrụ n'ụtụtụ a ha sị n'ihe kpatara abụbu ọrụ gunyere:
"Ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik ekweghị ịhụ ma nsogbu anyị nwere kemgbe 2013 ha resịrị ndị nkịtị ulo na-emepụta ọkụ latrik.
"Enwekwara ndi otu anyi ruru mmadụ 2000 a chụrụ n'ọrụ akwụbeghị ụgwọ ikpeazụ."
Ihe ọzọ ha metụtara ọnụ bụ na onwere akụnauba ndị otu ha e were nye ndị a goro ulọ ọrụ na-arụpụta ọku latrik nakwa iwepu ego ezumike ndị ọrụ etu na ezighi ezi.

Ntuliaka mba Briten

Ebe foto si, Reuters
Taa ka ọ ga-akpọtụ na mba Briten, ebe ha ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala ha.
Otu onye n'ime Boris Johnson na Jeremy Corbyn ga-ama onye ga-ewere ọnọdụ ahụ mgbe a gụkọchara vootu.

N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Napoli ejirila Gennaro Gattuso tichie Carlo Ancelotti ha chụrụ n'ọkwa onye nchịkọta.
Ebe Manchester City tetara n'ụra ka ha ji goolu anọ a satara otu, nke Gabriel Jesus nyere atọ n'ime ya, merie Dinamo Zagreb na Champions League.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











