Punch Editorial: Iwu ise ndị ọrụ ntaakụkọ kwesiri iso

Ebe foto si, Getty Images
Okwu ka na-ewu kemgbe ụlọọrụ ntaakụkọ Punch wepụtara edemede ọpụrụiche ha nke Bekee kpọrọ "editorial".
N'ime edemede a ha dọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ maka ọchịchị ya.
Ka ọ dị, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ma edemede ha ọ dabara n'ume ndị ntaakụkọ.
Ide atụmatụ 'editorial' so n'ihe ọpụrụiche ndị ntaakụkọ jiri gosi ebe ha kwụ n'okwu ọbụla.
O nwereike bụru ihe banyere ọchịchị, dịka nke Punch dere, maọbụ ihe ọzọ metụtara ha maọbụ obodo n'etu ọbụla.
N'ọnọdụ a, ihe Punch dere dabara na ejirimara ndị ntaakụkọ.

Ebe foto si, Getty Images
Mana, o nwere usoro ise dịka iwu ụlọ ntaakụkọ ọbụla kwụwara aka ya ọtọ kwesiri iso.
Lee ha ebe a:
1) Eziokwu
Agbanyeghi na o nweghị ka onye ntaakụkọ ga-amara nke bụ eziokwu oge niile, ịchụ ma chọpụta nke bụ eziokwu bụ otu n'ime ihe ntaakụkọ ji aga.
Mgbe niile, ụlọ ntaakụkọ kwesiri ịna-achọ eziokwu ma kwuo ihe niile dị n'akụkọ ha na-ebu.
Oge onye ntaakụkọ agaghị enwetanwụ nke bụ eziokwu n'okwu, o kwesiri ime ka ọha mara n'ime akụkọ ahụ.
2) Nkwụrụ onwe
Onye ntaakụkọ kwesiri ịkwụrụ onye ya n'ozi o na-agbasa.
O kwesighi ịna-arụ ọrụ ya n'ihi gọọmentị, onye ndọrọ ndọrọ maọbụ ulọ ọrụ ọbụla.

3) Iji ọfọ
Akụkọ na-enwekarị ihu abụọ.
Nke bụ eziokwu bụ na ọ dịrị onye ntaakụkọ iwepụta ihu abụọ akụkọ siri mee.
Ihe niile ma ndị niile metụtara akụkọ ahụ kwesiri ịdị na ya.

Ebe foto si, Nigerian Police
4) Inwe ịhụ mmadụ
Onye ntaakụkọ ekwesighi ịkpa arụ maọbụ me ihe ga-emerụ mmadụ maọbụ mụọ ahụ.
Ihe a na-ewepụta n'akụkọ nwereike mebie mmadụ ahụ, nke pụtara na onye ntaakụkọ kwesiri ibu n'uche ihe akụkọ ya nwereike imetụta ndị mmadụ.
5) Ịzara ọnụ n'ihu ọha
Otu ụzọ eji amata na onye ntaakụkọ kwụbara aka ya ọtọ bụ na ọha nwere ohere ịgba ya ajụjụ.
Ya bụrụ na onye ntaakụkọ daa mba, okwesiri ka o mesie ya ma kọwara ọha ihe mere ma rịọ mgbaghara.
Onye ntaakụkọ kwesiri ịge ọha ntị, ma dee ihe ọha kwuru na agbanweghi ihe ọbụla.
Ihe a dum bụ ihe eji ama ụlọ ọrụ ntaakụkọ na-eme ihe ha kwesiri ime.









