Fake News: Ezigbo ọrụ ntaaakụkọ bụ iwepụta akụkọ dịka o si mee- Ndị ọnụ eru n'okwu

Chiagozie Nwonwu, Clara Chinwe Okoro na Immanuel James Ibe-Anyanwu
Nkọwa foto, Chiagozie Nwonwu, Clara Chinwe Okoro na Immanuel James Ibe-Anyanwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ọnụ na-eru n'okwu gbasara ntaakụkọ na mgbasaozi tinyere ọnụ na mkparịụka BBC banyere ọrụ ha nke isiokwu ya bụ "Akụkọ Ụgha, BBC Igbo na Ndigbo" ekwuola mkpa ọ dị ikwu eziokwu n'agbanyeghị onye ọ metụtara.

Ndị tinyere uche n'okwu a bụ: Blossom Ozurumba, bụ onye na-ede akwụkwọ ma na-edekwara ndị 'Wikipedia' edemede; Clara Chinwe bụ onye ntaakụkọ nakwa onye nwe Brand World Media na Immanuel James Ibe-Anyanwu bụkwa onye na-ede akwụkwọ.

Clara Chinwe Okoro
Nkọwa foto, Clara Chinwe Okoro

Lee okwu ndị kgbara ọkpụụkpụ ha tụpụtara:

Gini mere BBC Igbo ji ebu akụkọ ọjọọ maka ihe gbasatara Ndigbo?

Clara Nwankwo: Anyị bụ ndị mgbasa ozi, anyi na akọ akụkọ otu o si mee. Ihe ọjọo na-eme, ihe ọma na-emekwa. Ọru anyi bụ ịkọ ya dika o si we di.

Onye ntaakụkọ BBC: Iji maa atụ: Ihe BBC gosiri maka Mee 30th bụ ihe anyi hụrụ. Anyi gara na isiobodo steeti dị n'ala Igbo na ahia na ebe ndị ọzọ ndị mmadu na-agbakọ were kọpụta ihe anyị hụrụ.

Anyi mekwara ihe onyonyo('Live Video) anyi kpọrọ "Ka o si aga" nke anyi jiri gosi ndi uwa ka ala Igbo si eme mmemme ncheta Biafra.

Kedu etu a ga esi mee ka igu akụkọ di mfe na soshal Midia?

Onye ntaakụkọ BBC : Maka na ọ bughi BBC nwe Soshal Midia ndị a, ọ na aka mma onye chọro i gu akụkọ anyi na uju ya, onye ahu ga aga na websịtị anyi were gụọ ya. ọnye ahu ga aga na www.bbcigbo.com ma ọ bụ www.bbc.com/igbo

Kedu ihe BBC na eme maka ikwalite asụsụ Igbo ?

Onye ntaakụkọ BBC: BBC na egosi ihe onyonyo di iche iche i ji kpalite omenala ndi Igbo. ọnye gara na websịtị anyi ga ahụta ihe ndịa.

Gini kpatara ụfodụ mmadu ji achọ okwu ma na ekwu okwu di njọ na sochal midịa?

Blossom Ozurumba: Ụfọdụi ndị bu na ha enweghi ezigbo ọzuzụ, ya mere ha na eji a bia na soshal midia ekwu okwu na adighị nma. Ndi madu nwere ike ikpesara ndi na achikota Facebook na Soshal Midia ndi ozo ka ha lebe ndi na eme ajọ omume a anya ma wepu ha na soshal midia.

Blossom Ozurumba
Nkọwa foto, Blossom Ozurumba

Ked ihe mere enweghi BBC n' Ọwụwa-Anyanwu ?

BBC: Nwayọ nwayọ ka e ji eracha ofe di ọkụ. Ebeọbula BBC nọ ugbua, ihe kacha mkpa bu na anyi na ewetere ụnụ ihe n'eme na ala Igbo .Anyi nwekwara ndị nta akụkọ na steeti nile di na ọdida anyanwu.

Ajụjụ: Kedu ka BBC si agbasa ozi

Ọzịza: BBC agaghị egosi ihe ga emeru obi ndị mmadu, ihe dịka ọbara ma ọ bu ebe egburu madu. BBC ga akọ akụkọ otu o ga esi masi mmadu nile. : Gini mere ndi nta akuko BBC anaghi etinye mmetụta uche ha.

Immanuel James Ibe-Anyanwu: Gini mere ndi nta akuko BBC anaghi etinye mmetụta uche ha?

Onye ntaakụkọ BBC : "Nwa madu emegbuna nwa muo , nwa muo emegbuna nwa madu". Anyi na akwụba aka anyị ọtọ na akọ akụkọ di ka ọ si dị. Onye mee mma BBCIGBO ga akọ ya, ọnye mee njo BBCIGBO ga ako ya di ka o si di.

Immanuel James Ibe-Anyanwu
Nkọwa foto, Immanuel James Ibe-Anyanwu

Leezie ihe ha kwuru n'uju ya n'ihe nkiri dị n'elu:

Akụkọ ga amasi gị :