Arsenal vs Lyon: Ekwe akụọla Arsenal n'isi

Mkhitaryan

Ebe foto si, AFP

Moussa Dembele ji goolu abụọ gbarie ndị Arsenal obi ka ha zutere ịzọ Iko Emirates.

Na Pierre-Emerick Aubameyang nyere otu goolu na nkeji 35 e ji bido bọọlụ azọghị ha n'aka Lyon.

Arsenal nọ na-akpa ike ka goolu mbụ ahụ wụbara na mpio, mana ha amaghị ihe chere ha n'ihu makana Dembele bịara tete n'ụra n'ọkara nke abụọ ma zuo ha ike n'ahụ.

Goolu abụọ nyere Lyon mmeri 2 - 1 ha ji merie, sụbachara na nkeji 66 na nkeji 76.

Gabriel Martinelli Arsenal ka zụrụ azụ chere na ọ gbakpuola goolu mbụ ọ na-enye dịka onye Arsenal ka batara ọhụrụ, mana a gụfuru ya tupu Dembele emewaa ha obi.

Iko Emirates

Ebe foto si, AFP

N'agbanyeghi na ọ bụ asọmpi enyi na enyi, ọ bụ asọmpi ndị otu egwuregwu ndị ụlọọrụ Emirates na-akwado, na-agba kwa afọ.

Ndị Arsenal

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mustafi na ndị otu ya kpudoro ihu n'ala ka obi na-agbawa ha maka mmeri e meriri ha

Ndị otu egwuregwu abụọ a gbachiri nkịtị ka otu nkeji gafee; iji kwanyere Jose Antonio Reyes nwụrụ anwụ n'ọnwa Juun ugwu.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Aubameyang kọwara ihe mere o jiri hụ Arsenal n’anya