Igbo Town Names: Ị ma etu aha ụfọdụ obodo dịka Imerienwe, Dikenafai na ndi ọzọ siri bịa?

Ebe na-egosi Ukpor
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Gịnị mere e jiri gụọ ụfọdụ obodo aha ha na-aza?

Ndị Igbo anaghị agụ aha ka ọ bụrụ na ha gụrụ aha, kama ha na-ama ụma gụọ aha nwere nkọwa na mpụtara

A bịa n'obodo ndị dị n'ala Igbo, ụfọdụ nwetara aha ha site n'aha onye bidoro obodo ahụ, ebe ndị ọzọ nwetere aha ha site n'ihe ha gabigara mgbe gboo.

Mana a bịa n'aha obodo na-aza, ụfọdụ bụ ndị ị ga-aghọta aha ha ozugbo ị nụrụ ya, ebe ndị ọzọ ga-eme ka ị kọọị ọkọ n'isi ma taa aka n'eze tupu ị mara ihe ọ pụtara.

Aha ụfọdụ obodo ndị ahụ:

Ọ bụghị na aha obodo ndị a ga-atọ gị ọchị, kama ọ bụ na o nwereike ịra gị ahụ nghọta dịka onye Igbo, maọbụ gbaa gị gharịị dịka onye esighi obodo ahụ pụta maọbụ mara ihe nwere aha ahụ.

Ọzọkwa bụ na aha obodo ndị a akọwaghị onwe ha dịka ndị ọmụmaatụ, Ụmụọpara, Ụmụoji, Enugwu, nakwa ndị ọzọ dị ka ha.

  • Chokoneze: Ọ dị na mpaghara Ezinihitte dị na Mbaise dị n'Imo steeti. Aha ha si n'obodo abụọ bụ "Ụmụchoko" na "Ụmụeze". E mechaa kpokọọ ya ọnụ.
  • Ndịkelịọnwụ: Ọ dị na mpaghara Orumba Nọt dị n'Anambara steeti. Aha a bụ mkpokọta "ndị" na "Ikeliọnwụ". Nkọwa ya pụtara na e nweghi ike na-egbochi ọnwụ.
  • Ejemekwuru: Nke a bụ aha otu obodo dị n'Ugwuta dị n'Imo steeti. Aha a pụtara na enweghị ụdịrị mmadụ ị gaghị ahụ ma ị garuo obodo ahụ.
  • Dikenafaị: Ọ bụ obodo dị n'Ideatọ dị n'Imo steeti.
  • Imerienwe: Ọ bụ aha a kọwapụtara site na nsọ obodo ahụ na-asọ enwe. Obodo a dị n'Imo steeti.
  • Isuikwuatọ: Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-akpọghie aha obodo a dị n'Abịa steeti (ụfọdụ na-akpọ ya Isi-Ukwu-Atọ).
  • Ekwereazụ: Obodo a dị n'Imo steeti.
  • Abazụ: Ọ bụghịkwa maka azụ dị na mmiri o. Ọ pụtara "anyị na-aba, anyị a na-azụ". Obodo a dị n'Ọgwa dị n'Imo steeti.
  • Isiekenesi: Nke a si n'ime otu n'ime ahịa anọ dị n'ala Igbo (Eke).
  • Orlu-Gedegwum: Obodo a dị n'Ọlụ dị n'Imo steeti
  • Obibiezena: Obodo a dị n'Imo steeti
  • Abodinoso: Obodo a dị na Mbaise dị n'Imo steeti
  • Ajatakịrị: Obodo a dị n'Abịa steeti
  • Ụmụcheikuku/Nnalane-Okorocha/Ụmụalaji Ụmụber-Leche/Elekenowasi: Ndị a bụcha aha obodo dị n'Aboh Mbaise dị n'Imo steeti.
  • Obinkịta: Ị nwereike ịkpọ ya obi (mkpụrụobi), mana ihe ọ pụtara bụ 'obi' (mbara). Ọ bụ obodi dị n'Arọchukwu dị n'Abịa steeti.
  • Egwudulegu: Obodo a dị n'Ebonyi steeti.
  • Oguzaronweya: Nke a bụ obodo dị n'Ebonyi steeti. Dịka aha ahụ siri kọwaa, ọ pụtara 'obodo guzoro onwe ya'.
  • Mkpuma akwaokuku: Gịnị ka ọ dị gị ka aha obodo a pụtara? Obodo a dị n'Ebonyi steeti.
  • Awkunanaw: Obodo a dị n'Enugwu steeti
  • Nchatancha: Obodo a dị na Nike dị n'Enugwu steeti
  • Amankpunator: Obodo a dị n'Enugwu steeti.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Etu Enugwu siri wete aha ya