Aisha Buhari, Patience Jonathan na nwunye onyeisiala ndị ọzọ ị gaghị echefu ọsịsọ

Ndị nwunye onyeisiala Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Oche nwunye onyeisiala na-adịkwa mkpa dịka nke onyeisiala, nke mere na ọtụtụ oge, okwu si ha n'ọnụ pụta na-ebu 'weight'.

Dịka nwunye onyeisiala, ụfọdụ ndị nwereike iji ihe ndị si gị n'ọnụ pụta na-atụnyere ọchịchị di gị.

Nke a apụtala/pụtara ihe n'ọchịchị ndị dịka Muhammadu Buhari, Goodluck Jonathan na Turai Yar'Adua, ebe okwu nwunye ha gbara ọtụtụ ndị gharịị.

Lee ihe ndị ị nwereike iji echeta ndị nwunye onyeisiala ndị a:

Aisha Buhari:

Aisha

Ebe foto si, Getty Images

Aisha Buhari a mụrụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Febrụwarị, 1971 bụ nwunye Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'oche ọchịchị Naịjirịa nke ugboro abụọ ugbua.

Oge ha malitere ọchịchị n'afọ 2015, e kwuburu na agaghị enwe ihe ọbụla dị ka "ụlọọrụ nwunye onyeisiala", mana nke ahụ gbanwere n'ọnwa Juun 2019 mgbe o kwuru sị kpọwazịkwaa ya 'first lady'.

A bịa n'ikwuputa okwu banyere ọchịchị, o jighikwa ya n'ọnụ makana ọtụtụ oge ka o kwuputarala ihe na-eme n'ọchịchị di ya; o bola nwanne di ya bụ Mamman Daura ebubo ịpị di ya ka 'remote'.

Ihe ọzọ tụrụ ndị mmadụ n'anya bụ etu o si kwuo na Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru di ya anaghị arụ ọrụ e dinyere ya.

Buhari bụ di ya ekwuola na Aisha ekwesịghị itinyere ya ọnụ n'ọchịchị, na ọ bụ n'ime ụlọ ka ọ kwesịrị inwe ọnụ.

Patience Jonathan:

Patience Jonathan

Ebe foto si, AFP

Patience Jonathan a mụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 1957, bụ nwunye Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa site n'afọ 2010 ruo 2015.

Oge ha nọ n'ọchịchị, onye ọbụla ma na ọ naghị eji Jonathan egwu egwu, ọkachasị maka etu ọ na-esi agbachitere ya ọgụ ma ndị mmadụ kpụkarịa ya n'ọnụ etu na-adịghị mma.

N'onwe nke ya, 'Mama P' bụ ihe ndị mmadụ na-akpọ ya, metara ihe ndị e ji echeta ya.

Ị nwereike ichefu "Chai! There is God oo" bụ akwa o bere mgbe ọ na-ekwu maka ụmụakwụkwọ ndị Boko Haram tọrọla? Ka ọ bụ mgbe o kwuru na "unu tụnyere Buhari na ntuliaka, o merie, unu ga na-aga eleta di unu n'ụlọmkpọrọ" ka ha gara ọgbakọ ebe a na-arịọ vootu n'afọ 2015?

Onye ọbụla ma ụdịrị ike nwaanyị Rivas steeti kpara oge ha nọ n'ọchịchị. Kwa mgbe ka a na-echeta ya ugbua, ọkachasị mgbe gọọmentị tụlitere okwu nnyocha ego ole ha sị na ha butere n'ọchịchị ha.

Turai Yar'Adua:

Turai Yar'adua

Ebe foto si, Getty Images

Turai Yar'Adua a mụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị 1957, bụ nwunye Umaru Musa Yar'Adua chịrị Naịjirịa site n'afọ 2007 ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2010.

Oge ha nọ n'ọchịchị, ndị mmadụ na-ekwu na o so na ndị di ya na-ege ntị tupu o mee ihe ọbụla, dịka iwe mmadụ n'ọrụ.

N'ihi ụdịrị ike a na-ekwu na nwaanyị a kpara, akụkọ kwuru na oge di ya nwụrụ, na o kwuputaghị ya n'oge maka na ọ chọrọ ihazicha ihe tupu ọ pụọ n'ọchịchị.

Stella Obasanjo

Stella Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images

Stella Obasanjo a mụrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Nọvemba 1945, bụ nwunye Olusegun Obasanjo chịrị Naịjiria site n'afọ 1999 ruo 2007.

Tupu ya na di ya abanye n'ọchịchị, o so na ndị ọnụ na-eru n'okwu banyere ime mkpesa maka mgbanwe ọchịchị nke Bekee kpọrọ "political activist".

Oge ọ dị ndụ, ọ bụ nwaanyị na-etiputa 'style'. Ọ na-eke ekike mere o ji achakapụta n'ọha.

Obasanjo chịzuru afọ abụọ ya n'agbanyeghi na nwunye ya nwụrụ n'afọ 2005.

Ọ nwụrụ ka ọ gara ịwa ahụ nke a kpọrọ 'plastic surgery' na Bekee.

Maryam Abacha

Maryam Abacha

Ebe foto si, Instagram/Gumsu_Sani_Abacha

Maryam Abacha a mụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Maachị 1945, bụ nwunye Sani Abacha chịrị Naịjiria site n'afọ 1993 ruo 1998.

Abacha chịrị oge Naịjirịa ka nọ n'okpuru ọchịchị ndị agha, mana ọchịchị ya adabaghịrị ndị Naịjirịa, nke mere na oge ọ nwụrụ n'afọ 1998, ndị mmadụ wụbara n'ụzọ na-amali elu, na aṅụrị.

N'afọ 1999, Maryam kwuru na n'agbanyeghi ihe niile ndị mmadụ na-ekwu maka di ya, na ọ hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu.

Maryam Babangida

Maryam Babangida

Ebe foto si, Getty Images

Maryam Babangida a mụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 1948 bụ nwunye Ibrahim Badamasi Babangida chịrị Naịjirịa site n'afọ 1985 ruo 1993.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ya kewapụtara ọkwa 'first lady' na Naịjiria site n'ịbụ onyeisi ndị nwunye ndị agha, ebe o si wee hibe ọtụtụ ihe na ụlọọrụ na-enyere ụmụnwaanyị aka.

O mere ihe mere ọha ji buru ya n'isi ghara ị na-akatọ maọbụ ekwutọ ya; ọ bụghị naanị na Naịjirịa, ma na mpaghara Afrịka dị iche iche.

Dịka nwunye onyeisiala, ekike ọ na-eke bụ 'Igbo bịa lelee", nke bụ na ọ bụ 'olu gbajie ọha'.

Nna ya bụ onye Igbo si Asaba, ebe nne ya bụ onye Awụsa.

Ọrịa Kansa gburu ya n'afọ 2009.

Kedụ nke kacha masị gị?

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, N'etiti nwoke na nwaanyị kedụ onye ka eghewe ahụ oghe n'ejije ha?