Aisha Buhari age: Lee ihe ndị dị omimi maka nwunye onyeisiala

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara gọọmentị di ya

Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari nke Naịjirịa

Ọ bụ onye Adamawa steeti dị na mpaghara ugwu.

Nna nna ya bụ Muhammadu Ribadu mabụrụkwa mịnista nchekwa nke mbụ na Naịjirịa.

Alụm dị na nwunye ya na onyeisiala Buhari mitara ha ụmụ ise nakwa otu nwa nwa.

A mụrụ Aisha Buhari n'ụbọchị Februwarị 17, 1971 n'Adamawa.

Aisha Buhari na wife of di presido of di federal republic of Nigeria Muhammadu Buhari.

Aisha ritere Masters Degree ya n'International Affairs site na Nigeria Defence Academy nakwa bachelors ya na in Public Administration na mahadum Ambrose Ali dị n'Ekpoma.

Tupu ọ gaa mahadum ndị a, ọ malitela ngalaba ịchọ mma ya dịka o ritere diploma n'ichọ mma na mba United Kingdom, France nakwa United Arab Emirates.

Abụzịkwa m 'First Lady' Naịjirịa - Aisha Buhari

Mgbe Muhammadu Buhari malitere ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2015, otu ihe gọọmentị ya kagbụrụ bụ inwe ọkwa 'Nwaanyị Mbụ na Naịjirịaa a kpọrọ, "Office of the First Lady," na Bekee.

Onyeisiala Buhari sị na ọ bụ "Nwunye Onyeisiala" ka a ga-akpọ nwunye ya bu Aisha Buhari. Atụmatụ a kagbụrụ usoro Naịjirịa si eme nwunye onyeisiala.

Mana ugbua, Aisha Buhari - bụ onye ọtụtụ mmadu na-ekwu nweburu ihe niile sonyere onye bụ nwaanyị mbụ na Naịjirịa - ekwuola na ya chọzịrị ka a na-akpọ ya "First Lady".

Nwunye Buhari kwuru nke a na Tọọzde bụ ụbọchị nke iri na atọ nke ọnwa Juun n'Abuja mgbe a na-enye nwunye gọvanọ Naịjirịa ihe nturuugo.

Aisha sị na ọ bụ maka mgbagwojuanya pụtara maka atụmatụ ahụ tinyere n'ebe nwunye ndị gọvanọ nọ.

Ọ sị ka a gbaghara ya maka iwepụta atụmatụ a na mbụ.

Mgbagwojuanya atụmatụ a nwereike wete bụ ebe nwunye gọvanọ ndị lụrụ ọtụtụ nwaanyị.

Onye ntaakụko Abdulaziz Abdulaziz gwara BBC na ihe okwu Aisha pụtara bụ ya na di ya akwụghi n'otu ahịrị.

Abdulaziz kwuru sị, "E nwere ọtụtụ ihe akaebe ebe okwu ya na okwu Buhari agaghi otu ebe."

Ọ gara n'ihu sị na "Nke a na-egosi na ha adịghị ekwekọrịta na be ha".

E nweteghị ndị na-ekwuru Aisha Buhari maọbu Onyeisiala Buhari n'ekwentị.