Boko Haram: 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa.

Ndị agha Naijirịa na-ebuzo Boko Haram agha

Ebe foto si, @HQNigerianArmy

Nkọwa foto, Ndị agha Naijirịa anwụchiela ndị isi otu Boko Haram iri.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndịagha Naijirịa anwụchiela mmadụ iri ha sị bụ ndị isi otu Boko Haram soro wakpo obodo ndị di na okpụrụ ọchịchị Gwoza nke Borno steeti n'afọ 2014.

Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Aminu llIyasu kwuru nke a n'akara Twitter ha na satụde, na ha nwuchịri ndịa n'ụbọchị Tụzde dịka ha na-agba ọsọndụ maka mwakpo ndị agha na awakpo ha na mpaghara Gwoza.

Aha ndị a aka kpara bụ ShettimaMustapha Umar, Abba Buji, Alhaji Bukar Madu-(KAHID - Onye Boko Haram ọkwa ya dịka nke 'Brigadier General' ndịagha), Ali Hassan (Ukọchụkwụ ha), Alkali Laminu, Bukur Mustapha, Buba Umaru (Eji 'Black Uhuru' mara) ,Madu Nosobe, Mustapha Hussaine na Umar Jeddum.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ha niile si n'ọpkuruọchichị Bama dị na Borno steeti.

Nwunye Onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari

Nkọwa foto, Ọ gara ezumike na mba Ingland.

Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari awuchiela na Naijiria n'ụtụtụ a dịka ọ gara ezumike na mba Ingland.

O soro dị ya gaa mba Saudio Arabia maka haji, ebe ha sitere gawa London, Ingland.

Ebe ahụ ka ọ nọrọ nwee ezumuike.

Ụfọdụ ndi nwunye gọvanọ biakwara sị ya nnọọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdị Azikiwe dị na Abuja.

O kwukwara n'akwụkwọ ọ depụtara na ya enwela ike i ji bido ọrụ maka nkwalite ahuike ụmụaka, ndị nne na kwa ndị ọzo na arịa ahụ na Naijirịa.

N'Anambra steeti

Emume 'World Space Week' n'Anambra Steeti.

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Emume 'World Space Week' n'Anambra Steeti.

Mịnịstịrị na-ahụ maka Teknụzu na Naijirịa etoola Anambra steeti dịka ọkachasị n'ihe gbasara Sayencị na Teknụzụ.

Ọ bụ mịnịsta na-ahu maka Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu kwụrụ nke a na emume 'World Space Week' ma rịọ ka ụmụakwụkwọ tinye ụchụ na agụm akwụkwọ .

N'Ofesi

Ndịagha Burkina Faso

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha Burkina Faso awuchiela na mpaghara ebe mkpamkpa a kpara

Akwa arịrị na-ada na Burkina Faso dịka ndị ana amaghi ndị ha bụ banyere n'ụlo ndị ofufe Alakụba were gbuo mmadụ iri na ise ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ.

Onweghị ndị pụtara kwuo na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama a na eche na ọ bụ ndịagha ọgụ Jihad kpara ya bụ mkpamkpa.

N'Egwuregwu

Ndị na-akwado Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị nkwadọ Super Eagles ga-apụta n'Agege Stadium mgbe ha na ndị Togo ga-ezute.

Ndị otu super Eagles nọ na Naijirịa na-achọ ọkpu goolu atọ ha ga eji gbapụ ndị nke Togo maka Ntozu asọmpị 'African Nations Championship' nke 2020.

Ha ga-enwe ohere a na ụbọchị 19 nke onwa oktober na Legos iji bụkwara mmeri ndị Togo meriri ha na be ha.

Cheta na ndị otu Togo ji ọkpụ goolu anọ a asatra otu were merie ndị Super Eagles na be ha Ka ọ dị ugbua SuperEagles na achọ goolu atọ ha ga-eji gbapụ ndị Togo na asọmpi a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma'