Lagos State: Ụlọ adagbuola mmadụ anọ na Legọs steeti

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọ dagburu mmadụ na Magodo, Legọs

Ụlọ dagburu mmadụ na Legọs

Ebe foto si, LASEMA

Nkọwa foto, Ụlọ dara na Magodo Legọs

Na Legọs, dịka mmiri na-ezo esepụaka kemgbe ụtụtụ, ụlọ atọ adaala nke abụọ n'ime ha mere na Ikorodu.

Onyeisi ndị Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) bụ ndị na-ahụ maka ọdịmma gburugburu na Steeti ahụ bụ Femi Osanyintolu sị na mmadụ anọ nwụnyụrụ anya na nke dara na Magodo.

Onye ozi ndị LASEMA bụ Nosa Okunbo sị na otu ụlọ dị n'ugwu dakwasara ibe ya na Otun Araromi nke dị na Isheri Magodo taa bụ Satọde.

Akụkọ ndị ọzọ sị na ọ bụ nne, ụmụ ya abụọ na nwanne ya nwaanyị ka ya bụ ụlọ dagburu.

Nna ha bụ onye meruru ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọogwu ugbua.

Ozi anyi nwetere kwụru na LASEMA emezuola ihe iwu kwuru maka ụlọ dara ada na ya bụ Steeti.

Iwu ahụ nyere ikike ka LASEMA kpochapụ aja ụlọ ahụ ozugbo ma nwere ya bụ ala maka ịtinye ndị mmadụ n'ọdachi.

Ụlọ dara na Ikporodu

Ebe foto si, LASEMA

Nkọwa foto, Ụlọ dara na Ikporodu

Nchọpụta ndị LASEMA mere maka ụlọ nke dara na Ikorodu gosiri na ya bụ ụlọ akawala nka bụ nke mere mmiri ozizo ahụ ji kwatuo ya.

Ụlọ ọdịda abụghị ihe ọhụrụ na Legọs dịka o siri mee na mbido afọ a mgbe ụlọelụ ogogo atọ dagburu mmadụ dị iri abuọ nke gụnyere ụmụakwụkwọ na Ita-Faaji dị na Lagos Isand.

Ndị Ụka katọliki pụtara ekpere okporo ụzọ

Benue na Katọliki

Ebe foto si, Ebere Ekeopara

Nkọwa foto, Egburu ndị ụkọchukwu katọliki abụọ na Benue steeti na onwa Aprelu afọ a.

Ị nụụla, ndị uweojii n'Enugwu steeti adọọla ndị nche obodo aka na ntị ka ha ghara ịji osisi ma ọ bụ akpaaja gbochie ụzọ ndị njem sị agafe.

Ndị uweojii a na-ebo dị na-akpa ụdị agwa a ebubo ngarị.

Ọnụ na-ekwụrụ ha na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu sị na ndị nche obodo enweghị ikike iji osisi ma ọ bụ ihe ọbụla dọchie ụzọ ndị mmadụ sị aga, ha sepụ aka enwe na ya bụ ofe.

Nke a na-eme dịka ndị ụka katọliki Enugwu ji ekpere gagharịa maka udo na nchekwa nke Naịjirịa

Oke mmiri ozizo achụpụla ndị mmadụ na Japan

Japan

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mmiri ozizo na oke ifufe emebiela ihe na Japan

Ka a na-ekwu nke na-eme na Naịjirịa, na Japan, agwala ihe ruru mmadụ nde asaa ha kwara ngwongwo ha gbaa ọsọ ndụ ha maka mmiri ozizo na oke ifufe.

Ọ dịzị ka ụwa ana ga-imebi na Tokyo ebe ọkụ latriki nyụrụ, ụgbọ oloko kwụsịrị , ihe ruru otu puku ụgbọelu kwụsịri ọrụ kemgbe ya bụ oke mmiri na ifufe malitere.

Asọmmpi enyi na enyi Super Eagles

Super Eagles

Ebe foto si, AFP

Dịka Naịjirịa na Brazil na-akwado asọmmpi enya na enyi echi na Singapore, Toost Ekong bụ onye nọgodu ọnọdụ onye ndụ ndị otu Super Eagles ekwuola na-egwu anaghị atụ ha bụ afọ ha jiri buru ụzọ.

Ekong kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkprịtaụka taa sị na ọ bụrụ na ndị egwu bọọlụ Senegal ga-azọta isi ha n'aka Brazil, na ha ga-eme ike ha.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Bọjetị 2020

Ndị mịnịsta ọhụrụ

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmed

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na ndị Mịnịsta ya

Nke na-akpọtụ taa bụ na onyeisiala Muhammadu Buhari amachiela njem mba ofesi maka ndị Mịnịsta niile na-agabeghị n'ihu ndị omeiwu kọwaara ha atụmatụ mkpata na mmefu ego ngalaba ha na-elekọta.

Buhari kwuru na nke a ga-enyere ndị omeiwu aka imecha nyocha bọjetị 2020 n'oge iji mee ka ọ malite n'ọnwa Janụwarị kpọmkwem.

Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi nke si n'ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti nke onye binyere aka na ya bụ Willie Bassey, onye nhazi mgbasa ozi n'ụlọọrụ ahụ.

N'ofesi

Kevin McAleenan bụ onyeisi ngalaba ọrụ nchekwa a kpọrọ Homeland Security na mba Amerịka agbaala arụkwaghị m.

McAleenan bụ onye nke anọ na-arụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba ahụ kamgbe onyeisiala Donald Trump malitere ọchịchị.

Na soshal midia 'Twitter', Trump toro McAleenan ma kwuo na ya ga-ahọpụta onyeisi ọzọ n'izuuka na-abịa abịa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Naanị ọnwa isii ka MacAleenan nọrọ dịka onyeisi 'Homeland Security' tupu ọ wụsa ọwa.

O gwara ndị ntaakụkọ na ọ baghịrị ya uru ịbụ onyeisi n'ọnụ ebe onweghị ikeke ọbụla gbasara otu ya bụ ụlọọrụ sị aga.

N'akụkọ ọzọ

Picture aboard Iranian oil tanker Sabiti

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Pictures aboard the Sabiti - allegedly taken on Friday - were published by Iranian state TV

Mba Iran na-ekwu na a tụrụ ogbunigwe abụọ n'ụgbọmmiri ha nke bu mmanụ agbidi n'osimiri mmeemmee.

Ọbụ ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Iran na mba ndị ọzọ kwuru nke a.

Akụkọ kwuru na Iran na-ebo mba Saụdi Arebia ebubo ịtụ ya bụ ogbunigwe, mana Iran agọọla na ha eboghị ụdị ebubo ahụ.

Etu ihe si gbata kwụrụ, amabeghị ndị maọbụ onye tụrụ ogbunigwe ndị ahụ.

N'egwuregwu

Eliud Kipchoge

Ebe foto si, Twitter/Eliud Kipchoge

Nkọwa foto, Eliud Kipchoge

Eliud Kipchoge onye Kenya abụrụla onye mbụ gbachara ọsọ maratọn n'oge erughị awa abụọ.

Nanị otu awa na nkeji iri ise na itoolu ka o were Kipchoge iji gbaa ọsọ ihe karịrị kilomita iri anọ na abụọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nke a bụ nke ugboro abụọ Kipchoge na-anwa ime ụdị ihe a.

Oge ọ nwara nke mbụ bụ n'afọ 2017 na mba Italy.

Ka ọ gbachara ọsọ ahụ, Kipchoge kwuru sị: "Nke a egosila na onweghị ihe mmadụ apụghị imeli."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

"Ugbua m merela ya, a na m atụ anya na ndị ọzọ ga-emekwa ya n'oge na-adịghị anya."

Mkpu ọṅụ dawara n'elu n'ala na Nairobi isi obodo Kenya mgbe Kipchoge ritere nzere a.

A kụ[ịala Ịngland

Mba Chek Rịpọblik ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Ịngland

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mba Chek Rịpọblik ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Ịngland

N'egwuregwu, mba Check Repọblik akụpịala mba Ịngland n'asọmpi itozu oke maka Euro 2020 nke ha gbara n'abalị Fraịdee.

Nke a bụ nke mbụ a na-emeri ndị otu bọọlụ Ịngland kamgbe a malitere ịsọ mpi a, mana ha nwere ike itozu ịga Euro 2020 mah merie Bulgaria ụbọchị Mọnde.

N'asọmpị ndị ọzọ, Potụgal meriri ndị Luzembọg 3-0, Fransị gbara ndị Aisland 1-0 ebe Tọkị meriri Albenịa 1-0.

Asọmpị onye ka mma

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Nwaada Nyekachi Douglas eturula ugo n'asọmpi nwanyị kacha maa mma na Naịjirịa.

Douglas bụ onye nọchiri anya Riva Steeti na asọmpi ahụ.

Ihe nrite ọ nwetara gụnyere ụgbọala ọhụrụ nakwa ịnọchite anya Naịjirịa n'asọmpị nwaanyị kacha maa mma n'ụwa nke a ga-eme na London.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: