Oil Exploration: NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Mpaghara ugwu Naịjirịa esorola na mpaghara na-emepụta mmanụ agbidi.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ 'Nigeria National Petroleum Corporation' kwuru na ha ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ahụ.
Ha kọwapụtara nke a n'akwụkwọ ozi nke ha wepụtara na mgbede Fraịde.
Ebe a chọtara mmanụ ahụ bụ na osimiri Kolmani nke dị na Gongola Basin, na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugwu nke Bekee kpọrọ 'North East'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo, ọbụ n'abalị iri nke ọnwa Ọktoba ka ndị ọrụ NNPC gwupuru ụmị ebe a hụrụ mmanụ agbidi ahụ nakwa ikuku gaasị.
Onye binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ bu Samson Makoji, onye isi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta NNPC na ndị ọha obodo.

Ebe foto si, NPPC
Makoji kwuru na ụmị ahụ ha gwupuru nwekwara nke Bekee kpọrọ 'condesate' na 'light sweet oịl'.
A na-emezi nnyocha ugbua iji chọpụta ole mmanụ dị n'ụmị ahụ ha, ma ọ ga-erukwa nke a ga-ere ere n'ahịa.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









