Buhari ka na-ekwusi ike na Boko Haram enweghịzị ume

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, NIGERIA PRESIDENCY

Nkọwa foto, Buhari kwuru na ndịagha Naịjirịa asụọla Boko Haram akwụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Buhari ka na-ekwusi ike na ndị agha Naịjiria emenyụọla ndị oyi egwu Boko Haram anya.

Buhari kwuru nke a oge o zutere onyeisi ndị Red Cross bụ Peter Maurer n'Abuja.

O kwuru na ọ fọdụrụ obere ka ndị agha Naịjirịa na nke ndị mba gbara ya gburu gburu kpochapụ Boko Haram kpam kpam.

N'okwu ya, "Anyị na mba Chad, Kamerun, Nijie Repọblik na ndị ọzọ na-adọkọta ukwu."

"Ndị agha ụgbọelu anyị na-emekwa nke ọma."

"Ndị Boko Haram bụ ndị ekperima, anyị ga na-akpasokwanụ ha agwa ka ndị ekperima."

Buhari kwukara na ọchịchị ya na-agbazi mbọ ugbua idozi ihe niile ndị Boko Haram mebiri, ma kpọghachikwa ndị niile gbapụrụ ọsọ ndụ.

N'okwu ya, Peter Maurer kwere nkwa na ndị otu ya (ndị Red Cross) ga na-agba mbọ inyere ndị mmadụ aka, etu ha nwere ike.

Buhari na Atiku

Atiku Abubakar na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @Atiku/@MBuhari

Taa ka okwe ga-agba n'ikpe dị n'etiti onyeisiala Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar iji mata onye meriri ntuliaka e mere n'ọnwa Febụwarị afọ 2019 maka nhọpụta onyeisiala Naịjirịa.

Atiku na ndị otu ya bụ PDP na-ebo ebubo na Buhari na ndị otu ya bụ APC mere nrụrụaka dị egwu na ya bụ ntuliaka.

Ha na-akọwatakwa na onyeisiala enweghi asambodo zuru oke iji zọọ ọkwa onyeisiala.

BBC kwụ chịm n'ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja iwetara gị akụkọ a n'uju.

Trump na Bolton

Donald Trump na John Bolton

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Donald Trump na John Bolton

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela onye ndụmọdụ ya gbasara nchekwa obodo aha ya bụ John Bolton ọsọ.

Trump kwuru na ya anaghị ekwenye na ndụmọdụ ụfọdụ Bolton na-enye ya, nke a kpatara o ji sị ya laa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mana Bolton na-ekwu na ọ bụ ya ji aka ya gbaa arụkwaghịm.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Bolton kwukwara na ụwa ga-anụ olu ya oge na-adịghị anya.

Ọnyụpa ndị "Super Eagles"

Ọgbọ egwuregwu ebe Naịjiria nọ wee zute mba Yukren

Ebe foto si, Twitter/@NGSuperEagles

Nkọwa foto, Naịjirịa na Yukren zutere onwe ha n'obodo Dnipro.

N'egwuregwu, ndị otu Super Eagles maliri elu ka Agụ ma wụọ chọm ka nwa Awọ n'asọmpi enyi na enyi ha na ndị Ukraine gbara ụnyaahụ.

Ụmụ Naijirịa jibu goolu abụọ emeri na ya bụ egwuregwu, mana Yukren tụgharịrị sachaa goolu abụọ ahụ n'otu ntabi anya.

N'aka nke ọzọ ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghi afọ iri abụọ na atọ meriri mba Suda ụnyaahụ.

Otu abụọ ahụ zutere onwe ha iji mara onye ga-etozu oke isonye n'asọmpi Afcon nke ndị erubeghi afọ iri abụọ na atọ.

Naijirịa ji ọkpụ goolu ise asataghi asata menyụọ Sudan anya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Code Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'