Boko Haram: 'Ha enweghịzị ọnọdụ na Naịjirịa'

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Boko Haram bụzi kụkọ ifo - Buhari

Onyeisiala Muhammdu Buhari

Ebe foto si, @NGPresident

Onyeisiala Muhammadu Buhari, n'ozi ọ gwara mba ụwa n'ọgbakọ okwu akụnaụba nke ndị isi mba ụwa mere na Jordan kwuru na onwezighi steeti ọbụla na Naịjirịa Boko Haram kpachiri.

Buhari kelere mba ụwa niile maka na nkwado ha na-enye ndị Naịjirịa n'ibu agha megide Boko Haram nakwa ihe ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu.

O kwukwara na gọọmentị ya anapụtala obodo niile bụ nke Boko Haram kpachiri n'afọ 2014.

Buhari gara n'ihu rịọ ka mba ụwa karịsịa ndị mpaghara Asia ka ha bata na Naịjirịa bịa mepee azụmaahịa dị icheiche iji wulite akụnaụba na mmekọrịta ha na Naịjirịa.

Ọrịa ịba lassa amịpụtala isi na steeti ise na Naịjirịa

Rats

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Oke na-ebutekarị ọrịa 'Lassa fever'

Ọrịa Iba Lassa bụ nke oke na-ebute ji nọọ nwayọọ na-akpọla ndị mmadụ mmụọ.

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa kwuru na ọrịa a apụtala ihe ọzọ na Steeti ise ndị gụnyere Ebonyi, Bauchi, Taraba na Plateau.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na mmadụ otu narị iri abụọ na otu anwụọla kemgbe ọrịa malitere.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ kọmishịona ahụike n'Ebonyi Steeti bụ Umezuruike, o kwuru na ihe gosiri na ọrịa ịba lassa bịaghachịrị azụ karịa nke mere n'oge mbụ.

O kwuru na gọọmentị Ebonyi nwere ụlọọgwụ na-ahụ maka ọrịa ịba lassa bụ nke ọtụtụ steeti na-abịa a e me nyocha.

A maghị ma ọ bụ ọkwụ gbagburu Aminu Zubair - Mahadum Ibadan

Ime ụlọ ọkụ gbara na Mahadum Ibadan

Ebe foto si, Tunji Oladejo

Ụlọakwụkwọ Madadum Ibadan ekwuola na amabeghi ihe gburu nwoke a bụ Aminu Othman Zubair a na-eche gburu onwe ya n'ọkụ gbara n'ụlọ ya.

Ọnụ na-ekwuru ụlọ akwụkwọ a bụ Tunji Oladejo gwara BBC kwuru n'ezie na nwoke nwụrụ n'ụlọ ya dị n'ogige obibi Mahadum a mana amaghị ihe gburu ya.

Aha onyonyo, Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

O kwuru na ọ bụ naanị Zubair nọ n'ime ụlọ ya mgbe ọkụ a gbara dịka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ hụrụ ya n'elu akwa ebe ọ nọ nwụọ.

Oladejo kwuru na Zubair akwụsịla ịrụrụ Mahaduma a ọrụ mana na ọ bụ n'ihi obi ebere ka eji hapụ ya ka o biri n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.

N'ofesi:

Ngagharịiwe na Sudan

Ebe foto si, AFP

Ụmụafọ mba Sudan malitere ngagharịiwe kemgbe Disemba afọ 2018 megide onyeisiala ha bụ Oma al-Bashir awụchiela n'isi ụlọọrụ ndị agha.

E kwuru na ngagharịiwe a bụ maka oke ọnụ ahịa ihe na-ada na mba ahụ mana ha chọziri ka onyeisiala ha rịtuo n'ọkwa.

N'egwurgwu

Karim Benzema

Ebe foto si, Getty Images

Karim Benzema ewepụla Real Madrid ihere n'anya dịka ha si n'azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ndị Eibar.

Mmeri Valencia meriri Madrid bụ nke mbụ kamgbe Zinedine Zidane lọghachịrị dịka onye nchịkọta otu ha.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Lee ihe omimi ị maghị maka ọjị

Nwa Sekọndrị sugburu nwa klasi ya maka ịjụ ya enyi

ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

N' Umuoli Ikpem dị n' okpuru ọchịchị Ehime Mbano n'Imo steeti, otu nwata nwoke Sekọndịrị a kpọrọ Chibuzor Ohaneme asugbuola nwa klasị ya bụ Olamma Ekwebelem maka ịjụ ya enyi.

Akụkọ kwuru na ugboro ugboro ka Chibuzor rịọrọ Olamma onye ya na ya bụ otu ọgbọ ma na-agụ n'otu ụlọakwụkwọ enyi mana Olamma ekweghị na gọọmentị ya.

Nke a mere ka Chibuzo chebiri Olamma n'ụzọ ma sugbuo ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

"Anyị anwụchiela nwata ahụ . Anyị ga-akpụ ya ụlọikpe ma anyị mecha nnyocha."

Na nke yiri ibe ya,

Nwoke gbupụrụ nwunye isii, ya lie ya n'ime ụlọ

onye a kụrụ ịga

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke ewerela mma chapụ nwunye ya isi, lie ozu ya n'ime ụlọ ha.

Ndị uweojii na-ebo Aminu Inuwa ebubo igbu nwunye ya bụ Safara ka ha nwechara nghọtahie na Kano steeti.

Onnoghen: Buhari ma ihe ọ na-ekwu-APC

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Walter Onnoghen ala la ezumike nka dịka ọkaikpe ukwu Naijiria

Otu APC ekwuola na akwụkwọ alụkwaghị nke onye bụbu ọkpaikpe Ukwu Naijiria bụ Walter Onnoghen tinyere gosiri na ihe Onyeisiala Muhammadu Buhari mere n'okwu ahụ bụ ihe ziri ezi.

Akpụla onye uweojii gburu Kolade Johnson lọikpe

Olalekan Ogunyemi

Ebe foto si, Nigeria Police

A kpụpụla Olalekan Ogunyemi bụ onye uweojii ahụ a chụrụ n'ọrụ maka igbu Kolade Johnson n'ụlọikpe Ebute Meta Magistrate Court.

Dịka ndi uweojii siri kwuo a tunyekwara ya n'ụlọ mkpọrọ maka igbagbu Johnson oge ọ na-ekiri asompi Liverpool na Tottenham gbara ụbọchịụka.

UNN akpaala ike na teknụzụ

University of Nigeria Nsukka

Ebe foto si, University of Nigeria /Facebook

Mahadum University of Nigeria Nsukka emepụtala igwe ọkụ ga na-enye mahadum ahụ oku nke e ji ahịhịa e kpofuru ekpofu enye ọkụ.

Ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba Eletrịkal Inginiarịn nke ọkammụta Emenike Ejiogu n'isi ya na mahadum ahụ mepụtara ya.

Boeing ewtuola ọnụọgụgụ ụgbelu ha ga na-emepụta

Ethiopian Airline

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ na-emepụta ụgbọelu Boeing ga-eji pasentị iri abụọ wetuo ọnụọgụgụ ụgboelu Boeing 737 ha na-emepụta dịka ụgbọelu ha abụọ kpọkasịrị ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

Gee akụkọ ndị a na nkeji n'ebe:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile