Ukraine vs Nigeria: Naijirịa mechara bụrụ 'Aaron' gba aka.

Alex Iwobi

Ebe foto si, Getty Images

Otu Super Eagles na ndị otu bọọlụ mba Yukrane mara onwe ha n'ụbọchị Tuzde.

Ndị otu egwu bọlụ Naijirịa anaghị achị dịka ha jị goolu chara ọkụ were bido asọmpi enyi na enyi ha na Yukrane

Ọ bụ na nkeji nke anọ ka Joe Aribo gosiri ihe o ji bụrụ dịke mgbe o nyere goolu a.

Mgbe ọ dịka ndị Yukrane a chọrọ iteta n'ụra ka Victor Osimhen ji penalty were chụghachi ha azụ.

Yukrane gbara lịkalịka mana Francis Uzoho ghọtara bọọlụ ha niile etu nwatakịrị si ata akara.

N'ihe fọrọ nkeji atọ enyere tupu egbuchie agba nke mbụ, Yukrane emeghị pịm!

Otu Yukrane ji iwe bata na agba nke abụọ ebe ndị Super Eagles tụrụ ute were naba ụra

Oleksandr Zinchenko nyere goolu na nkeji 78 ebe Roman Yaremchuk nyere ọzọ na nkeji 79.

Na ngwụcha, o doro anya nwoke na nwoke ibe ya ha bu eziokwu dika ha gbara onwe ha onye laba onye laba.

Akụịko ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasi gi

Aha onyonyo, Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ