Nnamdi Kanu na osote ya na-aga ịhụ ndị nnwereọnwe na-amasị na ụlọomeiwu Yurope' - Ipob

Ebe foto si, Getty Images
Onyeokwu ndị otu Ipob bụ Paul Achalla akọwaala ndị ha na onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanụ ga-ahụ n'European Union n'uhuruchi taa bụ Tuzde.
Achara kọwara na ọgbakọ a abụghị maka ndị European Union niile kama na ọ bụ kọmiti ndị nnwereonwe na-amasị.
Ọ kọwaghị ndị otu kọmiti a bụ, kama ọ sị na nke a bụ mbido ọtụtụ ihe otu Ipob kwadoro iji mee ka ọha nụrụ ọlụ ha.
Achara kọwara na Nnamdi Kanu ga-akpa ọtụtụ ihe metutara ndị Igbo na mwereonwe ha ya na ndị otu Ipob.
O kwukwara na "mgbe adịghị anya na ndị otu ha ga-ahazị ọgbakọ nke ndị European Union niile ga-eso. Nke a ka bụ njikere".
BBC nwetere ndị na-ahụ mgbasa ozi n'ụlọomeiwu EU ha were si na ha amaghị maka atụmatụ a.
Maazị Tilla McAnthony bụ onye ya na BBC Igbo kwuru sị na ya bụ ụlọomeiwu ka malitere ọrụ n'izu ka gara aga.
Ọ kwukwara na ya ga-eme nchọpụta ịmata nke bụ eziokwu ma kpọghachị BBC Igbo.
Anyị na-eso akụkọ a ka anyị mata nke ga-eme.











