FBI & EFCC List: Anyị anwuchiela ndị 'yahoo' 167 na Naijirịa

Ndị EFCC na FBI

Ndị uweojii nyocha nke mba Amerịka bụ 'Federal Bureau of Investigation na nke Naijirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nwere ọgbakọ na Legọs n'ụbochi Tọzde ebe ha gwara ndị ntaakụkọ etu ọrụ sị aga

Ngalaba abụọ a kwuru na ha ga-etikọ aka ọnụ were megide mpụ na ohi nke Ịntanetị na nke igwe kọmputa.

Onye ọrụ FBI gwara ndi ntaakụkọ na ha nwetere mkpesa ruru Puku iri abụọ (20,000) maka ohi nke akụ na ụba sitere n'Email nke napụrụ ndị mmadụ ego ruru otu ijeri naira na ọma ($1.2B).

He gwara ndi ntaakuko na ha anwuchiela ụfodu n'ime ndi so na aha iri asaa na asaa (77) ndị FBI depụtara n'ọnwa gara aga.

Dika ha siri kwuo, a ga-ekpe ụfọdụ ndị Naijiria a nwuchiri ma ndi nke so na aha mmadụ (77) FBI depụtara ikpe na mba Amerika.

Ha gwara ndị ntaakuko na ha anwuchiela mmadụ 167 bụ ụmu Naijiria maka ihe gbasara mpụ a.

Ha mekwara ka ndị ntaakuko ghọta na ha anapụtala ndị a nde naịra iri itoolu na abụo (N92m).

Orji Uzo Kalu

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Twitter/@OUKtweets

Nkọwa foto, Orji Uzor Kalu

Aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu agwala ndị nkwado ya ka ha ghara inwe obi abụọ gbasara nkagbu ụlọikpe kagburu mmeri ntuliaka ya.

Cheta na ụlọikpe nta maka ntuliaka nọrọ ụnyaahụ kagbuo mmeri Kalu meriri Mao Ohabunwa na ntuliaka e mere n'ọnwa Maach afọ a.

Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka INEC hazigharịa ntuliaka na wọdụ olemole n'ime abalị iri itoolu na-abịa abịa.

N'ozi si n'aka ụlọọrụ ntaakụkọ ya, Kalu kwuru na mkpebi ụlọikpe ahụ anaghị echu ya ụra ma ncha.

O kwuru na ya ga-emeri Ohuabunwa mgbe ọbụla emegharịrị ya bụ ntuliaka.

N'okwu ya, "A ga m agbagha mkpebi 'tribunal' ahụ."

"Ohuabunwa abụghị onye a ma ama. E meriri m ya nke ọma."

"APC ga-emerị PDP n'Abia North mgbe ọbụla a yiri ntuliaka a ọzọ."

N'ụbọchị Mọnde, otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC kọwara na onweghi mgbe ụlọikpe ji chụtuo Orji Uzor Kalu dịka onyeiwu kama ha sị na a ga-emegharị ya bụ ntuliaka.

Agaghị enyeghachị Diezani Alison Ola ya

Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ola ya na ekentị olaedo ya alala n'ihi

Ụlọikpe kachasi elu na Naịjiria enyela iwu na agaghi enyehachi Diezani Alison Madueke ola mma ya na ekwentị Iphone nke eji Olaedo rụọ ha nwetere n'ụlo ya.

Onye Okaikpe bụ Nicholas Nicholas kwuru na Diezani na onye Okaiwu ya egosighị ihe mere a ga-eji nyehachi ya ihe ndia ha machiri.

Busola Dakolo

Biodun Fatoyinbo na Busola Daokolo

Ebe foto si, @biodunfatoyinbo/@busoladakolo

Nkọwa foto, Biodun Fatoyinbo na Busola Daokolo

Busola Dakolo, ekwuola na onweghi mgbe o ji kwuo ka ụkọchụkwụ Biodun Fatoyinbo kwụọ ya nde naịra iri n'ihi mwakpo ọ wakporo ya mgbe gara aga.

Cheta na Dakolo gbara Fatoyinbo akwụkwọ na-arịọ ụlọikpe ka ha manye Fatoyinbo ka ọ rịọọ ya mgbaghara maka iwakpo ya mgbe orubeghi ihe e ji nwannyi eme.

Ikpe ahụ ga-adị n'ụlọ ikpe nke "Federal Capital Territory".

Ndị ọkaiwu Busola kọwara na nde naira iri ahụ ha chọrọ ka Fatoyinbo kwụọ bụ maka ego ha ji gbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

Onwebeghi ọkaikpe e wepụtara ga-ekpe ya bụ ikpe.

Rwanda egosila ihunanya

Ndị mmadụ na-achọ isite mba Libya gawa Iropu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụ n'izuuka na-abịa ka a Rwanda ga-ebido ikpọrọ ndị a tọro na Libya

Ndị Mba Rwanda ekwtela inabata ihe ruru mmadụ nari ise ndị tọrọ atọ na Libya.

Ndi Rwanda kwetere inabata ndịa gunyere ụmụaka na ntorobia dịka ndi CNN gosiri ebe a na ere ndị mmadụ dịka ndi ọrụ na mba Libya.

Nt Kora na Amerika ekpeziwela

U.S. President Donald Trump na onyeisiala Nọt Korịa Kim Jong Un

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Donald Trump na Kim Jong Un

N'ofesi, Mba Nọt Korịa ekwuola na ha dị njikere ka ha na mba Amerịka malitekwa mkparịtaụka etu a ga-esi kwụsị nchọpụta gbasara ịmepụta ogbunigwe nuklịa.

Onye mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba ahụ na mba ndị ọzọ bụ Choe Son-hui kwuru na mkparịtaụka nwere ike ịmalite tupu ọnwa Septemba agwụ ma ọ bụrụ na Amerịka chọọ.

Super Eagles na Yukren ga-achịpụ ya

Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles

Ebe foto si, Twitter/Super Eagles

Nkọwa foto, Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles oge ha mechara nkwado na Yukreb n'ụbọchị Mondee

N'egwuregwu, otu Super Eagles nke Naịjirịa ga-ezute ndị mba Ukren n'asọmpi enyi na enyi na mgbede taa.

Asọmpi a ga-ebiri ọkụ ma o jiri ọkara gafee elekere asaa nke uhuruchi.

Asisat Oshoala

Asisat Oshoala na-agbara ndí otu egwu bọolụ Barcelona

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Asisat Oshoala so na mmadụ iri na asatọ ahọpụtara ga-agbara Barcelona na asọmpị UEFA

Nwaada Naijiria bụ Asisat Oshoala na agbara ndị otu bọọlu Barceleona ga-eso gba asọmpi ha na ndị otu egwu bọọlu Juventus na agba nke iri atọ na abụọ na asọmpi UEFA nke ụmunwanyị.

Oshoala nyere goolụ asatọ n'ime asọmpị iri na otu na afọ egwuregwu gaara aga na otu egwu bọọlu Barcelona.

Akụkọ ndị ọzọ ga-anasị gị:

Gee Nkeji Akụkọ:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ