FBI list: Anyị anwụchiela mmadụ 28 ma napụta ego ruru nde N373 - EFCC

Ibrahim Magu

Ebe foto si, EFCC

Dịka akụkọ ndị a nwụchiri na mba Amerịka maka izu ohi site n'ịntanet ka na-ewu, EFCC agbaala ama na ha anwụchiela ụfọdụ ndị a na-arụ aka n'ebubo ahụ.

Onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu ekwuola na mgbakọ aka ha na Federal Bureau of Investigation, (FBI) nke mba Amerịka n'ibu agha megide mpụ n'ịntanet amịtala mkpụrụ dịka ha nwụchirila mmadụ 28, ma kpụpụ mmadụ 14 ụlọikpe.

Magu, onye kwuru nke a site n'ọnụ onyeisi EFCC na mpaghara ọdịda anyanwụ bụ Mohammed Rabo, oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, kwuru na ha napụtakwara nde narị naira atọ na ụma n'aka ndị ji ịntanet ezu ohi site n'ụlọakụ.

"Mmadụ itoolu n'ime ha bụ ndị ikpe ha na-aga n'ihu n'ụlọikpe, ebe a ka na-enyocha mmadụ ise."

"Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị okwu dị 80 bụ ihe EFCC na FBI gbakọrọ aka na-enyocha."

Ọ gara n'ihu kwuo na kemgbe afọ 2018, EFCC anwụchiela ihe karịrị mmadụ 200, nweta mkpebi ụlọikpe gbasara mmadụ 130, ma napụtakwa ọtụtụ ụgbọala dị oke ọnụ ahịa nakwa akụ ndị e chere na ha napụtara ndị mmadụ site n'igwu ha chacha ịntanet.

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ntaakụkọ kwado ha n'ọgụ ha na-alụ megide mpụ metụtara ego na akụnaụba.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: