Chika Odionyenma: Anyị agaghị egbochi nnyocha ndị FBI - Ihedioha

Emeka Ihedioha, Govanọ Imo Steeti.

Ebe foto si, Facebook/Emeka Ihedioha

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha, Govanọ Imo Steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmentị Imo Steeti ekwuola na ha agaghị egbochi nnyocha ndị nchekwa nzuzo nke mba Amerịka na-eme gbasara mpụ ịntanetị nke ụfọdụ ụmụ Naijiria mere n'obodo ahụ.

Steve Osuji bụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Emeka Ihedioha kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Monde.

Nke a na-abịa dịka a chọpụtara na otu onye n'ime ndị a na-ebo ebubo iso na mpụ a bụ onye rụbuuru Ihedioha ọrụ.

Aha nwata nwoke ahụ bụ Chika Odionyenma.

FBI list of suspected internet fraudsters

Ebe foto si, US DOJ

Nkọwa foto, Ụfọdụ aha ndị FBI wepụtara bụ ndị a na-ebo ebubo itinye aka na mpụ ịntanetị na mba Amerịka

Osuji kwuru na na nke mbụ, ọbụ ebubo ka eboro nwata nwoke ahụ, ọpụtaghị na ikpe amaala ya.

Nke abụọ, Osuji kwukwara na ọ bụ eziokwu na Odionyemma so na ndị nyere aka mgbe Ihedioha na-azọ ọchịchị.

Mana gọvanọ agaghị amacha mmadụ niile nyeere ya aka nakwa na ọpụtaghịkwanụ na gọvanọ na-akwado mpụ na aghụghọ.

O kwuru sị: "Ọtụtụ ndị nọ n'obodo dị icheich n'akụkụ ụwa niile nyere aka mgbe gọvanọ Ihedioha na-azọ ọchịchị."

"E nwere ndị sị mba Amerịka, ndị si Briten, ndị si Japan, nakwa mba ndị ọzọ."

"Gọvanọ agaghị abịa nyochawa ihe onye ọbụla n'ime ha na-eme."

FBI list of suspected internet fraudsters

Ebe foto si, US DOJ

Nkọwa foto, Ụfọdụ aha ndị FBI wepụtara

Akụkọ kwukwara na Chika Odionyenma so n'otu n'ime ndị rụrụ ọrụ na kọmiti iji nabata Ihedioha n'ọchịchị nke a kpọrọ "Imo State Transition Technical Committee" na bekee.

Mana Osuji kọwara na ọtụtụ ndị rụrụ ọrụ na kọmiti ahụ abụghị ndị gọvanọ ma n'onwe ya.

"Ihe ruru otu narị mmadụ rụrụ ọrụ na kọmịti ahụ."

"Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị mmadụ tụpụtara arọ n'ihi ihe ha kacha mara eme."

Steve Osuji

Ebe foto si, Facebook/Steve Osuji

Nkọwa foto, Steve Osuji, ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ihedioha.

Osuji gara n'ihu kwuo na gọvanọ Ihedioha agaghị eme ihe n'ụzọ ọbụla iji gbochie nnyocha ya bụ nwa amadị.

"Ọbụrụ na ndị FBI chọọ ime nnyocha, ha mee nnyocha ha.

"Gọvanọ agaghị egbochi nke a n'ụzọ ọbụla."

N'aka nke ọzọ, FCC Jones bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ APC n'Imo Staeeti, kwuru na ihe a merenụ gosiri na aka Ihedioha akwụchaghị ọtọ.

Jones kwuru na nwata nwoke ahụ e boro ebubo mpụ bụ onye na-elegara Ihedioha anya.

"Nke a gosiri ụdị ndị ha na Ihedioha na-emekọ ihe maka na Igbo kwuru na 'ka a ha eri, ka a ha eme'."

"Gịnị kpatara na Ihedioha ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya kamgbe okwu a pụtara ihe?

"O gosiri na obi adịghị ya mma maka njide e jidere enyi ya nwoke."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba.