Flooding in Nigeria: 'Idemmiri na-achọ iburu ụlọ anyị'

Aha onyonyo, Idemmiri na-achọ ịchụpụ ndị mmadụ n'ụlọ n'Enugu

Ọ bụghịzị ihe akụkọ na idemmiri nke afọ a amalitela ịkpa ike n'uju n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa.

N'ime izuụka a nke ruturu ụfọdụ mpaghara ọwụwaanyanwụ dị iche iche nke otu n'ime ha bụ Enugwu Steeti.

Oke mmiri na-ezo n'Enugwu kamgbe ụbọ ole na ole gara aga abụrụla ọdachi dịrị ndị bị n'Eke Obinagu Emene n'ihi na ide mmiri ekweghị ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

Idemmiri n'Enugwu

Ndị bị n'obodo a kwuru na ihe ha chere butere ya enweghi ezigbo ntọala ọwara ebe mmiri si agafe.

Idemmiri na-akpa ike n'Enugwu

Nke mere na mgbe ọbụla mmiri zoro, ide mmiri na-abata n'ime ụlọ ha na emebisiri ha ngwongwo ụlọ.

Otu nwoke bụ Onyeka Onochie ọrụ ya bụ ịkpụ blọọkụ kwara arịrị na idemmiri dọrọ n'ebe ọ na-akpụ blọọkụ emebichaala ndị ọ kpụrụ akpụ.

Ihe idemmiri na-eme n'Enugwu

O kwuru na nke a metụtara ya nke ukwuu n'ihi na o nweteghi ego o ji a kpụ ọzọ.

Onye ọzọ bụ Chinedu na-azụkwa ahịa n'Eke Obinagu gwara BBC Igbo na kamgbe idemmiri a dọchiri ihu ụlọ ahịa ya onweghịzị onye na-azụ ya ihe.

Idemmiri dọkọrọ n'Eke Emene Enugwu Steeti

Ndị ọzọ kwuru na idemmiri na-emebisi ihe ha kwa afọ ma rịọ gọọmentị ka a gbatara ndị Eke Obinagu Enugwu ọsọ enyemaka.

Cheta na ụlọọrụ gbatagbata na Naịjirịa bụ NEMA n'ịchafụ dị na mbụ dọọ ndị mmadụ aka na nti maka idemmiri nke afọ a.

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.