Anambra Flooding: Idemmiri cherela obodo Umuokpu aka mgba

Ebe foto si, Uchenna Madubo
Ndị obodo Umuokpu nke dị na'okpuru ọchịchi Ọka bu isi obodo Anambara Steeti sị na ha natazị kọnkịrị dịka ide mmiri na wabatakwu ha n'ụlọ.
Otu onye si obodo ahụ aha ya bụ Uchenna Madubona gwara BBC Igbo na ọnụ ahụghị ihe ọ ga-agwa ntị na ya bụ obodo.
Maazị Madubona gwara BBC na "ọ bụ n'udummiri niile ka ihe a na-eme n'obodo Umuokpụ."
Ọ kọwara na ihe kacha akpata ide mmịrrị a bụ etu ala Umuokpu sịrị nọdụ na ndịda ukwu abụọ.

Ebe foto si, Uchenna Madubo
Nkea mere na mmiri na esite n'Ọka na ebụrụ aja dochie awammiri nke na eme ka idemmiri ka njọ.
Madubona gwara BBC na ha kpọrọ ndị gbata-gbata ka ha bia were ụgbọ mmiri kpọpụta otu nwoke gbara afọ 108 maka na ide mmiri wakporo ya n'ụlo ya.
O kwuru sị; "Anyị nụrụ na gọomentị ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka. O rue oge ntụliaka, ndị na-azọ ọchịchị ga-abia kwee anyị nkwa, kama ha banye na ọchịchị ha echefuo anyị."
Ihe mmiri a mebiri gunyere ụlọ, ụgbọala, ụbị na anụmanụ ndị obodo a na-azụ.

Ebe foto si, Uchenna
Madubona kwuru na ndị Umuokpu na-agbalị ike ha ịkwusị ide mmiri ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Ọ gara n'ihu kwuo sị; "Obodo anyị abụghịzi ebe obibi maka anụmanu mmiri a gburu biara ree ure na-esi ajọ isị, anụ ọhia dịka agwọ na anụ ndị ọzọ bụzi ndị nwezi obodo ugbua."
"Dịka ọ dị ugbua, anwụnta juru eju bara abara nke mere na iba na anyụ ndị obodo anyị anya, iba erikwala isi ụfọdụ ndị".
Kọmịsọna na-ahu maka mgbasaozi n'Anambara bụ Don Adinuba gwara BBC Igbo na ọ ga-eme nchọputa maka ihe a.

Lee na akụkọ a ga-amasi gi:
Lee ihe Nkịrị ga-amasị gị:










