Biafra struggle: Ndigbo kwesiri ịbụ ụzọ mezie Alaigbo tupu e kwuwa okwu nnwereonwe Biafra - Noble Igwe
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
BBC Igbo na Noble Igwe nwere mkparịtaụka nke isiokwu ya bụ omenala Igbo na njirimara Igbo n'ọgbakọ 'Gịnị na-afịọ'.
O kwuru na o kwesịrị ka Ndịgbo bido idozi ala Igbo site na ịjụ ndị na-achị ha ajụjụ etu ha si achị.
Ọ jụrụ sị: "Ihe na-eme n'ala Igbo, ọ bụ onyeisiala na-eme ya?"

"Ịzọ Biafra abụghị sọsọ ime ya, kedụ ihe anyị meerela n'Igbo? Kedụ ihe ndị gọvanọ n'ala ịgbọ merela n'alaigbo?
"Ndigbo kwesiri ibu ụzọ mezie Alaigbo tupu e kwuwa okwu nnwereonwe Biafra."
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị ọzọ Igwe onye bụ nwafọ Ụmụọmakụ n'Orumba-South, Anambara steeti tinyere ọnụ:
Kedụ ihe Noble Igwe na-arụ?

"A gụrụ m akwụkwọ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka', gaa fee ala nna m na Gombe steeti ebe m kuziiri ụmụakwụkwọ, rụọ ọrụ na Virgin Nigeria bido n'afọ 2005 rue 2010, mechaa bido ụlọọrụ nke a kpọrọ '360 Group.'"
Isonye ihe na-eme n'ala Igbo
"Kedụ ndị ga-emepe ala Igbo ma ọ bụrụ na ị naghị alaru ala Igbo?"
"Ọ dị mkpa ka onye Igbo na-alaru ụlọ. Ị gaa Igbo ị wetuo onwe gị ala, gị na ụmụnna gị akpaa nkata, a mara ihe dị mkpa a ga-eme were dozie Igbo."
Imụ nwa na anụghị di maọbụ nwaanyị (Babymama)
Igwe kwuru na ihe kpatara ya bụ na ụfọdụ na-echezi na omenala adịghịzị mkpa.
"Ụmụnwaanyị na-ekwuzi na ha achọghịzi ịbụ oriakụ, mana agbachaa ọsọ agụ ọ "mile"
Igwe kpọrọ oku ka ụmụ Igbo na-ala obodo "ọ bụrụgodu otu ugboro n'afọ ịgbaa mbọ na-ala."
Mkpagbu n'alụmdinanwunye
"Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị a na-emegbu gị, laa be nna gị. Ị bụrụ nwoke, nwunye gị na-emegbu gị, laa be nne gị."

Asụsụ Igbo
"Nwa ọbụla m mụrụ ga-asụ Igbo. Ị sụghị Igbo, ị gaa chọọ be nna gị.
"Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ị sụọ Bekee, inweta ugwu. Mana ọ bụ ị gbaa mbọ, i nweta ugwu."
Ị sụọ Igbo, i gosi na i ji ebe i si eme ọnụ, igosi anyị na-ezo ala Igbo, sọsọ ihe a ga na-anụ bụ akwụ ọgwụ nwere enweta ego."
O nwere ndị amaghị na ịgba mbọ, ị bụrụ onye ọbụla ịchọrọ ị bụ."
Ọkwa ụmụada n'Ala Igbo
"N'obodo Igbo niile, ụmụada kacha nwee ike. Ha sị na a gaghị eli ozu, agaghị eli ozu ahụ."
Lee ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu:








