Catholic Priest Killing: Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu

Onyeisi ndị Uweojii

Ebe foto si, NPF/

Nkọwa foto, Mohamed Adamu enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisi ndị Uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka achọpụta ndị gburu Fada Paul Offu, bụ onyeisi ụkọchukwu St. James the Greater Parish Catholic Church, Ugbawka, Enugu steeti.

Ndị fada niile n'Enugwu Diocese mere ngagharịiwe ubọchị Fraide maka ogbugbu e gburu Fada Paul Offu nakwa ndị fada ndị ọzọ amabeghị ndị gburu.

A gbagburu Fada Offu na mgbede Tọzde oge ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke ya, dịka a gwara BBC Igbo.

Ndị ụkọchukwu Enugwu Diocese mere ngagharịiwe

Ndị ụkọchukwụ na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Ndị ụkọchukwụ na-eme ngagharịiwe n'Enugwu steeti sị na ha achoghi ndi ọchiehi na-egbu mmadu.

Ndị amabeghị ndị ha bụ gbagburu Fada Paul Offu ụbọchị Tọzde ka ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke n'Ihe, Enugwu steeti.

Mkpamkpa a mere ka ndị ụkọchụkwụ n'Enugwu 'Diocese' mee ngagharịiwe maka na enweghị ezi nchekwa n'Enugwu Steeti.

Lee ihe nkịrị a maka ngagharịiwe ndị ụkọchụkwụ a mere :

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndị ntọ a tọrọla ndị ụkọchụkwụ ise nke "Redeem Church"

Pastor Adeboye

Ebe foto si, PASTOR ADEBOYE/FACEBOOK

Nkọwa foto, Ndị ụkọchụkwụ 5 nke 'Redeem Christian Church of God' abụrụla ndị nọ n'aka ndị ntọrị.

Ndị ntọ atọrọla ndị ụkọchukwu ụka 'Redeemed Christian Church of God' n'okporoụzọ Ijebu-Ode n'ụtụtụ Fraide.

Ndị ụkọchukwu ahụ na-aga ọgbakọ kwa afọ nke ndị ụka 'Redeemed' na-enwe n'ọnwa Ọgọstụ afọ ọbụla n'ogige ha a kpọrọ 'Redemption Camp' dị na Mowe, Ogun steeti.

N'Ofesi

Pastor Timothy Omotosho

Ebe foto si, www.timomotosho.org

Nkọwa foto, Achụọla Pastor Timothy Omotosho ọso ukwu eruala n'Saut Afrịka

Onye ndu 'Jesus Dominion International church' ama ama na Suat Afrịka bụ Timothy Omotoso abụrụla onye ndị mba Saut Afrịka gbaara ugbọ nwankpi .

Ha sị na ha achoghizi ihu ukwu ya na mba ahụ maka ebubo iwakpo nwanyị.

N'egwuregwu

Harry Macguire

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Harry Macquire gbara afọ 26 ga-ebido nyocha ahụ otu bọọlụ Manchester United

Ndị otu bọọlụ Manchester United ejirila ego ọkpụrụkpụ 'pound' nde iri asatọ were zuta Harry Macguire nke Leicester City.

Ka o si dị ugbua, Harry abụrụla onye nchekwa bọọlụ kacha daa ọnụ n'uwa niile.

Ndị agha Naịjiria agọrọla ọnụ ha n'akụkọ pụtara na ha na-atụbanye ma lie ndị otu ha Boko Haram gburu n'ili a na-arụbaghị ama.

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Onyema Nwachukwu kwuru sị na ndị ntaakụkọ ebe akụkọ a si pụta amaghị usoro dị n'ịkwa ozu onye agha Naịjirịa.

N'akwụkwọ ozi o kesara, o kwuru na usoro olili ndị agha gụnyere mbugharị, ikpe ekpere, ịgbapụrụ ha egbe nakwa ihe ndị ọzọ.

O kwuru n'ebe a na-eli ozu ndị ntaakụkọ boro ha ebubo maka ịtụnye ndị otu ha, bụkwanụ nke dị n'ebe a kpọrọ Maimalari Military Cantonment, ebe ndị agha na-eli ndị otu ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.

Cheta na ndị Wall Street Journal boro ha ebubo sị na otu onye agha Naịjirịa gwara ha na a "na-eli ndị otu anyị n'ili a na-arụbaghị ama n'ime abalị... ebe a ga-anọ echefu maka ha".

Ndị Agha Naịjirịa sị onye ọbụla kpọọ okwu ahụ n'imi, na ọ bụghị eziokwu.

Aha onyonyo, Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

Akụkọ ọzọ yiri ya:

Ihe ruru ndị agha iri abụọ na ise na ndị Islamic State iri anọ anwụọla na Borno steeti.

Ndị ma maka ọgụ a tara isi ha sị na o mere mgbe ndị otu Islamic State wakporo ogige ndị agha n'obodo Baga n'ụbọchị Monde.

Ka anyị tụọ ụkwụ n'ofesi,

Úmúnwaanyí Saudi

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị nwetara ikike ịnya ụgbọala n'ọnwa Juun 2018

Ụmụnwaanyị Saudi Arebia ga-amalitezi ime njem si na mba fere na mba na-echeghi ka nwoke sị ha eh maọbụ mba.

Ọkwa ọhụrụ a enyekwuola ha ikike iji aka ha tinye akwụkwọ maka nwa ọhụrụ a mụrụ, alụmdinanwunye nakwa ịgba alụkwaghịm.

Lee ụzọ ise ụmụnwaanyị Igbo si dị iche na ndị nke ụmụnwaanyị mba Saudi .

N'egwuregwu,

Pepe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pepe so otu egwuregwu Lille dị na mba Frans gafeta Arsenal

Nicolas Pepe nke mba Aịvọrị Kost abụrụla onye kacha akpata ego site n'ịgba bọọlụ nke mpaghara Afrịka dịka Arsenal kwụrụ nde paụnd iri asaa na abụọ iji zụta ya.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:

Aha onyonyo, 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk