Kemi Badenoch: Nwafọ Naịjirịa abụrụla Minista na Britain

Ebe foto si, Kemi Badenoch/Twitter
Nwafọ Naịjirịa bụ Olukemi Olufunto Badenoch abụrụla Minista na ahụ maka ọdịmma ụmụaka na mba UK.
Nna ya na nne ya mụrụ Kemi na Wimbledon, London, afọ iri atọ na itolu gara aga.
1. O toro na Lagos na mba US ebe o si gawa London mgbe ọ gbara afọ iri na isii.
2. Ọ gụrụ System Engineering na Mahadum Sussex, mechaa gụkwa akwụkwọ dịka ọkaiwu ma rụkwa ọrụ n'ụlọakụ n'ụlọọrụ kọmpụta na London.
3. Kemi bụbu onye omeiwu na London bụ nke ahọpụtara ya kemgbe 2007 ebe ọ nọchitere anya ndị Saffron Walden.
4. Ọ zọrọ ọchịchị ọkwa ịnọchite anya ọgbe ha n'afọ 2012 bụ mgbe ọ dara ntụliaka mana ọ mechara nwete ya bụ ọkwa mgbe ndị nọ na ya bụ oche rituru na 2015.
5. O meriri ntuliaka ịnọchite Saffron Walden na ụbọchị asatọ nke ọnwa Juna afọ 2017.
6. Ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ nọchitere ogbe ahụ.
7. Kemi so na ndị chọrọ ka Briten hapụ EU.















