Brexit: Theresa May eriela mbombo ọsọ?

Theresa May

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

O kwuru n'ụlọomeiwu n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Machi na ọ bụrụ na ndị omeiwu ibe ya kwado ya, ọ ga-arịtu n'ọkwa ya.

May sị na ọ ma na ndị ibe ya achọghị ka o soro na-edu ndọrọndọrọ okwu Brexit, ma kwuo na ọ ga-apụrụ ha n'ụzọ.

"A dị m njikere ịhapụ ọrụ a maọbụrụ na ihe ga-adịrị obodo anyị mma" ka o kwuru.

Atiku Abubakar

Ebe foto si, AFP

Ụlọikpe pụrụiche e hibere maka ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala 2019 enyela Atiku Abubakar ohere ịkpesa mpụtara ntuliaka ahụ.

Atiku Abubakar kwụsịike na-ekwu na wuru wuru nakwa aka azụ dị icheiche ka APC jiri merie ya bụ ntuliaka.

Ọkaikpe atọ n'ụlọikpe pụrụiche ahụ kwenyere n'okwu ọkaiwu nọchitere anya Atiku bụ Chris Uche gbasara ikpe ahụ.

Na nchọpụta ndị otu Atiku mere na akụrụngwa Inec jiri me ntuliaka ahụ, ha kwuru na Atiku jiri vootu karịrị nde 1.6 merie Muhammadu Buhari.

Ọgbakọ EU amalitela asọmpị ndị na-efe ala nna ha

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ha kọwara site n'akara Twita ha na ihe ndị ha chọrọ ịnye bụ iji kelee ndị na-efe ala nna ha maka mbọ ha gbara na ntuliaka gara aga.

N'egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gọvanọ delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ekwela nkwa na ọ ga-ebunye ndị egwuregwu super eagles puku dọlla iri isii.

Ego ahụ ga-abụ iji kelee ha maka mmeri ha meriri mba Seychelles nakwa mba Ijipt mgbe ha zutere onwe ha n'asọmpị.

Akụko BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Anu enwe apụọla n'efere nrị na Akwa Ibom

Enwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Enwe apụọla n'efere nri na Akwa Ibom

Anụ enwe ga-abụzzị ahịa iwu na Akwa Ibom steeti ka gọọmentị steeti ahu na-ekwu na ekwesiri ịgba mbọ hụ na enwe akpọrọ Adiaha Awa Itam na anazi ana ka echekwa ya maka echi.

Gọọmentị na ndị Akwa Ibom mere okpotokpo nzukọ ụnyaahụ bụ ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachị iji tinye ọnu n'ihe metụtara ya bụ enwe.

Adams Oshiomhole

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018

Inec sị APC Zamfara dere duu

Ụlọikpe mkpegharị nọ na Sokoto steeti, nke Okaikpe Tom Yakubu tukwu n'isi ya, ewezụgala mkpebi Ụlọikpe Zamfara nyere maka ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress (APC) mere n'afọ 2018 iji

họpụta ndị zọrọ ha ọchịchị dị icheiche na ntuliaka 2019.

Eji ntuliaka a hopụta ndị na-azọ ọkwa gọvanọ, ụlọ Omeiwu steeti nakwa nke gọọmentị etiti.

Ọ bụ Omeiwu Kabiru Marafa - bụ onye na-ahụ maka ihe banyere manụ agbịdị n'ụlọ omeiwu naịjirịa - kpupụrụ APC ụlọikpe ahụ.

Marafa gara Ụlọikpe Mkpegharị ịrịọ arịrọ ka akagbuo ikpe mmasi ahụ APC nwetere na ụlọikpe dị na Zamfara makana ha sị na ya bụ ụloikpe enweghị ikike iji nabata ya bụ ikpe na mbụ.

Idris kwesiri i soro ndị ga-anata "Certificate of Return" taa bu Wenesde, ụbọchi nke iri abụo na asaa nke ọnwa Maachị.

Ndị agha Chad

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị agha si Chad, Naịjirịa na Cameroon na-ebuso ndị Boko Haram agha

UN etinyela anya na ego na ọgbaaghara Kameron

Otu UN na ahụ maka ndị gbara ọsọndụ bụ UNHCR arịọla ndị ụwa ka ha tụta ego dị otu narị nde dola na iri asatọ n'ụma ($184 million) bụ nke ha sị na ha ga-eji leta ndị gbara ọsọndụ na Cameroon.

Ihe ruru mamdụ ndị narị anọ (400,000) ndị Cameroon nọ n'ọsọndụ kemgbe ndị otu ekweghịekwe na ndị gọọmenti nọ n'akwata.

Gee nkeji a n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri anyị taa:

Aha onyonyo, Igbo Language: Gịnị bụ 'Umbrella' n'asụsụ Igbo?